Ọgbakọ Zuru ọha
Ihe Niile Ga-adị Mma N’ihi Ọgbụgba ndụ niile nke Tempụl
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ihe Niile Ga-adị Mma N’ihi Ọgbụgba ndụ niile nke Tempụl

Ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ịsọpụrụ ọgbụgba ndụ niile nke unu meworo ma ọ bụ ga-eme n’ime tempụl.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị m hụrụ n’anya, nzukọ a nke ọgbakọ zuru ọha bụụrụ m, oge dị nsọ. E nwere m obi ekele maka ọrụ ahụ ịgwa ọtụtụ nde Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a na ndị enyị anyị n’ofe ụwa. A hụrụ m unu n’anya, ma A mara m na Onyenwe anyị hụrụ unu n’anya.

Ihe karịrị afọ 50 gara aga, E nwere m ohere ije ozi dịka onyeisi nke Ricks College n’ime Rexburg, Idaho. Na ụtụtụ nke June 5, 1976, nwunye m, Kathy, na mụ nyara ụgbọala site na Rexburg ruo Tempụl Idaho Falls Idaho ịga nrachi nke otu ezi enyi. N’ezie, ebe ụmụ nwoke nta anọ nọ n’ebe obibi anyị n’oge ahụ, anyị pụrụ ike ime njem tempụl naanị site n’enyemaka nke onye nlekọta nwa nwere obi ike! Anyị hapụrụ ụmụ anyị dị oke ọnụ ahịa n’aka ya ma jiri nkeji 30 nya ụgbọala gaa.

Nhụmihe anyị nime tempụl n’ụbọchị ahụ dị ebube, dịka ọ na-adị bu. Ka o sila dị, mgbe e machisịrị nrachi nke tempụl ahụ—ma ka anyị na-akwado ịlaghachi n’ebe obibi—anyị hụrụ ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ na tempụl na ndị bịara abịa ka ha ji ụjọ na-akparịta ụka n’ọnụ nke tempụl ahụ. N’ime obere oge, otu n’ime ndị ọrụ tempụl gwara anyị na Teton Dam a rụrụ ọhụrụ na ọwụwa anyanwụ Idaho adaala! Mmiri karịrị ijeri galọn 80 (mita cubic 300) nọ na-asọfe na dam ahụ wee banye na 300 square miles (775 square km) nke ndagwurugwu niile gbara agbata obi. Ọtụtụ n’ime obodo Rexburg nọ n’okpuru mmiri, ebe idei mmiri niile buru ọtụtụ ụlọ na ụgbọ ala. Ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ndị 9,000 bi ebe ahụ enweghị ebe obibi na mberede.1

Dị ka ị nwere ike iche n’echiche, echiche na nchegbu anyị niile tụgharịrị na nchekwa na ọdịmma nke ụmụ anyị anyị hụrụ n’anya, ọtụtụ narị ụmụ akwụkwọ kọleji na ngalaba, na obodo anyị hụrụ n’anya. Anyị erughị maịlụ 30 (50 km) site n’ebe obibi, ma n’ụbọchị a, ogologo oge tupu ekwentị na ozi ederede, anyị enweghị ụzọ anyị ga-esi na-ekwurịta okwu ozugbo anyị na ụmụ anyị, ma ọ bụ na anyị nwere ike ịnya ụgbọ ala site na Idaho Falls laghachi Rexburg, n’ihi na okporo ụzọ niile mechiri emechi.

Naanị otu nhọrọ anyị nwere bụ ịrahụ n’abalị ahụ n’otu ụlọ oriri dị na Idaho Falls. Kathy na mụ gbukọrọ ikpere n’ala n’ime obere ọnụ ụlọ oriri anyị ma jiri obi umeala rịọ Nna nke Eluigwe maka nchekwa nke ụmụ anyị hụrụ n’anya na puku kwuru puku nke ndị ọzọ ihe omume ahụ jọgburu onwe ya metụtara. Ana m echeta Kathy ka ọ na-agagharị n’ala ụlọ ruo n’isi ụtụtụ, na-echekasị uche maka ụmụ ya. N’agbenyeghị nchegbu m niile, E nwere m ike ime ka obi ruo m ala ma rahụọ ụra.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị ezigbo onye nsiso ebighị ebi m kpọtere m ma sị, “Hal, kedu ka ị ga-esi hie ụra n’oge dị otu a?”

Okwu niile ndị a mgbe ahụ bịara nke ọma na obi na uche m. A gwara m nwunye m: “Kathy, n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta, ihe niile ga-adị mma n’ihi tempụl ahụ. Anyị na Chineke emewo ọgbụgba ndụ niile ma arachie anyị dịka ezi na ụlọ ebighị ebi.”

