Ọgbakọ Zuru ọha
Ebumnoobi nke Chineke Bụ Ịkpọlata Gị Ebe obibi
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ebumnoobi nke Chineke Bụ Ịkpọlata Gị Ebe obibi

Ihe niile gbasara atụmatụ nke Nna maka ụmụ Ya ndị Ọ hụrụ naanya ka emewere iji kpọtaghachi onye niile ebe obibi.

Ọ ga-amasị m ikwuputa obi ekele maka ekpere unu dị ka m maliteworo usoro nke ịnọkwata n’okpụkpọ oku a, sitere n’aka Onyeisi Nelson, ije ozi dị ka Onye Ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Eleghị anya unu nwere ike n’ezie chee otu umeala nke a dịworo, ma ọ bụrụwo oge nke ọgba aghara pụrụ iche na ule nke onwe na-akpa echiche. Ọ bụ, kosiladị, n’ezie nkwanye ugwu dị ukwuu ijere Onye Nzọpụta ozi, n’ọkwa ọbụla, nakwa isonyere gị na-ikesa ozi ndị dị mma nke ozi ọma nke olileanya Ya.

Gafee nke ahụ, ekwuwo ya rịị na n’azụ Onye Ozi nke ọbụla guzooro nne nwunye dị ịtụnanya. Amaghị m ma ekwuwo nke ahụ n’ezie, mana n’okwu nke a, o nwere ike n’ezie ịbụ. Ma ana m arụtụ aka na eziokwu na nne nwunye m anọghịkwa ya enweghị ihe ọ na-eme iji belata ịdị ịtụnaanya ya.

Ọtụtụ ọnwa gara aga, mgbe mụ na nwunye m naara aga nleta na mba ọzọ maka ọrụ Nzukọ nsọ niile dị iche iche, etetara m n’isi ụtụtụ ma lee anya nke ọma n’ezi mpio họteelụ anyị. Na ngwụcha ama ndị mmadụ juru, a hụrụ m na ihe mgbochi ụzọ ka etinyere ya na ndị uwe ojii guzooro nso ịtụgharị ụgbọala gburugburu dị ka ha rutere ihe mgbochi ahụ. Na mbụ, naanị ụgbọala ole ma ole gbara n’ụzọ okporo ama ahụ ma achụgharịrị ha azụ. Mana dị ka oge na-aga ma trafik abawanye, ogologo ụgbọala kwụ n’ahịrị malitere ịbawanye.

Site na mpio dị n’elu, e lere m dị ka onye uwe ojii yiri ka ọ na-enwete afọ ojuju n’ike ya igbochi ihe ndị na-eme n’ụzọ ma na-atụgharị ndị mmadụ azụ. N’ezie, ọ dịrị ka o chepụtara ụdị ije ụkwụ, dị ka a ga-asị na ọ ga-amalite ịgba egwu jiri ụkwụ ya, dị ka ụgbọala ọbụla bịarutere nso na ihe mgbochi ahụ. Ọ bụrụ na otu onye na-anya ụgbọala nwee ntakasị ahụ banyere ihe mgbochi ama ahụ, onye uwe ojii eyighị ka ọ ga-enye aka ma ọ bụ ruo uju. O fufere isi ya nnọọ ugboro ugboro ma tụọ aka n’ụzọ nke ọzọ.

Ndị enyi m, ndị na-eso ụzọ otu m nọ n’okporo ama nke ndụ pụrụ ịnwụ anwụ, ọmarịcha atụmatụ nke Nna anyị, ọbụna atụmatụ Ya “magburu onwe ya”,1 ka emewere ịkpọlata unu ụlọ, abụghị ịchụpụ gị.2 Ọdịbeghị onye wuru ihe mgbochi ụzọ ma debe mmadụ ebe ahụ ịtụgharị gị azụ ma chụpụ gị. N’ezie, ọ bụ nke ọzọ ya kpọmkwem. Chineke nọ na-achụso gị akwụsịghị akwụsị. Ọ “chọrọ ụmụ Ya niile ịhọrọ ịlaghachiri Ya,”3 ma Ọ na-etinye n’ọrụ omume niile kwere omume iji kpọtaghachi gị.

Nna anyị dị ịhụnaanya hụrụ maka okike ụwa nke a maka nzube kpọmkwem nke iwete ohere maka gị na maka mụ inwe nhụmiihe niile nke ndụ pụrụ ịnwụ anwụ ndị na-adọtị adọtị na ndị na-anụcha, ohere iji ezi ohere nhọrọ nke Chineke nyere anyị iji họrọ Ya,4 iji mụọ ihe, iji tolite, iji mee njehie, iji chegharịa, iji hụ Chineke na agbata obi anyị naanya, na otu ụbọchị laghachi ebe obibi nye Ya.

O zitere Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya dị oke ọnụ ahịa na ụwa nke a dara ada ibi oke zuru ezu nke nhụmiihe nke mmadụ, iji wete ọmụmaatụ maka ụmụ Ya ndị fọdụrụ iji soro, na iji gbaa aja mgbaghara mmehie ma gbapụta. Nnukwu onyinye aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na-ewepụ ihe mgbochi ụzọ niile nke ọnwụ anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ga-ekewapụ anyị site n’ebe obibi ebighị ebi anyị.

