Ọgbakọ Zuru ọha
Alaeze niile nke Ebube
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Alaeze niile nke Ebube

Anyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya onye na-ahụ na anyị natara ngọzi niile na uru ọbụla nke ọchịchọ na nhọrọ nke onwe anyị nabatara.

Ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ ka a na-ajụkarị, “Kedụ otu nzukọ nsọ unu si dịrị iche site na nzukọ nsọ ndị Kristian ndị ọzọ?” Otu nime azịza anyị na-enye bụ uju ozizi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Nke kachasị n’etiti ozizi ahụ bụ eziokwu na Nna nke Eluigwe hụrụ ụmụ Ya niile naanya nke ukwuu nke mere na Ọ chọrọ anyị niile ibi nime alaeze nke ebube ebighị ebi. Nke ka nke, Ọ chọrọ k’anyị bikwuru Ya na Ọkpara Ya bụ Jizọs Kraịst ebighị ebi. Atụmatụ ya enyewo anyị nkuzi niile na ohere iji mee nhọrọ nke ga-emesi anyị obi ike irite akara aka na ndụ ahụ nke anyị họọrọ.

I.

Site na mkpughe nke ọhụrụ anyị maara na ngwụcha ndụ onye niile bi n’elu ụwa nke a abụghị echiche ahụ na-ezughichaghị ezu nke kwuru na eluigwe nọ maka ndị ezi omume ma ntaram ahụhụ ebighị ebi ọkụ mmụọ nọ maka ndị fọdụrụ. Atụmatụ dị ịhụnaanya nke Chineke maka ụmụ Ya gụnyere eziokwu nke a akụziri site n’aka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst: “Nime ụlọ nke Nna m enwere ọtụtụ nnukwu ụlọ.”1

Ozizi ekpughere nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a eweghachitere na-akuzi na ụmụ Chineke niile—ebe ihe ndị ewepụrụ pere mpe nke ukwuu itule ebe a—ga-emecha keta otu nime alaeze atọ nke ebube, ọbụnadị nke kachasị nta nke “gafere nghọta nile.”2 Mgbe otu oge gafeworo ka ndị nnupuisi tasiworo ahụhụ maka mmehie ha, ntaram ahụhụ nke na-akwado ha maka ihe n’esote, onye niile ga-ebilite n’ọnwụ ma gaa nihu n’ebe Ikpe Ikpeazu nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. N’ebe ahụ, Onye Nzọpụta anyị dị ịhụnaanya, onye, akuziiri anyị, “na-enye Nna otito, na-azọpụta ọrụ nile nke aka ya,”3ga-eziga ụmụ niile nke Chineke ruo nime otu nime alaeze niile nke ebube ndịa dị ka ọchịchọ niile gosipụtara nime nhọrọ ha niile.

Ozizi na omume ọzọ pụrụiche nke Nzukọ nsọ eweghachitere bụ iwu na ọgbụgba ndụ niile ekpughere nke na-enye ụmụ niile nke Chineke ohere ahụ dị nsọ iji tozuo oke maka ogo ahụ kachasị elu nke ebube nime alaeze selestịal. Njedebe ahụ kachasị dị elu—mbuli elu nime alaeze selestịal— bụ ebe nlekwasị anya nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.

Site na mkpughe nke oge ugbua, Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a nwere nghọta nke a pụrụiche maka atụmatụ obi ụtọ nke Chineke maka ụmụ Ya. Atụmatụ ahụ malitere na ndụ anyị dị ka mmụọ tupu a mụọ anyị, ma ọ na-ekpughe nzube na ọnọdụ niile nke njem anyị họọrọ nime ndụ anụ ahụ ya na ọchịchọ anyị nwere maka njedebe ma emesịa.

II.