N’oge ahụ, ọ dị ka a ga-asị na Mmụọ nke Onyenwe anyị kwadoro n’ime obi anyị na uche anyị ihe anyị abụọ maburu na ọ bụ eziokwu: emume nsọ nrachi niile, nke a chọtara naanị n’ụlọ nke Onyenwe anyị ma bụrụ nke a na-achịkwa site n’ikike nke ọkwa nchụaja zuru oke, ekekọtawo anyị ọnụ dịka di na nwunye, ma ụmụ anyị ka arachiri nye anyị. N’ezie ọ dịghị mkpa ịtụ egwu, ma anyị nwekwara ekeie mgbe e mesịrị ịmata na onweghị ihe mere ụmụ anyị nwoke.

Ikekwe okwu a sitere n’aka Onyeisi Tọmọs S. Monson na-akọwa nke ọma ihe mmetụta Kathy na mụ nwere n’abalị ahụ agaghị echefu echefu. “Dịka anyị na aga na tempụl, enwere ụdị ọnọdụ ime mmụọ nwere ike ibiakwute anyị na nmetụta nke udo. … Anyị nwere ike ịghọtatụ ihe nkọwa okwu nke Onye Nzọpụta ahụ mgbe Ọ okwuru sị: ’Udo Ka Mụ na ahapụrụ unu, udo m ka M nyere unu. … Unu enyela obi unu nsogbu, nke unu ji atụ ụjọọ [Jọn 14:27].’”2

A gọziri m inwe udo ahụ mgbe ọbụla m banyere tempụl ahụ dị nsọ. E chetara m ụbọchị mbụ m banyere n’ime Tempụl Salt Lake. A bụụrụ m nwa okorobịa.

E lere m anya n’uko ụlọ na-acha ọcha dị elu nke mere ka ọnụ ụlọ ahụ nwere ihé di ka ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o ghere oghe ruo mbara igwe. Ma n’oge ahụ, echiche ahụ batara n’uche m n’okwu doro anya: “A bịala m ebe a na-enwu ọkụ na mbụ.” Ma ozugbo ahụ ọ batara n’obi m, ọ bụghị n’olu nke m, okwu ndị a: “mba, ị bịabeghị ebe a mbụ. Ị na-echeta otu oge tupu a mụọ gị. Ị nọ n’ebe dị nsọ dị ka nke a ebe Onyenwe anyị nwere ike ịbịa.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, A na m eji obi umeala na-agba ama na ka anyị na-aga tempụl, anyị nwere ike icheta maka ọdịdị ebighị ebi nke mmụọ anyị niile, mmekọrịta anyị na Nna na Ọkpara Ya dị nsọ, na oke ọchịchọ anyị ịlaghachi n’ebe obibi anyị nke elu-igwe.

N’ime okwu n’ọgbakọ nso nso a, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri:

“Ebe kacha nwee nchekwa ime mmụọ bụ ibi ndụ nime ọgbụgba ndụ gị niile nke tempụl!”

Ihe niile anyị kwenyere ma nkwa niile nke Chineke meworo nye ndị Ya ndị gbara ndụ na-abịakọta ọnụ nime tempụl.”3

“Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile … niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst.”4

Ọ kuzikwara na “ozugbo anyị na Chineke mere ọgbụgba ndụ, anyị na-ahapụ ọnọdụ nkiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke agaghị ahapụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ meworo ụdị njikọta ahụ ha na Ya. N’ezie, ndị ahụ niile ha na Chineke meworo ọgbụgba ndụ nwere ohere inwete ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche.”5

N’okpuru nduzi mmụọ nke Onyeisi Nelson, Onyenwe anyị emewo ngwa ngwa, ma ga-aga n’ihu na-eme ngwa ngwa, owuwu nke tempụl niile n’ofe mba ụwa. Nke a ga-enye ụmụ Chineke niile ohere ịnata emume nsọ nke nzọpụta na mbuli elu na ime na idobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ. Itozu oke ime ọgbụgba ndụ dị nsọ abụghị mgbalị otu oge kama ọ bụ usoro ndụ. Onyenwe anyị ekwuwo na ọ ga-ewere obi anyị niile, ike, uche, na ume.6

Ime emume nsọ niile nke tempụl ugboro ugboro nwere ike imepụta ụkpụrụ nke nraranye nye Onyenwe anyị. Mgbe ị na-edobe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl gị ma cheta ha, ị na-akpọta mkparịkọta nke Mmụọ Nsọ ka o wusie gị ike ma sachaa gị.

Ị nwere ike mgbe ahụ nweta mmetụta nke ihé na olile anya na-agba ama na nkwa niile ahụ bụ eziokwu. Ị ga-amụta na ọgbụgba ndụ ọbụla nke anyị na Chineke na-enwe bụ ohere ịbịaru Ya nso, nke ga-emesị wepụta ọchịchọ n’ime obi gị nke idebe ọgbụgba ndụ niile tempụl.