Ihe niile gbasara atụmatụ nke Nna maka ụmụ Ya ndị Ọ hụrụ naanya ka emewere iji kpọtaghachi onye niile ebe obibi.

Kedụ ihe ndị na-ejere Chineke ozi, ndị amụma Ya, na-akpọ atụmatụ nke a niime akwụkwọ nsọ Mweghachite? Ha na-akpọ ya atụmatụ nke mgbapụta,5 atụmatụ nke ebere,6 nnukwu atụmatụ nke obi ụtọ,7 na atụmatụ nke nzọpụta nke enyere onye niile, site na ọbara nke Onye A Mụrụ Naanị Ya nke m.”8

Ebumnoobi nke nnukwu atụmatụ nke obi ụtọ nke Nna bụ obi ụtọ gị, n’ebe a nnọọ, ugbua nnọọ, ma niime mgbe ebighị ebi niile. Ọ bụghị iji gbochie obi ụtọ gị ma mee gị ichegbu ma tụọ egwu.

Ebumnoobi atụmatụ nke mgbapụta nke Nna bụ n’ezie mgbapụta gị, ịnapụta gị site na ntaram ahụhụ niile na ọnwụ nke Jizọs Kraịst,9 nweere onwe site na ndọkpụ nke mmehie na ọnwụ. Ọ bụghị ịhapụ gị dị ka ị dị.

Ebumnoobi nke atụmatụ nke ebere nke Nna bụ isetịpụ ebere dị ka ị na-alaghachi azụ na Ya ma kwanyere ọgbụgba ndụ gị nke ikwesị ntụkwasị obi nye Ya ugwu. Ọ bụghị ịgọnarị ebere ma tinye mgbu na iru uju.

Ebumnoobi atụmatụ nke nzọpụta nke Nna bụ n’ezie nzọpụta gị niime alaeze ebube nke seletịal dị ka anyị na-anata ịgba “ama nke Jizọs”10 ma were mkpụrụ obi gị niile nye Ya.11 Ọ bụghị idebe gị n’ezi.

Ọ bụ na nke a pụtara na ihe ọbụla ga-aga gbasara otu anyị si ebi ndụ anyị. Na ụzọ nke anyị họọrọ iji jiri ohere nhọrọ anyị enweghị ihe ọ gbasara? Na anyị nwere ike iwere ma ọ bụ ịhapụ iwu nsọ niile nke Chineke? Mba, n’ezie ọbụghị. N’ezie otu niime ọkpụkpọ oku niile na arịrịọ niile nke Jizọs kachasị digide n’oge ozi ndụ anụ ahụ Ya bụ na anyị na-agbanwe ma chegharịa ma bịakwute Ya.12 Ihe gbara ọkpụrụkpụ niime nkuzi Ya niile iji bie ndụ omume ọma n’elu ọkwa kacha elu13 bụ oku nye ọganiihu nke onwe, ruo okwukwe niime Kraịst pụrụ ịgbanwe, ruo nnukwu mgbanwe nke obi.14

Chineke chọrọ ka anyị mee nnukwu mgbanwe echiche ndị ahụ na-eche maka naanị ọdịmma nke onwe na nke nwere mpako, nchụpụ nke mmadụ eke,15 maka anyị “ịga, ma ghara ime njọ ọzọ.”16

Ọ bụrụ na anyị kwere na ebumnoobi atụmatụ gazuru ihe niile nke Nna bụ ịzọpụta anyị, gbapụta anyị, setịpụrụ anyị ebere, ma site otu ahụ wetere anyị obi ụtọ, gịnị bụ ebumnnobi nke Ọkpara onye site n’aka ya ka nnukwu atụmatụ nke a si pụta?

Ọkpara Ahụ na-ekwu maka Onwe Ya: “Niihi na agbadatara m site n’eluigwe, ọbụghị ime uche nke mụ onwe m, kama uche nke onye ahụ zitere m.”17

Uche nke Jizọs bụ uche nke Nna dị ebere! Ọ chọrọ ime ka o kwe omume nye onye ọbụla kpọmkwem nke ụmụ nke Nna Ya ịnata nzube ngwụcha nke atụmatụ ahụ—ndụ ebighị ebi ha na Ha. Ọdịghị onye agụpụrụ site n’ike mmepụta nke a sinachi.

