Ọgbakọ Zuru ọha
Chineke Maara Unu ma Hụkwa unu n’Anya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Chineke Maara Unu ma Hụkwa unu n’Anya

Atụmatụ obi ụtọ nke Chineke bụ ihe gbasara gị kpom kwem. Ị bu nwa ya dị oke ọnụ ahịa na ọnụ ahịa dị ukwuu

Afọ isii gara aga, ezinaụlọ anyị naara aga njem n’oge abalị na mpụta obodo nke Oxford. Dịka ọ na-adịkarị n’ebe ụmụaka nọ, anyị kwesịrị ịkwụsị,ya mere anyị chọtara ọdụ ọrụ nwere ọtụtụ ụlọahịa na ụlọ nri. Na nkenke, anyị pụtara n’ụgbọ ala ahụ, banye n’ụlọ ọrụ, ma banyekwa nime ụgbọ ala, maliteghachi njem anyị.

Mgbe nkeji iri na ise gachara, ọkpara anyị jụrụ otu ajụjụ dị mkpa: “O lee ebe Jasper nọ?” Jasper na-anọdụ ala n’azụ ụgbọ ala. Anyị chere na ọ hiwo ụra ma ọbụ na-ezo ezo ma ọbụ na aghọsi anyị aghụghọ.

Dịka nwanne ya nwoke leruru anya nazụ ụgbọ ala ahụ, anyị chọpụtara na nwa anyị nwoke dị afọ ise anọghị ebe ahụ. Obi anyị jupụtara n’ụjọ. Dịka anyị laghchiri na ụlọ ọrụ ahụ, anyị rịọrọ Nna nke Eluigwe ka e chebe Jasper. Anyị kpọrọ ndị uwe ojii ma gwa ha ọnọdụ ahụ.

Mgbe anyị ji ụjọ bịarute, ihe karịrị nkeji 40 ka e mesịrị, anyị hụrụ ụgbọ ala ndị uwe ojii abụọ nime ọdụ ụgbọ ala ahụ, ọkụ ha na-enwu wam wam wam. Jasper nọ nime otu nime ha, na-eji bọtịnụ na-egwuri egwu. Agaghị m echefu ọńụ anyị nwere nịkpọghachite ya.

Ọtụtụ nkuzi nke Onye Nzọpụta jiri ilu kuzie na-elekwasị anya n’ịchịkọta, iweghachi, ma ọbụ ịgbalị ịchọta nke agbasasịworo ma ọbụ furu efu. Nime ndị a bụ ilu nke atụrụ furu efu, mkpụrụ ego furu efu, na nwa nwoke ahụ furu efu.1

Dịka ihe a mere Jasper na-agbagharị m nuche m kemgbe ọtụtụ afọ ndị ahụ, atụlegharịwo uche m n’ụdị ịdị nsọ na mkpa ụmụ Chineke dị, ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst, na ịhụnaanya zuru oke nke Nna nke Eluigwe onye mara gị na mụ. Enwere m olile anya ịgba aka ebe maka eziokwu ndị a taa.

I. Ụmụ nke Chineke

Ndụ bụ ihe ịma-aka. Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmetụta nke ibu anrọ, ịnọ naanị ha, ịnọpụ iche, ma ọbụ ike ọgwụgwụ. Mgbe ihe niile siri ike, anyị nwere ike iche na anyị kpafuru akpafu, ma ọbụ adalala azụ. Ị mata na anyị niile bụ ụmụ nke Chineke na ndị otu nke ezinaụlọ ebighị ebi Ya ga-eweghachi echiche nke isonye na nzube.2

Onyeisi M. Russell Ballard kwuru: “E nwere otu njirimara dị mkpa anyị niile na ekekọrịta ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. … Nke a bụ na ị bụ nwa-nwoke ma-ọbụ nwa-nwanyị nke Chineke. … Ịghọta eziokwu a—n’ezie ịghọta ya na ịnakwere ya—bụ mgbanwe ndụ.”3

A ghọtahiela ma ọbụ leda anya mkpa ịdị nye Nna gị nke Eluigwe. Ị bụghị ihe mberede site ngwa ahịa sitere nokike, nwa mgbei nke mbara igwe, ma ọbụ nsonazụ nke ihe gbakwunyere oge, gbakwunyere ohere. Ebe e nwere imewe, e nwere onye mmebe.

