Ọgbakọ Zuru ọha
Mmegharị ahụ niile nke Ọkụ Zoro ezo
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Mmegharị ahụ niile nke Ọkụ Zoro ezo

Chineke na-anụ ekpere niile a na-ekpe ma na-azaghachi nye nke ọbụla niime ha dị ka otu ụzọ O depụtaworo maka ntozu oke anyị siri dị.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, a mụtawo m nkuzi na-egbu mgbu kemgbe ikpeazụ m nọọrọ n’ikpo okwu nke a na Ọktoba 2022. Nkuzi nke ahụ bụ: Ọ bụrụ na i nyeghị okwu kwere nnabata, e nwere ike ịmachibido gị maka ọtụtụ ọgbakọ ndị ọzọ ga-abịa. Unu nwere ike hụ na enyere m ọrụ isimbụ na nzukọ nke ugbu a. Ihe unu na-enweghị ike ịhụ bụ na edebere m n’ọnụ ụzọ ọnya nwere ngu na-esichaghị ike. Ọ bụrụ ma okwu nke a agaghị nnke ọma, agaghị m ahụ unu anya ruo ọgbako ole ma ole ọzọ.

Na mmụọ nke ọmarịcha ukwe ahụ ya na ọmarịcha kwaya nke a, a mụta wo m nkuzi ụfọdụ na nso nso a na, jiri enyem aka nke Onyenwe anyị, ọ masịrị m ikesara ya unu taa. Nke ahụ ga-eme okwu nke a abụrụ nke metụtara onwe m.

Nke kacha emetụta onwe na nke kacha egbu mgbu niime nhụmiihe nso nso ndị a bụ ọnwụ nke nwunye m hụrụ naanya, Pat. Ọ bụ nwanyị kacha ibe ya m maara—nwunye na nne zuru oke, a ga-ekwudị banyere ịdị ọcha ya, onyinye nke ngosipụta ya, na ịnọ niime mmụọ ya. O kwuru okwu otu mgbe akpọrọ “Imejuputa Ntụtụ nke Okike Gị.” O yiri m ka o mejuputara ntụtụ nke okike ya nke ọma karịa dị ka onye ọbụla nwere ike ịrọ nrọ. Ọ bụ nwaada nke Chineke zuru oke, onyeinyom ọmụmaatụ nke Kraịst. A bụ m onye kachasị enwe ihu ọma netiti ndịikom ibi afọ 60 nke ndụ m mụ na ya. Ọ bụrụ na m gosi ntozu oke, nrachi anyị pụtara na m pụrụ ịnọ mụ na ya mgbe ebighị ebi.

Nhụmiihe ọzọ malitere awa 48 mgbe olili nwunye m gasịrị. N’oge ahụ, akpọgara m ụlọ ọgwụ ọsọ ọsọ n’ọnọdụ ahụike siri ike. Mgbe ahụ a nọrọ m izu ụka anọ mbụ nke izu ụka isii ịnọ niime na isi ụlọ abịa nke ebe nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ na na mkpọte mgbe na mgbe.

Nhụmiihe m niile niime ụlọ ọgwụ n’oge ahụ furu efu na uche nchekwa m. Ihe na-efughị bụ uche nchekwa m nke njem neziụlọ ọgwụ, pụọ ruo n’ihe yiri okè nke ebighị ebi. E nweghị m ike ikwu nuju nhụmiihe ahụ ebe a, mana e nwere m ike kwuo na akụkụ nke ihe m natara bụ ndụmọdụ ịlaghachi na ije ozi m jiri ime ngwa ngwa karịrị akarị, nnyefechasị karịrị akarị, nlegide anya n’Onye Nzọpụta karịa, okwukwe karịa niime okwu Ya.

Ọ dịghị ihe m pụrụ ime kama iche na m naara anata vashọn nke onwe m nke mkpughe enyere Ndị Iri na Abụọ ihe ruru afọ 200 gara aga:

“Unu ga-agba aka ebe aha m … [ma] zipụ okwu m ruo nsọtụ niile nke ụwa. …

“… Ụtụtụ kwa ụtụtụ; na ụbọchị na ụbọchị, kwee ka olu nke ịdọ aka na nti gị gaa n’iru; na mgbe abalị bịara ekwela ka ndị bi n’ụwa rahụ ụra, n’ihi okwu ọnụ nke gị. …

“Bilie[,] … bulie obe gị, [ma] soro m.”1

Ezi ụmụnne m nwanyị na ụmụnne m nwoke, kemgbe nhụmiihe ahụ, agbalịwo m ibuli obe m nike karịa, jiri mkpebi karịrị akarị iji chọta ebe m nwere ike iweli olu onye ozi nke ma mkpom ọkụ ma ịdọ aka na ntị n’ụtụtụ, n’ehihie, ma niime abalị.