Anyị maara site na mkpughe ọhụrụ na “Alaeze nile nwere iwu e nyere ya”4 ma na alaeze nke ebube nke anyị natara n’oge Ikpe Ikpeazu bụ nke ekpebiri sitere na iwu niile nke anyị họọrọ isoro nime njem ndụ anụ arụ. N’ọkpuru atụmatụ nke a dị ihụnaanya, enwere ọtụtụ alaeze—ọtụtụ nnukwu ụlọ—nke mere na ụmụ niile nke Chineke ga-eketa alaeze nke ebube nke ha gbalịrị n’ike ha “ịnọnye.”

Dị ka anyị na-akọwa ọdịdị na atụmanya nke alaeze atọ ndịa ọbụla nime atụmatụ nke Nna, anyị na-ebido nke kachasị elu, nke bụ nlekwasị anya nke iwu nsọ niile na emume nsọ niile nke Chineke kpugheworo site na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. Nime ebube nke “selestịal”5 enwere ogo atọ,6 nke bụ na mbuli elu bụ ebe kachasị elu nime alaeze seletsịal. Ebe a bụ ebe obibi nke ndị ahụ “ndị nataworo site n’uju ya, ma site n’ebube ya,” ya mere, “ha bụ ndị chi, ọbụna ụmụ ndị nwoke [na ndị nwanyị] nke Chineke”7 ma “ga-anọ n’ihu nke Chineke na Kraịst ya mgbe ebighị ebi niile.”8 Site na mkpughe, Chineke ekpughewo iwu ebighị ebi ahụ, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile nke ekwesịrịrị idebe iji wulite agwa eziomume dị mkpa iji mezuo akara aka nke a dị nsọ. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ na-elekwasị anya nelu ihe ndịa a nihi na nzube nke Nzukọ nsọ eweghachitere bụ ịkwado ụmụ Chineke maka nzọpụta nime ebube nke selestịal ma, nke karịrị nke a, maka mbuli elu n’ebe ebube ya kachasị elu.

Atụmatụ nke Chineke, nke ehiwere n’elu eziokwu ebighị ebi, na-achọkarị na mbuli elu ka enwere ike irite naanị site na ikwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile nke alụmdi na nwunye dị ebighị ebi n’etiti otu nwoke na otu nwanyị nime tempụl dị nsọ,9 nke bụ na alụmdi na nwunye ga-emesị n’ikpeazụ kwe omume nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ ya kpatara anyị ji akuzi na “jenda bụ ejirimara dị mkpa nke ndụ tutu ndụ anụ ahụ, ndụ anụ ahụ, ihe nhụba ama na ebumnoobi ebighị ebi nke onwe.”10

Otu nkuzi dị oke ọnụ ahịa pụkwara iche iji nyere anyị aka kwado maka mbuli elu, bụ ọkwa amara banyere ezinụlọ enyere n’afọ 1995.11 Nkwupụta ya nile kọwaziri nke ọma atụmnanya niile nke na-akwado anyị ibikwuru Chineke, Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ndị ahụ na-anaghị aghọta n’uju atụmatụ dị ịhụnanya nke Nna nwere maka ụmụ Ya nwere ike were ọkwa nke a amara nye ezi na ụlọ dị ka nkwụpụta iwu enwere ike ịgbanwe. Na ntule dịiche, anyị kwere na ọkwa a mara nye ezi na ụlọ, ehiwere n’elu ozizi na-enweghị mgbanwe, na-akọwa ụdị mmekọrịta ezi na ụlọ ebe akụkụ kachasị mkpa nke uto ebighị ebi anyị nwere ike ime.