Ndụ gị nwere ihe ọpụtara na nzube. Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst na-aga n’ihu na-eweta ihé na nghọta gbasara njirimara gị dị nsọ. Ị bụ nwa nke Nna nke Eluigwe hụrụ naanya. Ị bụ isiokwu nke ilu na nkuzi niille ndị ahụ. Chineke hụrụ gị naanya nke ukwuu mere O ji zite Ọkpara Ya ka ọgwọ gị, napụta gị, na gbapụta gị.4

Jizọs Kraịst ghọtara ọdịdị dị nsọ na uru ebighị ebi nke onye ọ bụla.5 Ọ kọwara ka iwu-nsọ abụọ dị-ukwuu ịhụ Chineke na onye-agbataobi anyị n’anya siri bụrụ ntọala nke iwu-nsọ niile nke Chineke.6 Otu nime oke na ọrụ dị nsọ anyị bụ ilekọta ndị nọ na mkpa.7 Nke a bụ ihe mere dịka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị “na-eburịta onwe anyị ibu arọ, … soro ndị na-eru uju ruo uju … , ma kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi obi.”8

Okpukperechi abụghị naanị gbasaara mmekọrịta anyị na Chineke, ọ bụkwa maka mmekọrịta anyị na ibe anyị. Okenye Jeffrey R. Holland kọwara na okwu Bekee ahụ okpukpechi sitere na okwu Latin ahụ religare, pụtara “ike” ma ọbụ, karịa n’ụzọ nkịtị, “ikegharị.” Ya mere, “ezi okpukpechi [bụ] ihe jikọrọ anyị na Chineke na ibe anyị.”9

Otu anyị ji emeso ibe anyị n’ezie dị mkpa. Onyeisi Russell M. Nelson na-akuzi, ”Ozi nke Onye Nzọpụta doro anya: Ezi ndị na-eso ụzọ Ya na-ewu, na-ebuli elu, na-agba ume, na-akwagide, ma na-akpakemmụọ.”10 Nke a dị mkpa ọbụna karịa mgbe ndị njem ibe anyị chere na ha efuola, naanị ha nọ, echefuru ha, ma ọbụ ewepụrụ.

Anyị ekwesịghị ile anya n’ebe dị anya ịchọta ndị na-agbasi mbọ ike. Anyị nwere ike ịmalite site na inyere otu onye si na ezinaụlọ, ọgbakọ, ma ọbụ ogbe anyị aka. Anyị nwekwara ike ịchọ ibelata nhụjuanya ahụ nke nde mmadụ 700 bi n’oke ịda ogbenye11ma ọbụ nde mmadụ 100 ndị ejiri mmanye chụpụ n’ihi mkpagbu, esemokwu, na ime ihe ike.12 Jizọs Kraịst bụ ihe ịma-atụ zuru oke nke ịlekọta ndị nọ na mkpa—ndị agụụ, ndị ọbịa, ndị ọrịa, ndị ogbenye, ndị a tụrụ mkpọrọ. Ọrụ Ya bụ ọrụ anyị.