Nke ahụ na-eduga m ruo na eziokwu nke atọ nke bịara niime ọnwa niile nke nfunahụ, ọrịa, na mmekpa ahụ. Ọ bụ aka ebe emegharịrị ọhụrụ nke na obi ekele na-enweghị ọgwụgwụ maka ekpere niile siri ike nke Nzukọ nsọ nke a—ekpere gị—nke na m abụrụwo onye na-erite uru. Obi m ga-ejuputa n’ekele ruo ebighị ebi maka arịrịọ nke puku kwuru nke ndị mmadụ ndị, dị ka nwanyị isimkpe a na-achọ ịmanye,2 ugboro ugboro na-achọ ntinye aka nke eluigwe n’aha m. A natara m ngọzi niile nke ọkwa nchụaja, ma a hụrụ m ka ụmụ klas ụlọ akwụkwọ sekọndịrị m buru ọnụ maka m, dị ka ọtụtụ ngalaba ukwu dị iche iche mere gburugburu Nzukọ nsọ. Ma aha m bụ nke nọ nnọọ n’aha ekpere nke ihe ruru tempụl niile nimme Nzukọ nsọ.

N’obi ekele m miri emi maka ihe niile nke a, ana m esonye G. K. Chesterton, onye kwuru otu mgbe “na ekele bụ ụdị echiche kachasị elu; ma … ekele bụ obi ụtọ gbara mkpị ya na ntụnaanya.”3 Jiri “obi ụtọ gbara mkpị ya na ntụnaanya” nke onwe m, ana m ekele unu niile ma n’ekele Nna m dị n’Eluigwe, onye nụrụ ekpere unu niile ma gọzie ndụ m.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ana m agba ama na Chineke na-anụ ekpere niile a na-ekpe ma na-azaghachi nye nke ọbụla niime ha dị ka otu ụzọ O depụtaworo maka ntozu oke anyị siri dị. A matara m na ihe dị ka otu oge ahụ ọtụtụ ndị naara ekpe ekpere maka mweghachite nke ahụike m, ọnụọgụgụ hara aha—gụnyere m—naara ekpe ekpere maka mweghachite nke ahụike nke nwunye m. Ana m agba ama na ma ekpere ndị ahụ ka anụrụ ma a zara site n’aka Nna nke Eluigwe dị obi ebere dị nsọ, ọbụna ọ bụrụ na ekpere niile maka Pat ka ana azaghị aza otu m siri rịọ. Ọ bụ maka uche obi nke naanị Chineke maara ihe kpatara e si na-aza ekpere n’ụzọ dị iche iche karịa ka anyị tụrụanya—mana ana m ekwe nkwa unu a na anụ ha, ma ana aza ha dị ka otu ịhụnaanya na oge eluigwe na ala Ya na-adịghị ada ada siri dị.

Ọ bụrụ na anyị “arịọghị nke ọma,”4 enweghị oke ruo mgbe, ebe, ma ọ bụ banyere ihe anyị ga-ekpe ekpere maka. Dị ka otu mkpughe niile siri dị, anyị kwesịrị “ikpe ekpere mgbe niile.”5 Anyị kwesịrị ikpe ekpere, ka Amulek kwuru, niihi “ndị ahụ gbara gị gburugburu,”6 jiri nkwenye na “ekpere siri ike nke [ndị] ezi omume na-eme ka ọtụtụ ihe dị ire.”7 Ekpere anyị kwesịrị ịda ụda mgbe anyị nwere ohere naanị anyị iji kpee ha.8 Ọ bụrụ na nke ahụ ekweghị omume, aga eme ha dị ka okwu ọnụ dị jụụ niime obi anyị.9 Anyị na-agụ uri na ekpere bụ mmegharị niile nke ọkụ zoro ezo,”10 aga na-enye mgbe niile, dị ka otu Onye Nzọpụta N’onwe Ya siri mee, nye Chineke Nna nke Ebighị ebi n’aha nke Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya.111

Ndị enyi m hụrụ naanya, ekpere anyị bụ awa anyị kachasị dị ụtọ,12 ezi ọchịchọ”13 anyị kachasị, ụdị ofufe anyị kachasị dị mfe, kachasị dị ọcha.14 Anyị kwesịrị ikpe ekpere otu n’otu, niime ezi na ụlọ anyị, na niime igwe ndị ụka nke nhata niile.15 Anyị kwesịrị iji ekpere dị ka ngwa nchekwa megide ọnwụnwa,16 ma ọ bụrụ ma e nwee oge ọbụla ọdịghị anyị ka ikpe ekpere, o nwere ike doo anyị anya na ndọla azụ ahụ anaghị abịa site na Chineke, onye na-enwe agụụ ikwurịtara ụmụ Ya n’oge ọbụla na n’oge niile. N’ezie, ụfọdụ mbọ igbochi anyị site n’ikpe ekpere na-abịa kpọmkwem site n’aka onye iro ahụ.17 Mgbe anyị amaghị otu ma ọ bụ kpọmkwem maka ihe anyị ga-ekpe ekpere, anyị kwesịrị ịmalite, ma gaaniihu, tutu ruo Mmụọ Nsọ eduba anyị baa niime ekpere anyị kwesịrị ịdị na-ekpe.18 Omume nke a nwere ike bụrụ nke anyị ga-akpọku mgbe anyị na-ekpe ekpere maka ndị iro anyị na ndị ahụ na-eji anyị eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma.19

