Ọgbakọ Zuru ọha
Onye Nso anyị Mgbe niile
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Onye Nso anyị Mgbe niile

Mụ na gị nwere ohere ị nwete Mmụọ Nsọ dịka onye nso anyị oge nilie.

Ụmụnne m ndi nwoke na nwanyi m hụrụ n’anya, nime ọgbakọ nke a agọziwo anyị site na mwukwasa nke mkpughe. Ndị odibo Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ekwuwo okwu ma ha ga-ekwu okwu niile nke eziokwu, mgbamume, na odudu.

Enwetawom mmetụta site na ama niile nke agbara n’ebe ọgbakọ a na Onyenwe anyị na-ekwuru anyị okwu n’otu n’otu site na Mmụọ Nsọ. Dị ka anyị na-ekpe ekpere ma na-erube isi nye mkpali niile nke Mmụọ ahụ, anyị na-eritekwu nghọta na ngọzị iji duo anyị gafee n’ụbọchị ndị siri ike na-abịa niihu.

Anyị anụwọ ọzọ ịdọ aka na ntị nke Onyeisi Russell M. Nelson na “n’ụbọchị ndị n’abịa abịa, ọ gaghị ekwe omume ịnya ndụ ime mmụọ na-enweghi nduzi, ntụziaka, nkasị obi na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide.”1

Ịdọ aka na ntị ahụ nke onye amụma eduwo m tulee ihe m nwere ike ikuziri ụmụ m, ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ ụmụ m banyere otu esi enwe odudu dị oke mkpa n’oge ụbọchị ndị siri ike chere ha niihu.

Ya mere, ozi taa bụ nke nke ederede nye agbụrụ m nke nwere ike ịnyere ha aka mgbe m na anọghị ya n’oge ọma ndị dị niihu. A chọrọ m ka ha mata ịhe nke m mataworo nwere ike ịnyere ha aka.

Abịawo m ghọtakwuo ihe ọ ga-ewe maka ha inwete mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide n’oge ụbọchị niile ha ga ebi. Ma enwetawo m mmetụta ikwu okwu taa banyere nhụmihe nkeonwe m ikpoku Mmụọ Nsọ, dị ka otu m nwere ike ị mee, ka ọ bụrụ onye nso m mgbe niile. Ekpere m bụ ka m nwee ike ịgba ha ume.

A ga m achọ k ha chee maka ma kpee ekpere maka ụmụ ndị nwoke nke Hilaman, Nefi and Lehi, na ndị odibo ndị ọzọ nke Onyenwe anyị n’eso ha n’ọrụ. Ha zutere mmegide dị oke egwu. Ha nọ na-eje ozi n’ebe mmehie juru ma zute ọtụtụ aghụghọ dị oke ọjọọ. Ewerewom ike, ma ị nwekwara ike ị mee otu ahụ, site n’otu amaokwu nke a sitere na ndekọihe nke Hilaman:

“Ma nʼafọ nke iri asaa na iteghete a malitere inwe nnukwu esem-okwu. Mana o wee ruo na Nifaị na Lihaị, na ọtụtụ nʼime ụmụnne ha ndị nwoke ndị matara ihe gbasara ezi-okwu ihe nile nke ozizi, ebe ha nweworo ọtụtụ mkpughe kwa ụbọchị, ya mere ha kwusaara ndị ahụ ozi-ọma, nke mere na ha kwụsịrị esem-okwu ha nʼime otu afọ ahụ.”2

Akụkọ nke a agbawo m ume, ma ọ nwekwara ike ịgbakwa gị ume. Ụmụ ndị nwoke nke Hilaman ka akụziri ma duo site na ọtụtụ nhụmihe sitere na Mmụọ Nsọ. Nke a na-emesi m obi ike nanyị nwere ike ị nata nkuzi site na ma mụta ihe site na Mmụọ ahịrị n’elu ahịrị, na-anata ihe dịịrị anyị mkpa, ma mgbe anyị dị na njikere, anyị ga-anatakwuo karịa.