Okenye Gerrit W. Gong na-akuzi na “njem anyị ruo ebe Chineke nọ ka a na-achọtakarị ọnụ.”13 N’ihi ya, ngalaba ukwu anyị kwesịrị ịbụ ebe mgbaba maka ụmụ Chineke niile. Anyị ọ na-aga ụka n’elu n’elu ka ọbụ anyị ọ na-arụsi ọrụ ike na-ekepụta obodo ndị ebumnuche ha bụ ife ofufe, icheta Kraịst, na ijere ibe anyị ozi?14 Anyị nwere ike ịńa ntị na ndụmọdụ Onyeisi Nelson ịbelata ikpe ikpe, hukwuo naanya, na ịgbasa ịhụnaanya dị ọcha nke Jizọs Kraịst site na okwu na omume niile.15

II. Ike Mgbapụta nke Jizọs Kraịst

Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst bụ ngosipụta kachasị nke ịhụnaanya Nna anyị nke Eluigwe nwere n’ebe ụmụ Ya nọ.16 Okwu ahụ aja mgbaghara mmehie na-akọwa ọnọdụ “nke ịdị otu” nke ndị e kewapụrụ ma ọbụ e kewara.

Ọrụ nke Onye Nzọpụta anyị bụ ịrọpụta ụzọ eji alaghachikwuru Nna nke Eluigwe ya na enyemaka nime njem ahụ. Onye Nzọpụta ahụ maara site na nhụmihe Ya ka ọ ga-esi kwado anyị site na ihe ịma-aka niile nke ndụ.17 Emehiela: Kraịst bụ onye mgbapụta anyị na onye na-agwọ mkpụrụ obi anyị niile.

Dịka anyị na-egositapụta okwukwe, Ọ na-enyere anyị aka ịga n’ihu n’ihe isi ike. Ọ nọgidere na-akpọ oku ịhụnaanya na obi ebere Ya:

“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndi e bowokwara ibu dị arọ, ma Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.

“Wekwasịnụ onwe unu yok m, ma mụọ ihe banyere m; … ma unu ga-achọta ezumike nye mkpụrụ-obi unu niile.”18

Ihe atụ nke yok dị ike. Dịka Onyeisi Howard W. Hunter kọwara: “Yok ahụ bụ ngwaọrụ … nke na-ekwe ka ‘ike’ nke anụmanụ nke abụọ jikọta ya na mgbalị nke otu anụmanụ, na-ekekọrịta na ibelata ọrụ dị arọ nke [ọrụ ahụ dị n’aka]. Ibu dị oke arọ ma ọbụ ikekwa ọ gaghị ekwe otu onye ibu ya nwere ike ikwe mmadụ abụọ ekekọtara ọnụ ibu ya n’ụzọ ziri ezi na nke dị mfe.”19

Onyeisi Nelson kuziri: “Ị na-abata nime Kraịst ka e kekọta gị na Ya na ike Ya ka ị ghara ịdọrọ ibu nke ndụ naanị gị. Ị na-adọkpụrụ ibu nke ndụ ebe ekekọtara gị na Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa.”20

Kedu otu anyị si ejikọ ma ọbụ kekọta onwe anyị na Onye Nzọputa? Okenye David A. Bednar na-akọwa:

“Ime na idobe ọgbụgba-ndụ niile dị nsọ na-ejikọta anyị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. N’ezie, Onye Nzọpụta na-akpọ anyị ka anyị dabere na Ya ma dọkọta ọnụ. …

“Anyị anọghị ma ekwesịghịkwa ma ọlị ị nọrọ naanị anyị.”21

Maka onye ọ bụla nwere ibu arọ, furu efu,nwere mgbagwoju anya: Ị gaghị eme nke a naanị gị.22 Site na Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na emume nsọ Ya niile, ị nwere ike jikọta ma ọbụ kekọta na Ya. Ọ ga-eji ịhụnaanya nye ike na ọgwụgwọ ị chọrọ iji zute njem dị n’ihu. Ọ bụ ebe mgbaba site n’oke ifufe anyị.23

III. Ịhụnaanya nke Nna nke Elu-igwe

Maka ndekọihe, Jasper bụ onye maara ihe, nwere ịhụnaanya, nwere ọgụgụ isi na onye ihe na-anụ ọkụ n’obi. Mana isi ihe dị nime akụkọ a bụ ọ bụ nkem. Ọ bụ nwa m nwoke, ma a hụrụ m ya naanya karịa ka ọ ga-ama. Ọ bụrụ na nna na-ezughị oke nke elu ụwa na-enwe mmetụta dị otu a banyere nwa ya, ị pụrụ ichetụ n’echiche otu Nna nke Eluigwe zuru oke, nke dị ebube, dị ịhụnaanya si ele gị anya?