N’ikpeazụ, anyị pụrụ ile anya n’ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta, onye kpere ekpere ọtụtụ mgbe niile. Mana ọ na-abụkarị ihe na-akpali akpali nye m na Jizọs nwere mmetụta mkpa ọ dị ikpe ekpere. Ọ bụ na O zughị oke? Dị ka gịnị ka O kwesịrị iji kpee ekpere maka ya? N’ezie, A bịawo m mata na Ya nwa kwa, anyị na ya, chọrọ “ịchọ ihu [nke Nna], kwere n’okwu ya, ma tụkwasị obi na amara ya.”20 Oge n’aga, Ọpụrụ site n’ọha ịnọ naanị ya tupu ịkpọpe eluigwe jiri ekpere Ya niile.21 N’oge ndị ọzọ, O kpere ekpere n’etiti ndị nsiso ole ma ole. Emesịa Ọ ga-achọ eluigwe n’aha igwe mmadụ ndị ga-anọ mpaghara ugwu ukwu. Mgbe ụfọdụ ekpere na-eto uwe Ya.22 Mgbe ụfọdụ ọ na-eto mbara ihu Ya.23 Mgbe ụfọdụ O na-eguzo ekpe ekpere, mgbe ụfọdụ O sekpuru, ma opekampe Ọ dara niihu Ya otu mgbe ikpe ekpere.24

Luk kọwara okpu nke Jizọs ruo na nkpuchi Ya dị ka ịna achọ Ya ikpesi ekpere “ike karịa.”25 Mana kedụ otu onye zuru oke si ekpesi ekpere ike karịa? Anyị na-ewere na ekpere Ya niile siri ike, otu ọ dị n’imejuputa aja mgbaghara mmehie Ya na site na mgbu nke ruru nsọtụ ụwa, O metụrụ Ya ikpe ekpere na arịrịọ karịa, jiri arọ nke onyinye Ya n’ikpeazụ iwepụta ọbara site na oghere ọbụla.

Nihi mmeri nke Kraịst meriri megide ọnwụ na onyinye Ya nso nso a nye m nke izu ụka ole ma ole ma ọ bụ ọnwa ole ma ole na ndụ anụ ahụ, ana m agba aka ebe dị nsọ nke nsiridị nke ndụ ebighị ebi na mkpa ọ dị maka anyị ịkpachapụ anya ịhazi maka ya.

Ana m agba aka ebe na mgbe Kraịst a-abịa, O kwesịrị ịkọta anyị—ọbụghị dị ka ndị otu ọnụọgụgụ edepụtara na ndekọihe baptizim gbachasịrị agbachasị mana dị ka ndị na-eso ụzọ raara onwe nye nke ọma, na ekwere na nkwesị ntụkwasị obi, na-edebe ọgbụgba ndụ. Nke a bụ okwu dị ngwa ngwa nye anyị niile, n’ụjọ anyị anụ na akwa ụta dị ọjọọ: “Ọ dịghị mgbe m ma gị,”26 ma ọ bụ, dị ka Josef Smith tụgharịrị asụsụ nkebiokwu ahụ, “[Ọdịghị] mgbe Ị ma m.”27

Na ime nke ọma, anyị nwere enyemaka maka ọrụ nke a—ọtụtụ enyem aka. Anyị kwesịrị ikwere na mmụọ ozi na ọrụ ebube niile na nkwa niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Anyị kwesịrị ikwenye n’onyinye nke Mmụọ Nsọ,ike mmetụta nke ezigbo ezi na ụlọ na ndị enyi na ike ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ. Anyị kwesịrị ikwere na mkpughe na ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe na Onyeisi Russell M. Nelson. Anyị kwesịrị ikwere na jiri ekpere na arịrịọ anyị na ezi omume nke onwe anyị, anyị n’ezie pụrụ irigo elu “Ugwu ukwu Zayọn, … obodo ukwu nke Chineke dị ndụ, ebe nke eluigwe, ebe kachasị dị nsọ nke ebe niile.”28

Ụmụnne nwoke na ụmụnne mwanyị, dị ka anyị na-echegharị site na njọ anyị ma bịa na-atụghị egwu ruo na “ocheze nke amara,”299 ahụ hapụrụ n’ihu Ya ebe ahụ onyinye niile na arịrịọ anyị niile nke si n’ala ala obi, anyị ga-achọta ebere and ọmịiko na mgbaghara n’aka onye obi ebere nke Nna anyị nke Ebighị ebi na Ọkpara Ya nwere nrube isi, dị ọcha zuru oke. Emesịa, Job na ndị niile nkwesịrị ntụkwasị obi asachara asacha, anyị ga-ahụ “ụwa mafere mgba oke”30 iji ghọta. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen