Ọgbakọ Zuru ọha
Iguzosi ike n’ezi ihe: Ejiri mara Ịdị ka Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Iguzosi ike n’ezi ihe: Ejiri mara Ịdị ka Kraịst

Ibi ndụ nke iguzosị ike n’ezi ihe chọrọ anyị izi ezi nye Chineke, nye onye na ibe ya, ma nye ọdịdị anyị si na chi.

Na-awa mmechi ozi nke Onye Nzọpụta, Ọ gara n’elu ukwu Olives banye n’ubi nta a kpọrọ Getsemani ma kpọkuo ndị na-eso ụzọ Ya ka ha chere.1 Ugbu a nọrọ naanị Ya, Ọ rịọrọ Nna Ya, Ọ bụrụ na Ị ga-ekwe, napụ m iko nke a.”2 Ebe Ọ nọ niihe mgbu, ahụhụ Ya kpatara Ya, ọbụna Chineke, onye kachasị ihe niile, ịma jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, … chọọ ka [Ọ] ghara ịn̄ụ n’iko ilu, ma wee laa azụ.”3 Ma otu ọ dị niime oge obi nkoropu dị omimi, Onye Nzọpụta alaghị azụ “kama riri ma mesịa nkwadobe [Ya] niile nye ụmụ mmadụ.”4

Dị ka Onye nke Nna Mụrụ Naanị Ya, Jizọs Kraịst nwere ike imeri ọnwụ, mgbu, na ahụhụ mana ọ laghị azụ. O mejuputara ọgbụgba ndụ O meworo ya na nna Ya ma, na ime otu ahụ, gosịpụtara ejiri mara ịdị ka Kraịst jiri bawanye ịdị mkpa na ụwa nke anyị bi niime ya— ejiri mara nke igosị ike n’ezi ihe. Ọ nọgidere na-ịbụ eziokwu nye Chineke, nye onye ọbụla niime anyị, nye ọdịdị Ya dị nsọ.

Igosị ike n’ezi ihe

Jizọs Kraịst bụ onye anyị ji ama atụ. Ibi ndụ nke iguzosị ike n’ezi ihe chọrọ anyị izi ezi nye Chineke, nye onye na ibe ya, ma nye ọdịdị anyị si na chi. Igosị ike n’ezi ihe na-asọpụta site na nnukwu iwu nsọ nke mbụ ịhụ Chineke naanya. Niihi na ị hụrụ Chineke naanya, iziri ezi n’ebe Ọ nọ n’oge niile. Ịghọtara na e nwere ezi ihe na ihe ọjọọ, ma enwere eziokwu bụ kpoo—eziokwu nke Chineke. Iguzosị ike n’ezi ihe pụtara na anyị anaghị ebelata ụkpụrụ anyị ma ọ bụ agwa anyị iji mete mmadụ mma ma ọ bụ nwee nnabata site n’aka ndị ọzọ.5 Ị “ga-eme ihe ziri ezi” ma “hapụ ka mpụtara ya sote.”6 Mmegharị ndị e mere na nso nso a nye Kwusaa ozi ọma akwụkwọ ọmụmụ ihe ndị mgbasa ozi ọma karịsịa gbakwunyere iguzosị ike n’ezi ihe dị ka ejiri mara Kraịst.7

Ọtụtụ afọ gara aga, Okenye Uchtdorf ka e kenyere ọrụ ịhazi stek anyị. N’oge ịgba ajụjụ ọnụ anyị, ọ jụrụ m otu ajụjụ nke m na-echefubeghị: “Enwetụwo ihe ọbụla niime ndụ gị nke, ọ bụrụ na-ewete ya n’uche nke ndị ọha na eze, ga-abụ ihe ihere nye gị ma ọ bụ Nzukọ nsọ?” N’ịtụnaanya, uche m gbagara ọsịsọ na ndụ m niile, na-agba mbọ icheta oge ndị ahụ mgbe m nweworo ike metaghazighị ihe niile ma na-ajụ onwe m, ọ bụrụ na ndị ọzọ maara ihe niile nke m meworo, gịnị ka ha ga-eche banyere m ma ọ bụ Nzukọ nsọ?

N’oge ahụ, e chere m na Okenye Uchtdorf naara ajụ naanị maka ihe gbasara itozu oke, mana abịawo m mata na ọ bụ n’ezie ajụjụ gbasara iguzosị ike n’ezi ihe. Eguzosịrị m ike na ihe m na-ekwusa? Ụwa ha ga-ahụ iguzosị ike n’etiti mkpụrụokwu m na omume m niile? Ndị ọzọ ha ga-ahụta Chineke site na otu m si akpa agwa?