Nye ezi ndị enyi m nke ọgbọ na-ebilite, Gen Z na Gen Alpha: Biko mara na okwukwe chọrọ ọrụ.24 Anyị bi n’ime ụwa mgbe, maka ọtụtụ, naanị “ahụ naanya ekwe.” Okwukwe nwere ike bụrụ ihe ịma aka ma chọọ nhọrọ niile. Kama a na-aza ekpere.25 Ma enwere ike nwee mmetụta aziza niile.26 Ụfọdị ihe ndị kachasị bụrụ ezigbo ihe na ndụ abụghị nke anya na-ahụ, a na-enwe mmetụta ha, mara ha, ma nwe nhụmihe ha. Ha onwe ha kwa bụ ezigbo ihe.

Jizọs Kraịst chọrọ ka gị na Nna nke Eluigwe mara ma nwe mmekọrịta.27 Ọ kuziri, “Ole nwoke n’etiti unu, nke nwere nwa-nwoke, ma ọ guzoro, ma sị, Nna, meghie ụlọ gị ka m wee soro gị rie nri, na-agaghị asị, Bata, nwa m, n’ihi na nkem bụ nke gị, ma nke gị bụ nkem?”28 Ị nwere ike ịche maka ihe ozo karịrị onyinyo Chineke Nna nke Ebighị ebi?

Ị bu nwa Ya. Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ị furu efu, ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ma ọbụ enweghị amamiihe, ọ bụrụ na ị na-aluso ọnọdụ gị nile ọgụ ma ọbụ gị na ekweghi ekwe nke ime mmụọ na-agba mgba, tụgharịa gakwuru Ya. Kpere Ya ekpere maka nkasi obi, ịhụnaanya, aziza niile, na ntụziaka. N’agbanyeghị mkpa ọ bụla ị nọ na ebe ọ bụla ị nọ, wụsara Nna gị nke Eluigwe obi gị. Maka ụfọdụ, ị nwere ike ị chọọ isoro ọkpụkpọ oku nke Onyeisi Nelson ma “jụọ ma Ọ nọ ebe ahụ n’ezie—ma Ọ mara gị. Jụọ Ya ụdị mmetụta O nwere ebe ị nọ. Ma mgbe ahụ gee ntị.”29

Ezi ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị:

  • Mata Nna Gị nke Eluigwe. O zuru oke ma dị ịhụnaanya.

  • Mara onye Jizọs Kraịst bụ.30 Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Kekọta onwe gị na ndị ịhụnaanya nye Ya.

  • Ma mara onye gị bụ. Mara ezi njirimara gị dị nsọ. Atụmatụ obi ụtọ nke Chineke bụ ihe gbasara gị kpom kwem. Ị bu nwa ya dị oke ọnụ ahịa na ọnụ ahịa dị ukwuu Ọ maara gị ma hụkwa gị n’anya.

Maka eziokwu niile ndị a dị mfe bụkwa ntọala ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Luk 15:4–32.

  2. Lee Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 1.

  3. M. Russell Ballard, “Ụmụ nke Nna nke Eluigwe” (Brigham Young University devotional, Mar. 3, 2020),speeches.byu.edu.

  4. Lee Jọn 3:16; Mosiaia 15:1; 3 Nifaị 17:6-10.

  5. Lee Kwusaa Oziọma M, chapter 3.

  6. Lee Matiu 22:36-40.

  7. Lee Akwụkwọ Ntụzi aka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a,, 1.2, Ọba akwụkwọ Ozi-ọma.

  8. Mosaịa 18:8, 9

  9. Jeffrey R. Holland, “Okpukpe: Ejikọtara site na Eriri niile Ịhụnaanya,” (Brigham Young University devotional, Aug. 16, 2016), speeches.byu.edu.