Agbawo m ume n’otu ụzọ ahụ site n’akụkọ nke Nefi onye agwara ka ọ laghachị Jerusalem maka epekele niile nke Laban. Ị chetara nhọrọ nke ọ mere. Ọ kwuru: “A ga m eje mee ihe ndi ahụ Onyenwe anyị nyere n’iwu-nsọ.”3

Nhụmihe nke a Nefi nwere ya na Mmụọ Nsọ nime ije ozi ahụ enyewo m mgbam ume ọtụtụ oge mgbe M malitere ọrụ ndị M maara sitere n’aka Onyenwe anyị mana nke dịrị ka ọ karịrị nhụmịhe m nweburu n’oge gara aga ma karịakwa ihe m hụrụ dị ka ikike m.

Ị na-echeta ihe Nefi kwuru banyere nhụmihe ya: “Ma ọ bụkwa n’abalị; m wee mee ka ha zoo onwe ha n’ezi mgbidi ahụ. Ma mgbe ha zosịrị onwe ha, mụ, Nifaị, mịpụrụ baa n’ime obodo-ukwu ahụ ma cheekwa iru n’ụlọ Leban.”

Ọ gara nihu kwuo, “Mmụọ ahụ wee duo m, na amaghị na mbụ ihe ndị m ga-eme.”4

Agbawo mụ ume site na-ịmara na eduuru Nefi site na Mmụọ nkeji n’elu nkeji ruo n’abali niile ahụ nime ije ozi nke Onyenwe anyị.

Anyị chọsịrị ike, ma ị ga-achọsikwa ike, nnonyere na-adịgide nke Mmụọ Nsọ. Ugbua, anyị nwere ọchịchọ ya, kama anyị mara site na nhụmihe na nke ahụ adịghị mfe ịnwete. Onye ọbụla nime anyị n’eche echiche, ma kwuo, ma mee ihe nịịle n’ime ndụ anyị ụbọchị nịịle nke nwere ike imejọọ Mmụọ ahụ.

Mgbe nke ahụ mere, dị ka ọ ga-eme, anyị nwere ike nwete mmetụta na Onyenwe anyị anabataghị ya. Ma enwere ike nwaa anyị ọnwụnwa iche na anyị nọ naanị anyị. Ọ dị mkpa ịcheta nkwa ahụ doro anya nke anyị na-anata izu ụka ọbụla dị ka anyị na-echegharị ma na a nata oriri nsọ: “Ka ha wee na-enwe Mmuọ ya oge nile ịnọnyere ha.”5

Ọ bụrụ na inwetawo mmetụta nke Mmụọ Nsọ taa, i nwere ike iwere ya dịka akaebe dị ụtọ na Aja mgbaghara mmehie na arụ ọrụ n’ime ndụ gị.

Dị ka Okenye Jeffery R. Holland kwuru: “Mgbe ọbụla oge ndị oke ihe isiike bịara, anyị ekwesịghị ịdaba nime ụjọ ahụ na Chineke ahapụwo anyị ma ọ bụ na Ọ naghịzi anụ ekpere anyị. Ọ na-anụ anyị n’ezie. Ọ na-ahụ anyị n’ezie. Ọ na-ahụ anyị naanya n’ezie.”6

Mmesi obi ike nke ahụ enyeworo m aka. Mgbe ọbụla ọ dị m ka m nọ n’ebe dịrị Onyenwe anyị anya, mgbe azịza nye ekpere m na-adịka ọ naghị abịa ọsọsọ, A mụtawom isoro ndụmọdụ nke Onyeisi Nelson nyere ị tulegharị ndụ m maka ohere ịchegharị. Ọ na-echetara anyị na, “Nchegharị kwa ụbọchị nile bụ ụzọ ahụ eji enweta idị-ọcha, ma ịdị-ọcha n’enweta ike.”7

Ọ bụrụ na ị na-hụta onwe gị ka ọ na arara gị ahụ ịnwete mmetụta nke Mmụọ Nsọ, ịnwere ike tulee uche maka ihe inwere ike isi na ya chegharịa ma nata mgbaghara.8 Ị nwere ike jiri okwukwe kpee ekpere ịmata ihe ekwesịrị ịsacha ma site otua tozukwuo oke maka nnọnyere ahụ n’adịgide nke Mmụọ Nsọ.