E kweela anyị nkwa, “N’ihi ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, Ọ gaghị ma ọlị ada mba na mbọ Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị enwe ike ma ọlị ewerecha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ.”7

Ọ bụ site na ọgbụgba ndụ nrachị n’ime tempụl ahụ ka anyị nwere ike ịnata mmasi obi ike nke njikọ niile ezinụlọ nwere ịhụnan’anya nke ga-aganiihu mgbe ọnwụ gasịrị ma nọgide ruo ebighị ebi. Idobe ọgbụgba ndụ niile nke ọlụlụ di na nwunye na ezinaụlọ emere n’ime tempụl niile nke Chineke ga-enye nchekwa site na ihe ọjọọ nke ịchọ ọdịmma onwe nampako.

Ilekọta ụmụnne nwoke na nwanyị mgbe niile maka ibe ha ga-abịa naanị site n’ịgbasi mbọ ike iduzi ezinaụlọ unu n’ụzọ nke Onyenwe anyị. Nye ụmụaka ohere ikpe ekpere maka ibe ha. Ghọta ngwa ngwa mmalite nke esemokwu, ma mara nke ọma omume niile nke ozi achọghị ọdịmma onwe, karịsịa nye ibe unu. Mgbe ụmụnne na-ekpe ekpere maka ibe ha ma na-ejere ibe ha ozi, obi ga-adị nrọ ma chigharịkwuru ibe ha na ndị mụrụ ha.

N’akụkụ, nke a bụ ihe Malakaị kọwara dị ka o buru n’amụma banyere Elijah onye amụma: “Ọ ga-akụnyekwa n’ime obi niile nke ndị bụ ụmụ nkwa niile ahụ e kwere ndị bụ nna ha, na obi nile nke ndị bụ ụmụ ga-atụgharị kwute ndị bụ nna ha. Asị na ọ bụghị otu ahụ, ụwa niile ga-ala n’iyi kpam kpam n’ọbịbịa ya.”8

Ọnwụnwa niile, ihe ịma aka niile, na obi mgbawa ga-erutarịrị anyị niile. Ọ dịghị onye ọ bụla nime anyị na-agaghị enwe “ogwu niile [nke] anụ ahụ.”9 Ma, ka anyị na-aga tempụl ma na-echeta ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị nwere ike ịkwado ịnata ntuziaka nke onwe site n’aka Onyenwe anyị.

Mgbe mụ na Kathy lụrụ ma mee nrachi n’ime Tempụl Logan Utah, mgba ahụ Okenye Spencer W. Kimball mere nrachi anyị. N’ime okwu ole na ole o kwuru, o nyere ndụmọdụ a: “Hal na Kathy, bie ndụ unu ka mgbe oku na-abịa, unu nwere ike ịpụ ngwa ngwa.”

Na mbụ, anyị aghọtaghị ihe ndụmọdụ ahụ pụtara nye anyị, ma anyị mere ike anyị niile ibi ndụ n’ụzọ anyị ga-adị njikere ijere Onyenwe anyị ozi mgbe oku ahụ bịara. Mgbe anyị lụrụla ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 10, oku a na-atụghị anya ya bịara site n’aka Commissioner nke Agụmakwụkwọ Nzukọ nsọ, Neal A. Maxwell.

Ndụmọdụ ịhụnanya nke Onyeisi Kimball nyere nime tempụl ka e nwee ike “ịpụ nụzọ dị mfe” wee bụrụ eziokwu. Mụ na Kathy nwetara ọkpụkpọ oku ịhapụ ihe yiri ọnọdụ ezinaụlọ na-adịghị mma na Califonia iji jee ozi na ọrụ n’ebe m na-amaghị ihe ọ bụla gbasara ya. Otu o sila dị, ezinaụlọ anyị dị njikere ịpụ n’ihi na otu onye amụma, n’ime tempụl dị nsọ, ebe mkpughe, hụrụ ihe omume ga-eme n’ọdịnihu nke anyị kwadobere maka ya.

Ezi ụmụnne nwoke na ụmụ nwanyị, ana m agba ama na ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ịsọpụrụ ọgbụgba ndụ niile nke unu meworo ma ọ bụ nwere ike mee n’ime tempụl. N’agbanyeghị ebe ị nọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ, ana m arịọ gị ka i tozuo oke ma dịrị na njikere ịga na tempụl. Ga ugboro ugboro dị ka ọnọdụ niile ga-ekwe. Mee ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ gị na Chineke. E nwere m ike imesi gị obi ike maka otu eziokwu ahụ m gwara Kathy n’etiti abalị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri ise gara aga n’ime obere ọnụ ụlọ oriri Idaho Falls: “N’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta, ihe niile ga-adị mma n’ihi ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.”

Ana m agbara unu akaebe na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Ọ dị ndụ ma n’edu Nzukọ nsọ Ya. Tempụl niile bụ ụlọ niile nke Onyenwe anyị. Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Chineke dị ndụ n’elu ụwa. A hụrụ m ya n’anya, ma A hụrụ m onye ọ bụla n’ime unu n’anya. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.