  10. Lee Russell M. Nelson, “Ndị Ome udo Ka A Chọrọ,” Liahona, Mee 2023, 99.

  11. “The number of people in extreme poverty rose by 70 million to more than 700 million people” (“Poverty,”Nov. 30, 2022, World Bank, worldbank.org).

  12. “More than 100 million people are forcibly displaced”(“Refugee Data Finder,” May 23, 2022, United Nations High Commissioner for Refugees, unhcr.org).

  13. Gerrit W. Gong, “Room in the Inn,” Liahona, Mee 2021, 25

  14. Lee Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe, 1.3.7, Ọba akwụkwọ Ozi-ọma.

  15. Lee Russell M. Nelson, “Ndị Ome udo Ka A Chọrọ,” 98-101.

  16. Lee Jọn 3:16.

  17. Lee Alma 7:11-12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:8.

  18. Matiu 11:28–29.

  19. Howard W. Hunter, “Bịakwutenụ M,” Ensign, Nov. 1990, 18.

  20. The Mission and Ministry of the Savior: A Discussion with Elder Russell M. Nelson,” Ensign, June 2005, 18.

  21. David A. Bednar, “Na-eburu Ibu Ha N’ụzọ dị Mfe,” Liahona, Mee 2014, 88.

  22. Onyeisi Camille Johnson sịrị: “Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, apụghị m ime ya naanị m, ma ekwesịghị m ime ya, ma agaghị m eme ya. Ịhọrọ ikwe ka ekekọta m na Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, site na ọgbụgba ndụ niile m meworo mụ na Chineke, ‘A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst nke na-agba m ume’ [Ndị Filipi 4:13]” (“izọs Kraịst bụ Enyem-aka,” Liahona, Me 2023, 82).

  23. Lee Psalm 62: 6– 8.

  24. Lee Jems 2:17.

  25. Lee Matiu 7:7–8; Jemis 1:5.

  26. “Ya [Mmụọ Nsọ ahụ] bụ Onye Nkasi obi (Jọn 14:26). Dịka olu dị jụụ nke nne na nna nwere ike ime ka nwa na-ebe akwa kwụsị, ntamu nke Mmụọ nso pụrụ ime ka ụjọ anyị dajụọ,mechie nchegbu ndị na-akpasu anyị iwe nke ndụ anyị, ma kasie anyị obi mgbe anyị na-eru uju. Mmụọ Nsọ ahụ nwere ike mejupụta anyị ‘jiri olile anya na ịhụnaanya zuru oke’ ma kuziere [anyị] ihe ndị udo nke alaeze ahụ’ (Moronaị 8:26, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 36:2.)” (Topics and Questions, “Holy Ghost,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma).

    “Ya [Mmụọ Nsọ ahụ] ‘na-agba akaebe banyere Nna na Ọkpara ahụ’ (2 Nefi 31:18 Ọ bụ naanị site nike nke Mmụọ Nsọ ka anyị ga-enwe ike ịnata ọgbụgba ama nke Chineke Nna na Okpara Ya, Jisọs Kraịst.

    “Mmụọ Nsọ ahụ n’agba-ama nke eziokwu, na ọ bụ site na ike Ya ka anyị ‘nwere ike mata ezi-okwu nke ihe niile.’ (Moronaị 10:5)” (“Mmụọ Nsọ Ahụ n’Agba-ama nke Eziokwu,,” Liahona, Mar. 2010, 14, 15).

    “Kama mgbe Onye Nkasi obi ga-abịa, onye nke M ga-ezitara unu site na Nna, ọ ga-agba-ama maka m” (Jọn 15:26).

  27. Lee Jọn 14:6–7; 17:3.

  28. Ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith, Matiu 7:17 (in the Bible appendix).

  29. Russell M. Nelson, “Bịanụ, Soro Mụ,Liahona, Mee 2019, 90.

  30. Lee Mak 8:27–29.