Ọ bụrụ na ịchọrọ ịnata nnọnyere nke Mmụọ Nsọ, ọ pụtarịrị na ịchọrọ ya maka ihe ndị ziri ezi. Nzube niile gị kwesịrị ịbu nzube niile nke Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na nzube gị bụrụ nnọọ maka echiche naanị nke gị, ị ga-ahụ na ọ ga arara gị ahụ ịnata ma nwee mmetụta niile nke Mmụọ.

Ọtughe ya nye m ma nye gị bụ ịchọ ihe ahụ Onye Nzọpụta chọkwara. Nzube anyị kwesịrị ibu nke akpalitere site na ihụnanya nke Kraịst na enweghi ntụkpọ. Ekpere anyị kwesịrị ị bụ “ Ịhe niile m chọrọ bụ ịhe ị chọrọ. Ka uche gị mee.”

A na m agba mbọ ịcheta aja nke Onye nzọpụta na ịhụnaanya O nwere n’ebe m nọ. Nihi ya, mgbe m na-eji ekpere na-enye Nna nke Eluigwe ekele, A nam anata mmesi obi ike na a na-anụ ekpere m niile ma na A ga m anata ihe ọbụla kacha mma maka mụ na maka ndị m hụrụ naanya. Ọ na-agba ama m ume.

Abịa nime ihe niile nke Mmụọ Nsọ na-agba aka ebe ha, nke kacha ọnụahịa maka anyị bụ na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara dị ndụ nke Chineke. Onye nzọpụta kwere nkwa na, “Onye nkasịobi ga-abịa, onye nke M ga-ezigara unu site na Nna, ọbụnadị Mmụọ nke eziokwu, onye sitere na Nna, ọ ga-agba aka ebe maka m.”9

Ọtụtụ afọ gara-aga, a natara m otu oku ekwentị sitere na otu onye nne nwere obi mnwute. Ọ gwara m banyere nwa ya nke nwanyị si n’ebe obibi ha kwaga n’ebe dị anya. Ọ metụrụ ya n’obi site na obere mkparịta ya na nwa ya nwanyị nwere na enwere ihe ọjọọ merenụ. Ọ rịọrịọ m maka enyemaka.

A chọtara m onye bụ onye nkuzi ezi na ụlọ nwa ya nwanyị. Ị ga-ekwu site na aha ahụ na nke a mere mgbe tere ezigbo aka. A kpọrọ m Ya. Ọ bụ okorobịa. Kama ọ gwara m na ya na onye nso ya ka akpọtere n’abalị n’abụghị naanị nihi nchegbu maka nwa ya nwanyị kama nihi mkpate mmụọ na ọ fọrọ nwantakịrị oge ka ọ mee ọtụtụ nhọrọ nke ga-ebutere ya obi ọjọọ na nhusianya. Nihi mkpate mmụọ ahụ si na Mmụọ, ha gara ịhụ ya.

Na mbụ, ọ chọbughi ịgwa ha banyere ọnọdụ ya. Site na mkpate mmụọ, ha rịọrọ ya ka ọ chegharịa ma họrọ okporo ụzọ ahụ nke Onyenwe anyị debere ya. Ọ matara mgbe ahụ, e kwere m site na Mmụọ, na naanị ụzọ ha nwere ike iji mata ihe ha maara banyere ndụ ya ga-esiriri na Chineke. Otu onye nne bugara Nna nke Eluigwe na Onye nzọpụta nchegbu niile ya. Mmụọ Nsọ ka ezigara ndị nkuzi ezinaụlọ ahụ nihi ha dị na njikere ijere Onyenwe anyị ozi. Ha sooro ndụmọdụ na nkwa ahụ a na-achọta nime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile:

“Ka afọ gị nile kwa jupụta na afọ-ọma nye mmadụ nile na nye-ezi na ụlọ nke okwukwe, na ka ezigbo omume chọọ echiche gị nile mma n’agwụghi agwụ; mgbe ahụ ka nchekwube gị ga-esi ike karịa n’iru Chineke; na ozizi nke ọkwa nchụ-aja ga-atasa na mkpụrụ obi gị dịka igirigi site n’elu-igwe.