Onye Ozi Pọl kọwara ogo ebube atọ ndị ahụ, na-atụnyere ha dị ka ebube nye anyanwụ, ọnwa, na kpakpando niile.12 Ọ kpọrọ nke kachasị elu “selestịal” ma nke abụọ “terrestrial.”13 Ọ kpọghị aha nke dịkasị nta, mana otu mkpughe enyere Josef Smit gbakwụnyere aha ya: “telestial.”14 Mkpughe ọzọ kọwakwara ụdị mmadụ ekenyere nye alaeze ndịa niile nke ebube ọbụla. Ndị ahụ na-ahọrọghị “idebe iwu nke alaeze selestịal”15ga-eketa alaeze ebube ọzọ, nke dị nta nye nke selestịal mana nke dabara iwu niile ha họọrọ na nke gbalịsiri ike “ịdebe.” Mkpụrụ okwu a ịdebenke jupụtara nime akwụkwọ nsọ, pụtara ebe echekwara.16 N’ịmatụ, ndị ahụ nọ nime alaeze terrestrial—nke enwere ike ịtụnyere nghọta nke igwe mmadụ nwere maka eluigwe—“bụ ha ndị na-anata site n’ihu nke Ọkpara, mana ọbụghị n’uju nke Nna.”17 Ha bụ “ndị a na-enye nsọpụrụ nke ụwa, ndị kpuru isi site n’aka aghụghọ ụmụ mmadụ,”18 kama “esighị ike na ọgbụgba ama nke Jizọs.”19

Nkọwa ekpughere maka ndị ahụ ekenyere na alaeze ebube dịkasị nta, telestial ahụ, bụ “onye ahụ nke n’enweghi ike idebe … ebube nke terrestrial.”20 Nke a na-akọwa ndị ahụ jụrụ Onye Nzọpụta ma ghara itinye oke dị nsọ na agwa ha. Nke a bụ alaeze ebe ndị ọjọọ na anọ, mgbe ha tasịrị ahụhụ maka mmehịe ha. Ndịa ka akọwara nime mkpughe nke ọhụrụ dị ka “ndị na-anataghị ozi ọma nke Kraịst, ọbụghị ma ọgbụgba ama nke Jizọs. …

“Ndia bụ ndị ahụ bụ ndị ụgha, na ndị na-agwọ nsi, ndị na-akwa iko, na ndị akwụnakwụna na onye ọbụla na-ahụ ụgha n’anya ma na-atụ asi.”21

N’ikwu maka alaeze niile nke ebube jiri ọhụ nke amụma ya, Onyeisi Russell M. Nelson dere na nso nso a: “Ndụ anụ ahụ nke a ezughidị ịbụ tikọm dịkasịrị nta n’ebe ebighị ebi nọ. Mana ọ bị tịkọm dịkasịrị nta dị oke mkpa! Jiri mkpachapụ anya tulee otu o si arụ ọrụ: N’oge ndụ anụ ahụ nke a ị na-enwete ohere ịhọrọ iwu ndị ịdị njikere irubere isi—ndị ahụ bụ nke alaeze selestial, ma ọ bụ nke terrestrial, ma ọ bụ nke telestial—ma, n’ezie, nime alaeze nke ebube nke ịchọrọ ibi ebighị ebi. Nkwa nke a dị egwu! Ọ bụ otu atụmatụ nke na-asọpụrụ ohere nhọrọ gị esepụghị aka.”22

III.

Onye Ozi Pọl kuziri na nkuzi na iwu niile nke Onyenwe anyị ka enyere ka anyị nwee ike tozuo “atụ nke ogo ogologo uju nke Kraịst.”23 Usoro ahụ chọrọ ihe karịrị inweta ọmụma ihe. O zughịdị ezu ịnabata eziokwu nke ozi ọma; anyị garịrị eme ihe nke ga-eme ka a tọghata anyị site na ya. Na ntule uche dị iche nye okwuchukwu ndị ọzọ, ndị na-akụzi anyị ị mata ihe, ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-echere anyị aka mgba ị bụ ihe.

Site n’ụdị nkuzi dị otu ahụ anyị na-ekpebi na Ikpe nke Ikpeazụ ahụ abụghị nnọọ naanị mnwale nke ihe ọma na ihe ọjọọ niile agụkọtara ọnụ—ihe anyị meworo. Ọ dabeere n’elu ndapụta ikpeazụ nke omume na echiche niile nke anyị—ihe anyị bụwoziri Anyị na-etozu oke ndụ ebighị ebi site n’usoro nke ntọghata. Dị ka ejiri kwuo ya n’ebe a, mkpụrụ okwu nke a nwere ọtụtụ nkọwa na-egosi nnukwu mgbanwe okike. O zughi ezu maka mmadụ ọbụla ịme naanị ihe ọbụla a sị mee. Iwu niile, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile nke ozi ọma abụghị ndekọ egọ niile achọrọ ka akwụnye nime otu ụlọego ọ wụ nọ n’eluigwe. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ otu atụmatụ nke na-egosipụtara anyị otu anyị si abụ ihe Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ka anyị bụrụ.24

IV.