Onyeisi Spencer W. Kimball kuziri, “Iguzosị ike n’ezi ihe” bụ “…ịdị njikere anyị na ike anyị iji bie ndụ site na nkwenye anyị na ime mkpebi anyị.”8

Ikwesị ekwesị nye Chineke

Ibi ndụ nke iguzosị ike n’ezi ihe chọrọ anyị na mbụ ibute ụzọ kwesị ekwesị nye Chineke.

Na mmalite oge anyị na-eto eto, anyị mụtara akụkọ gbasara Daniel nọ n’ogige ọdụm. Daniel nọọrọ n’izi ezi nye Chineke. Ndị ya na ha ha na-ekworo ya ekworo “nọọrọ na-achọ otu ha ga-esi megide [ya]”9 ma chepụtara otu iwu na-amanye ikpere chi ndị arụsị ha naanị. Daniel maara banyere iwu ahụ mana lara n’ebe obibi—site na “ọnụ mpio ya niile ghere oghe”10—gbisara ma kpee ekpere ugboro atọ n’ụbọchị nye Chineke nke Israel. Site na rizọọtụ ahụ, a kwabara Daniel niime ọgba ọdụm. N’isi ụtụtụ, eze ahụ chọpụtara na Chineke nke Daniel anapụtawo ya ma nye iwu ọhụrụ na mmadụ niile kwesịrị ịma jijiji ma tụọ Chineke nke Daniel egwu: niihi na ọ bụChineke dị ndụ.”11

Eze ahụ bịara mata Chineke site n’iguzosị ike n’ezi ihe nke Daniel. Ndị ọzọ na-ahụ Chineke site na nke anyị—mkpụrụokwu na omume niile. Dị nnọọ ka Daniel, ịkwesị ekwesị nye Chineke ga na-abawanye edopụ anyị iche site na ndị ụwa.

Onye Nzọpụta na-echetara anyị, “Niime ụwa unu ga-enwe mkpagbu: mana nwee nụ ańụrị; E meriela M ụwa.”12 Onyeisi Russell M. Nelson nyere ndụmọdụ: “[Imeri ụwa] pụtara imeri ọnwụnwa inwe mkpachara anya karịrị akarị gbasara ihe nke ụwa nke a karịa ihe ndị nke Chineke. Ọ pụtara ịtụkwasị obi na ozizi nke Kraịst karịa ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ndị nọ n’ụwa.”13 Otu aka ahụ, anyị ahaghị ịgbanarị ọnwụnwa ije ije n’ụzọ nke onwe [anyị], na n’usoro chi nke onwe [anyị], nke oyiyi ya dị n’ụdị nke ndị ụwa.”14

Ihe mgbochi nke ụwa nke a bụ akụkụ atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke dị oke mkpa. Otu anyị si azaghachi n’ọdịdọ ahụ bụ ihe mere anyị ji bụrụ ihe anyị bụ—ihe eji na-atụ anyị iguzosị ike n’ezi ihe. Ọdịdọ nke ụwa nwere ike dịrị kpọm kwem dị ka ibibi ikwesị ntụkwasị obi na alụm di na nwunye ma ọ bụ dịrị nọọ ka aghụghọ eyighị garment temple iji zute nhọrọ otu i si ebi ndụ. Itinye iguzosị ike n’ezi ihe n’ọrụ niime nhọrọ anyị bụ ngosipụta a na-ahụ anya nke mkpebi ime ime iji soro Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst.

Ikwesị ekwesị nye Ndị ọzọ

Dị nọọ ka iguzosị ike n’ezi ihe na-asọpụta site na nnukwu iwu nsọ nke mbụ ịhụ Chineke naanya, ikwesị ekwesị n’ebe onye na ibe ya nọ na-asọpụta site na nke abụọ, ịhụ ndị agbata obi anyị naanya dị ka onwe anyị. Ndụ nke iguzosị ike n’ezi ihe abụghị ndụ nke izu oke; ọ bụ ndụ nke anyị na-agba mbọ ụbọchị niile ibu ụzọ kwesị ekwesị nye Chineke ma niime ọnọdụ ahụ ịbụ ndị kwesịrị ekwesị nye ndị ọzọ. Onyeisi Oaks na-echetara anyị, “Ọnụnụ ọkụ n’obi anyị idobe iwu nsọ nke abụọ agaghị akpatara anyị ichefu nke mbụ.”15

Ndị ụwa na-abawanye na-agba mgba n’iguzosị ike n’ezi ihe site n’ibokwasị usoro iwu eji eme ihe ma ọ bụ usoro ukporo nke na-achịkwa mmekọrịta n’etiti ndị mmadụ na otu niile. Ebe ọ dị mma, ụkpụrụ ndị a gburugburu adabereghị n’eziokwu hoo haa ma tụrụ ikpughe site n’ịdabere na nnabata omenaala. Nke yiri ajụjụ Okenye Uchtdorf jụrụ, ụfọdụ otu na-enye ndị ọrụ ọzụzụ iji tụlee ihe mkpebi ha ma ọ bụ usoro ime mkpebi ga-adị ka ya ma ọ bụ ma ebipụta ya n’ikuku ma ọ bụ na ihu akwụkwọ nke akwụkwọ ozi bụ kpoo. Dị ka Nzukọ nsọ na-apụta site na ọchịchịrị na itiri,16 anyị dị ka Daniel, ahaghị ikuli karịa ihe ndị ụwa tụrụ anya ya ma ghọọ ihu nke ezi Chineke dị ndụ n’oge niile na n’ebe niile.17

