Ọgbakọ Zuru ọha
Ike nke Jizọs Kraịst niime Ndụ Anyị Ụbọchị Niile
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ike nke Jizọs Kraịst niime Ndụ Anyị Ụbọchị Niile

Isi nke ume anyị bụ okwukwe niime Jizọs Kraịst dị ka anyị na-akpachapụ anya achọ ịbịakwute Ya ụbọchị niile ọbụla.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nke a bụ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a. Olee ụdị ọńụ ọ bụ ịgbakọta dị ka Nzukọ nsọ Ya. Ọnụ m juru na-ekele na Onyeisi Russell M. Nelson echetaworo anyị iji ezigbo aha nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị ọtụtụ mgbe nke ọ ga-abụ na anyị ga na-echeta onye Nzukọ nsọ nke a bụ nke ya na onye anyị na-eso nkuzi ya.

Onyeisi Nelson ekwuwo: “N’ụbọchị ndị na-abịa abịa, anyị ga-ahụ ngosịpụta ike nke Onye Nzọpụta kachasị ihe niilenke ndị ụwa na-ahụtụbeghị mbụ. … Ọ ga-enye ndị nwere okwukwe ohere ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ngọzi niile, na ọrụ ebube dị iche iche.”1

Otu niime ohere ndị dị kachasị ukwuu na ohere ime ihe niile nke mụ na nwunye m, Renee nwere, bụ izute Ndị nsọ ebe anyị na-eje ozi. Anyị na-anụ akụkọ ha niile, anyị na-ahụta nfunarị ha niile, anyị na-eketa oke na ihe mgbu ha, ma anyị na-ańụrị ọńụ na nrite uru ha. Anyị ahụtawo ọtụtụ ngọzi na ọrụ ebube nke Onye Nzọpụta na-enyewo ndị nwere okwukwe. Anyị ezutewo ndị nke na-agabigawo ihe ndị na-ekweghị omume, ndị na-atawo ahụhụ ọnụ na-apụghị ịkọ.

Foto, oyiyi
Onyeisi José Batalla Na nwunye ya, Nwanne nwanyị Valeria Batalla.
Foto, oyiyi
Flavia Cruzado na nna ya.

Anyị ahụwo ngosịpụta nke ike nke Onye Nzọpụta n’ebe nwanyị isimkpe nọ onye nke dị ya hapụrụ mgbe ha nọ n’ozi nke Onye Nzọpụta na Bolivịa.2 Anyị ahụwo ya niime onye inyom nta na Argentina onye nke a dabara n’okpuru ụgbọ onyoko ma ụkwụ ya efunarị ya, naanị niihi na mmadụ chọrọ izu ekwe ntị ya.3 Ma na nna ya bụ nwoke na-enweghị nwanyị, onye nke na-ahaghị ugbua ịchịkọta iberibe niile ma gbaa nwa ya nwanyị ume mgbe ụdịrị omume ọjọọ dị otu a nke a na-apụghị ịkọwa mesịrị. Anyị ahụwo ya niime ezi na ụlọ ndị ebe obibi ha funahụrụ na ihe niile ha nwere n’oge ọkụ ọgbụgba na Chile naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ tupu ekeresimesi na 2022.4 Anyị ahụwo ya niime ndị ahụ na-ata ahụhụ mgbe ịgba alụkwaghịm na-eme nkụja na niime ndị ahụ bụ ndị aka ha dị ọcha bụ ndị emejọrọ.

Foto, oyiyi
Ọkụ ọgbụgba na Chile.

Gịnị na-enye ha ike ịgabiga ihe ike niile? Gịni na-enyekwu ume dị iche ịdị na-aganiihu mgbe ihe niile yiri dị ka ofuola?

A chọpụtawo m na isi nke ume ahụ bụ okwukwe niime Jizọs Kraịst dị ka anyị kpachapụrụ anya na-achọ ịbịakwute Ya ụbọchị niile ọbụla.

Onye amụma Jekọb kuziri, “Ma ọ bịaworo n’ime ụwa ka o wee zọpụta mmadụ niile ma ọ bụrụ na ha ga an̄a nti n’olu ya; n’ihi na lee, ọ na-ata ahụhụ mgbu nke ụmụ mmadụ niile, ee, mgbu nke ihe niile ekere eke dị ndụ, ma ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụ ntakịrị, bụ ndị ezi na ụlọ Adam.”5

Mgbe ụfọdụ, inwe okwukwe niime Jizọs Kraịst nwere ike yie ihe na-adịghị mfe ime eme, karịsịa ihe na-erughị aka. Anyị nwere ike chee na ịbịakwute Kraịst chọrọ ume, ike, na izu oke anyị na-enweghị, ma anyị enwetụghị ike ịchọta ume ime ha niile. Mana ihe m mụtaworo site n’aka ndị mmadụ niile bụ na okwukwe niime Jizọs Kraịst bụ ihe na-enye anyị ume ịmalite njem ahụ. Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike iche, Ekwesịrị m idozi ndụ m tupu mụ abịakwute Jizọs,” mana eziokwu bụ na anyị na-abịakwute Jizọs iji mezie ndụ anyị site na Ya.