Nihi Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, mgbe anyị jehiere na ndụ nke a, anyị nwere ike ịchegharị ma sonyegharịa ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ na-eduba ruo ọchịchọ Nna anyị nke Eluigwe nwere maka anyị.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuzi na “ndụ nke a bụ oge [anyị] nwere iji kwadoo izute Chineke.”25 Mana ihe ndị aka mgba ahụ na-ebelata “ndụ nke a” ka enyere olileanya (opekampe ruo n’ogo ụfọdụ maka ụfọdụ mmadụ) site nihe Onyenwe anyị kpuhere nye Onyeisi Josef F. Smith, nke edere ugbua nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile isi 138. “M wee hụ,” onye amụma dere, “ndị okenye nile kwesịrị ntụkwasị obi nke ọgbọ nke a, mgbe ha na-ahapụ ndụ nke na-anwụ anwụ, na-aga n’iru n’ọrụ ha nile na-ikwusa ozi-ọma nke nchegharị na mgbapụta site n’aja ahụ nke Ọkpara ahụ Chineke Mụrụ Nanị ya chụrụ, n’etiti ndị ahụ bụ ndị nọ n’ọchịchịrị na ndị nọ n’oru nke mmehie n’ime oke ụwa ndị mụọ nile nke ndị nwụrụ anwụ.

“Ndị nwụrụ anwụ nke chegharịrị ka a ga-agbapụta site na nrube isi nye emume-nsọ nile nke ụlọ Chineke.

“Na mgbe ha kwụsịworo ụgwọ ntaram ahụhụ dịịrị njehie ha nile, na a sachaa ha ka ha dị ọcha, ha ga-enweta ụgwọ ọrụ dịka ọrụ ha nile siri dị, n’ihi na ha bụ ndị nketa oke nke nzọpụta.”26

Na mgbakwụnye, anyị mara na n’oge Milenum, afọ puku ahụ nke sotere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta, ga-abụ oge eji emezu emume nsọ niile achọrọ maka ndị ahụ na anataghị ha noge ndụ anụ arụ ha.27

Enwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị maka nnukwu oge atọ nke atụmatụ nzọpụta: ya na njikọ ha nwekọrịtara n’ibe ha: (1) ụwa mmụọ tupu ndụ anụ ahụ, (2) ndụ anụ ahụ, na (3) ndụ nke na-abịa. Mana anyị maara eziokwu ndị a dị ebighị ebi: “Nzọpụta bụ mkpa otu onye, mana mbuli elu bụ mkpa nke ezi na ụlọ.”28 Anyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya onye na-ahụ na anyị natara ngọzi niile na uru ọbụla nke ọchịchọ na nhọrọ nke onwe anyị na-ekwe anyị. Anyị makwara na Ọ gaghị amanyere onye ọbụla ịbanye nime mmekọrịta nrachi nke megidere uche ya. Ngọzi niile nke mmekọrịta arachiri arachi ka ekwere na nkwa nye ndị niile ga-edebe ọgbụgba ndụ ha mana na-abụghị site na mmanye njikọ arachiri nelu onye ọzọ n’etozughi oke ma ọ bụ na-adịghị njikere.

Ezi ụmụnnem ndị nwoke na ndị nwanyị, A na m agba ama maka eziokwu dị nime ihe ndị a. A na m agba ama Jizọs Kraịst, “mmalite na ọgwụgwụ nke okwukwe anyị,”29 onye Aja Mgbaghara mmehie Ya, n’okpuru atụmatụ Nna anyị nke Eluigwe, kwere ka ihe niile kwe omume n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.