Ị na-ekwu na anyị na-eguzosị ike n’ezi ihe ezughị oke ma ọ bụrụ na ihe ndị anyị na-eme anaghị adabacha n’okwu anyị na-ekwu. Otu aka ahụ kwa, obi ọma nke onye na-eso Kraịst abụghị ihe nnọchi anya maka iguzosị ike n’ezi ihe. Dị ka ndị ọgbụgba ndụ, na dị ka ndị ndu nke Nzukọ nsọ Ya, anyị ahaghị ịbụ ndị karịrị ịta ụta ma kwụrụ n’ọgbara n’ọgbara na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị hiwere.

Ị na-eme ihe site n’iguzosị ike n’ezi ihe na-ewulite okwukwe na ntụkwasị obi ma nye ndị ọzọ mmasigharị obi ike na anyị na-achọ naanị ime uche Onyenwe anyị. Niime kansụl anyị, anyị na-ezere mmekụta ndị na-abụghị ndị otu anyị ma soro usoro nke Onyenwe anyị kpughere ịchọ nghọta site n’aka nwanyị na nwoke ọbụla ma na-eme ihe guzosiri ike site na ndụmọdụ mkpate mmụọ anatara.18

Anyị na-elekwasị Onye Nzọpụta anya, ma anyị na-akpachara anya iji zere omume ndị e nwere ike ịhụta dị ka ime ihe ndị bụ maka ọdịmma nke anyị, ezi na ụlọ anyị na-erite uru, ma ọ bụ imeta onye ọzọ mma ebe a na-ahapụ onye nke ọzọ. Anyị na-eme ihe niile kwere omume iji zere nghọta ọbụla nke ihe omume anyị nwere ike inwe mmetụta na ya site na nsọpụrụ nke ụmụ mmadụ,19 iji nata mmata nke onwe onye, bute inwe mmasị n’ọtụtụ ihe, bụrụ ihe aga eńomi eńomi, ma ọ bụ bipụta.

Eziokwu nye Njiri mara Anyị Si na chi

N’ikpeazụ, ibi ndụ nke iguzosị ike n’ezi ihe chọrọ anyị izi ezi, nye ọdịdị anyị si na chi.

Anyị maara ụfọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. Otu kachasị iji ama atụ bụ Kọrịhọ onye na-ekweghị na Kraịst, onye duhiere mkpụrụ obi nke ọtụtụ mmadụ, na-ekwu ihe na-atọ “uche nke anụ ahụ ha ụtọ.”20 Otu ọ dị, n’oge ikpeazụ nke ndụ ya, o mere nkwupụta, “A maara m oge niile na enwere otu Chineke.”21 Onyeisi Henry B. Eyring akuziwo na ịtụ asị “megidere ọdịdị nke mmụọ anyị,”22 ejiri mara anyị si na chi. Kọrịhọ duhiere onwe ya, ma eziokwu anọghị ya niime.23

N’aka nke ọzọ, Onye amụma Josef Smith n’obi ike mara ọkwa, “A maara m ya, ma a maara m na Chineke maara ya, ma enweghị m ike ịgọnarị ya.”24

Hyrum nwanne Josef nke nwoke ka Onyenwe anyị hụrụ naanya “niihi iguzosị ike n’ezi ihe nke mkpụrụ obi ya.”25 Ya na Josef nọgidere n’ikwesị ekwesị ruo ọgwụgwụ—ikwesị ekwesị nye ejiri mara ha si na chi, ihe na mmata ihe nke ha natara, na ikwesị ekwesị nye onye ahụ ha maara ha nwere ike ịghọ.

Na mmechi

Anyị nwere ike mee udo n’onwe anyị “nye uche Chineke”26 ma wulite ejiri mara Kraịst nke iguzosị ike n’ezi ihe. Ka anyị soro onye ọmụmaatụ anyị, Onye Nzọpụta nke ụwa, ma hapụ ịla azụ mana bie ndụ nke kwesịrị ekwesị nye Chineke, nye onye na ibe ya, na nye ejiri mara anyị si na chi.

Dị ka Job kwuru, “Ka atụọ m na ọbụna na nhata nha, nke ga-eme ka Chineke wee mara iguzosị ike n’ezi ihe m.”27 N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.