Anyị anaghị abịakwute Jizọs niihi na anyị zuru oke. Anyị na-abịakwute Ya niihi na anyị nwere ntụpọ ma niime Ya anyị nwere ike “izuoke.”6

Olee otu anyị si amalite itinye obere okwukwe n’ọrụ ụbọchị niile? Na m ọ na-amalite n’ụtụtụ: Mgbe m tetara, kama ilewa anya na ekwe ntị m, ana m ekpe ekpere. Ọbụna ekpere dị mfe. Emesịa mụ a gụọ akwụkwọ nsọ. Nke a na-enyere m aka na ọgbụgba ndụ m izu ụka niile nke m na-eme dị ka m nọ na-eri oriri nsọ “icheta ya n’oge niile.”7 Mgbe m jiri ekpere na akwụkwọ nsọ malite ụbọchị m, e nwere m ike “icheta Ya” mgbe m na-ele anya n’ekwe ntị m. E nwere m ike “icheta Ya” mgbe m zutere ọtụtụ nsogbu na ọgbaaghara, ma ana m agbalị izute ha dị ka Jizọs ga-eme.

Mgbe m “chetara Ya,” ana m enweta ọchịchọ ime mgbanwe, na ichegharị. Ana m achọta isi nke ume idebe ọgbụgba ndụ m niile, ma ana m enweta ike nke Mmụọ Nsọ niime ndụ m “ma dobe iwu nsọ ya niile nke o nyeworo [m]; ka [m] wee nwee ike nwee Mmụọ ya oge niile.”8 Ọ na-enyere m aka ịnagide ruo ọgwụgwụ.9 Ma ọ bụ opekata mpe ruo na ngwụcha nke ụbọchị ahụ. Ma niime ụbọchị ndị ahụ nke m dara na-icheta Ya ụbọchị niile, Ọ ka nọkwa ebe ahụ, na-ahụ m naanya ma na-agwa m na, “Ọ Dịmma; I nwere ike ịgbalị ọzọ echi.

Na-agbanyeghị na anyị ezughị oke na ị na-echeta Ya, Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya enweghị mgbe ọ na-ahapụ icheta anyị.

Otu niime mmejọ anyị na-emekarị ọtụtụ mgbe bụ iche na idobe ọgbụgba ndụ niile, ma ọ bụ nkwa niile anyị na-eme enye Chineke, bụ ihe dị nnọọ ka azụmahịa anyị na-eme anyị na Ya: Aga m erube isi, ma Ọ ga-echekwa m site niihe ọjọọ ọbụla ga-enwe ike eme m. Ana m akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri m, ma ọrụ m enweghị ike ifunarị m ma ọ bụ ọkụ enweghị ike ịgba ụlọ m. Mana emesịa mgbe ihe niile na-agaghị dị ka anyị tụrụanya, anyị na-ebeku Onyenwe anyị, “Ọ bụ na owuteghị gị na mụ ga-ala niiyi?”10

Ọgbụgba ndụ anyị abụghị ihe ịtụ mgbere ahịa nkịtị; ha bụ ihe na-eweta mgbanwe.11 Site na ọgbụgba ndụ m niile ana m anata nsachapụ, ike mgbam ume nke Jizọs Kraịst, nke na-enye m ohere ịghọ onye ọhụụ, ịgbaghara ihe yiri ka ihe na-enweghị mgbaghara, ịgabiga ihe na-ekweghị omume. Ịkpachara anya na-echeta Jizọs Kraịst oge niile dị ike; ọ na-enyekwu m “ike idobe iwu nsọ ya niile nke o nyeworo [mụ].”12 Ọ na-enyere m aka ịdị mma karịa, ị na-enwe ihu ọchị na-enweghị ihe kpatara ya, ịbụ onye ome udo,13 iji gbanarị esemokwu, iji kwe ka Chineke merie niime ndụ m.14

Mgbe ihe mgbu anyị ma ọ bụ ihe mgbu nke onye anyị hụrụ naanya dị oke ukwuu nke mere na anyị enweghị ike i di ya, icheta Jizọs Kraịst na ịbịakwute Ya nwere ike ime ka ibu ahụ dị mfe, mee ka obi dị nro, ma belata mgbu ahụ. Nke a bụ ike nke na-enyere nna aka gafee ike eke ya iji kwadoo nwa ya nwanyị n’oge mgbu nke anụ ahụ na nke uche gbasara nfunarị nke ụkwụ ya.

Foto, oyiyi
Flavia Cruzado na Okenye Ulisses Soares.

Mgbe Okenye Soares gara leta Argentina na Jun gara aga ma jụọ Flavia ihe gbasara egwu mberede ya, ọ zara n’okwukwe, “e nwere m mmetụta ọgbaaghara, obi ilu, iwe, na ịkpọ asị mgbe [ihe nke a mere]. Ihe nyeere m aka bụụrụ ajụghị, ‘gịnị mere o jiri bụrụ m?’ mana ‘maka gịnị?’ … Nke a bụụrụ ihe kpọtara m nso na-ebe ndị ọzọ nọ nakwa na-ebe Onyenwe anyị nọ. … Kama iwezuga onwe m site na Ya, a bịara m jigidesie Ya aka ike.”15

Onyeisi Nelson kuziri: “Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe—ike nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale anyị niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa. … Site otu a, ndị na-edobe ọgbụgba ndụ ka o ruuru inweta ụdị ezumiike pụrụ iche.”16 Nke a bụ ụdị ezumiike na udo m hụrụ na anya nke nwanyị isimkpe ahụ, na-agbanyeghị obi mgbu nke ya ahụghị di ya ụbọchị niile.

Foto, oyiyi
Ebili mmiri nke Oke Osimiri nke Galili

Agba Ọhụrụ na-ekwu banyere oge mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ Ya nọọrọ niime ụgbọ:

“Ma nnukwu oke ikuku mmiri malitere, ma ebili mmiri tibara niime ụgbọ mmiri ahụ. …

“Ma ọ naara … arahụ ụra n’elu pilo: ma ha kpọtere ya, ma sị ya, Nna ukwu, ọ bụ na owuteghị gị na anyị ga-ala niiyi?

“Ma o biliri, wee baara ifufe ahụ mba, ma sị oke osimiri ahụ, Udo, dere duu. …

“Ma ọ sịrị ha, Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Olee otu o ji bụrụ na unu enweghị okwukwe?”17

Ana m enwe mgbagwoju anya site n’akụkọ nke a. Onyenwe anyị ọ tụrụ anya na ha ga-eji okwukwe ha mee ka oke ikuku mmiri ahụ daa jụụ? Ịbara ikuku ahụ mba? Okwukwe na Jizọs Kraịst bụ mmetụta nke udo iji guzogide oke ifufe mmiri, mara na anyị agaghị ala n’iyi niihi na Ọ nọnyeere anyị n’ụgbọ mmiri ahụ.

Nke a bụ ụdịrị okwukwe anyị hụrụ mgbe anyị gara leta ndị ezi na ụlọ mgbe ọkụ ọgbụgba mechara na Chile. Ụlọ ha agbawo ọkụ ruo ala; ihe ha niile efuwo. Otu ọ dị mgbe anyị naara aga ije n’ebe dịịrị ka ebe obibi ha ma ha nọọrọ na-agwa anyị banyere nhụmiihe ha niile, o metụtara anyị na anyị guzooro n’ala nsọ. Otu nwanne nwanyị gwara nwunye m, Mgbe m hụrụ na ụlọ ndị ahụ nọ nso naara agba ọkụ, ọ gbatara m n’uche na ụlọ anyị na-aga ịgba ọkụ, na ihe anyị niile na-aga ifu. Kama ị nọ na-enweghị olileanya, e nwetara m nhụmiihe nke udo ọnụ na-apụghị ịkọwa. Otu ọ dị, o metụrụ m na ihe niile Ga-adị mma.” Ịtụkwasị Chineke obi ma dobe ọgbụgba ndụ niile nke anyị na Ya na-eweta ike nye adịghị ike anyị na nkasi obi nye arịrị anyị.

E nwere m obi ekele maka ohere ahụ nke mụ na Renee nwere izute ụfọdụ Ndị nsọ ndị a pụrụ iche, maka ọtụtụ ọmụmaatụ nke okwukwe, ume, na ntachi obi. Maka akụkọ niile nke obi mgbu na ndakpọ olileanya nke na-enweghị ike ịpụta niihu ibe akwụkwọ nke akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ na-agaghị enwe ike agbasa n’ikuku. Maka foto ndị a na-eseghị n’anya mmiri e bere na ekpere niile e kpere mgbe ihe fuchara ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm na-enye nkụja, na maka ihe ndị ezipụrụ nke na-abụtụghị ndị e mere n’ịtụ egwu, na mwute, na ihe mgbu ahụ nke na-aghọ ekele na-adịgide nye okwukwe ha niime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. Ndị a na-eme ka okwukwe nke m sie ike, ma niihi nke ahụ ana m enye ekele dị omimi.

A maara m na nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. A maara m na O guzo dị na njikere inye anyị ike Ya, ma ọ bụrụ ma anyị bịakwute Ya ụbọchị niile ọbụla. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.