“Mmụọ Nsọ ga-abụkwa onye nso gị mgbe nile, na mkpa-na-aka gị, mkpa-na-aka na-anaghi agbanwe nke ezi-omume na ezi okwu; na ebe ọchịchị gị ga-abụ ebe-ọchịchị mgbe nile na-adigide, na n’enweghi ụzọ nke nkwagide, ọ ga-asọrutere gị ruo mgbe nile na mgbe nile.”10

A na m agba-ama na Onye nzọpụta edebewo nkwa Ya. Mmụọ Nsọ ka a na-ezigara ndị otu ọgbụgba ndụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ugbua, nhụmihe unu niile ga-apụ iche na nke ya, ma Mmụọ ahụ ga-edu n’ụzọ kacha dịrị unu mma maka okwukwe na ikike unu ịnata mkpuhe maka unu ma maka ndị ahụ unu hụrụ naanya ma na-ejere ozi. Ejim obi m niile ekpe ekpere na obisike unu ga-etolite.

A na m agbara unu ama na Chineke Nna dị ndụ. Ọ hụrụ unu na anya. Ọ na-anụ ekpere unu ọbụla. Jizọs Kraịst n’ezie kpeere Nna ekpere ka ọ zidata Mmụọ Nsọ ahụ idu, ịkasịobi, ma ịgbara anyị ama eziokwu ahụ. Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’Anya pụtakwuru Josef Smith n’ime ọdọ osisi. Onye Amụma Josef Smith tụgharịrị Akwụkwọ nke Mọmọn site n’onyinye na ike nke Chineke.

Ndị ozi nke igwe weghachiri ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja. Onyeisi Russell M.Nelson bụ onye amụma Chineke maka ụwa niile.

Dị ka onye akaebe nke Jizọs Kraịst, A ma m na Ọ dị ndụ ma Ọ na-edu Nzukọ nsọ Ya. Mụ na gị nwere ohere ịnwe Mmụọ Nsọ ahụ dị ka onye nso anyị mgbe niile ma ịme ka amata eziokwu ndị ahụ dị ka anyị na-echeta ma hụ Onye Nzọpụta naanya, chegharịa, ma rịọ ka ịhụnaanya Ya nọrọ nime obi anyị niile. A na M ekpe ekpere nanyị ga-enwete ngọzi ahụ ma nnọnyere nke Mmụọ Nsọ n’ụbọchị nke a ma nime ụbọchị niile nke ndụ anyị. A hụrụ m unu naanya. N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona,, Me 2018, 96.

  2. Hilaman 11:23.

  3. 1 Nifaị 3:7.

  4. 1 Nefi 4:5–6.

  5. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.

  6. Jeffrey R. Holland, “Nkuzi niile sitere na Mkpọrọ Libati” (Brigham Young University devotional, Sept. 7, 2008), 5, speeches.byu.edu

  7. Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe kacha dị mma ma Dị Mma karịa,” Liahona,, May 2019, 68.

  8. “Adịghị ike ịnwete mmetụta nke Mmụọ, ma ọ bụ mmetụta izugbe nke enweghị mmasị ma ọ bụ mkpọnwu, [nwekwara ike ịbụ] otu akaebe nke adịghị ike nke ahuike uche” (“Mgbe ụfọdụ ọ na-ara m ahụ ịnwe mmetụta nke Mmụọ nihi mmetụta mkpọnwụ … ,” nime “Ahụike nke Uche: Enyemaka maka M” Enyemaka Ndụ, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu ahụike nke uche na nke mmetụta uche gị, biko nwee mmesi obike banyere ihụnaanya Nna nke Eluigwe nwere maka gị, ma gaa nihu na-ekpere Ya ekpere ma tụkwasị obi na Ya.

  9. Jọn 15:26.

  10. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:45-46.