Ọ bụrụ na ọdịghị ara gị ahụ ichegbu na ị gaghị enwe ike eru atụ, ma ọ bụ na nrute ịhụnaanya nke Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na-adịghị agwụ agwụ na-ekpuchite nobi ebere onye niile ọ bụ, mgbe ahụ ị ghọtaghiere. Adịghị agwụ agwụ pụtara adịghị agwụ agwụ Adịghị agwụ agwụ na-ekpuchite gị na ndị ahụ ị hụrụ naanya.18

Nifaị na-akọwa ọmarịcha eziokwu nke a: “Ọ naghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ ga-abara ụwa uru; n’ihi na ọ hụrụ ụwa naanya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ nke onwe ya ka o wee kpọta ụmụ mmadụ niile n’ebe ọ nọ. Ya mere, onweghị onye ọbụla o nyere iwu ka ha ghara iketa oke na nzọpụta ya.”19

Onye Nzọpụta, Onye Ọzụzụ atụrụ Ọma, na-aga na achọ atụrụ Ya furu efu tutu ruo Ya achọta ha.20 Ọ “dịghị njikere na nke ọbụla ga-ala n’iyi.”21

“Ogweaka nke ebere m e setịpụworo nye unu, ma onye ọbụla ọ bụ ga-abịa, ya ka m ga-anabata.”22

“Unu nwere ndị na-arịa ọrịa n’etiti unu? Kpọtanụ ha. Unu nwere ndị dara ngwọrọ, ma ọ bụ kpuru isi, ma ọ bụ ndị na anaghị aga ije, ma ọ bụ ndị merụrụ ahụ, ma ọ bụ ndị ekpenta, ma ọ bụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ma ọ bụ ndị ntị chiri, ma ọ bụ ndị nwere nsogbu n’ụdị ọbụla? Kpọtanụ ha ebe a ma aga m agwọ ha, niihi na enwere m ọmịiko n’ebe unu nọ.”23

Ọ chụpụghị nwanyị nwere ururo ọbara, Ọ laghachighị azụ site na onye ekpenta; Ọ chụpụghị nwanyị ejidere n’ịkwa iko, Ọ jụghị onye chegharịrị—na-agbanyeghị njọ ha. Ma Ọ gaghị ajụ gị ma ọ bụ ndị ahụ ị hụrụ naanya mgbe ị weteere Ya obi gị tiwara etiwa na mmụọ gị dị nchegharị. Nke ahụ abụghị ebumnoobi Ya ma ọ bụ mmewe Ya, ọ bụghị ma atụmatụ Ya, nzube, ọchịchọ, ma ọ bụ olileanya Ya.

Mba, Ọ naghị etinye mgbochi ụzọ na ụmụ ihe mgbochi; Ọ na-ewepụ ha. Ọ naghị edebe gị n’ezi; Ọ na-akpọbata gị niime.24 Ije ozi Ya dum bụ nkwuputa dị ndụ nke ebumnoobi nke a.

Mgbe ahụ n’ezie e nwere aja mgbaghara mmehie Ya n’onwe ya, nke na-ara anyị ahụ ịghọta karịa, gafee ike nke anụ ahụ anyị ịghọta. Mana, ma “mana,” nke a dị mkpa, anyị ghọtara, pụrụ ịghọta, ebumnoobi nzọpụta nke aja mgbaghara mmehie Ya, dị nsọ.

Akwa mgbochi nke tempụl ka adọwara ụzọ abụọ mgbe Jizọs nwụrụ n’elu obe, na-egosi ihe atụ na ụzọ ịlaghachi niihu nke Nna ka a dọwara obosara ighe oghe—nye ndị niile ga-atụgharị nye Ya, tụkwasị obi na Ya, tụkwasị ibu arọ ha na Ya, ma wekwasị onwe ha yok na njikọ ọgbụgba ndụ.25

N’aka nke ọzọ, atụmatụ nke Nna abụghị banyere ihe mgbochi ụzọ. Ọdịghị mgbe ọ bụ; o nweghị ike ịbụ. Enwere ihe ndị anyị kwesịrị ime, iwu nsọ ndị aga edebe, akụkụ eke anyị ndị aga agbanwe? Ee. Mana jiri amara Ya, ndị ahụ nọ na nrute aka anyị, na-abụghị ndị aka anyị eruteghi.

Nke a bụ ozi dị mma! Obi juru m n’ekele nke m na-enweghị ike ikwu ekwu maka eziokwu ndị a dị mfe. Mmewe nke Nna, atụmatụ Ya, ebumnoobi Ya, ọchịchọ Ya, na olileanya Ya niile bụ iji gwọọ gị, ha niile iji nye gị udo, ha niile iji kpọta gị na ndị ị hụrụ naanya, n’ebe obibi. Nke a ka m na-agba aka ebe ya n’aha Jizọs Kraịst, Ọkpara Ya, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Chee Seleshịal!,” Liahona, Nov. 2023, 117, 118.

  2. Lee 2 Nifaị 26:25, 27.

  3. Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 1.1, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  4. Lee Moses 7:33.

  5. Lee Jekọb 6:8; Alma 12:30.

  6. Lee Alma 42:15.

  7. Lee Alma 42:8, 16.

  8. Mozis 6:62.

  9. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:4.

  10. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:50–70.

  11. Lee Omni 1:26.

  12. Lee Matiu 4:17.

  13. Lee Matiu 5-7. N’ịmaatụ, niime Matiu 5:43-44, Onye Nzọpụta kuziiri ndị na-eso ụzọ Ya na o zughị oke “ịhụ onye agbata obi gị naanya, ma kpọọ onye iro gị asị.” Isoro Ya, ha kwesịkwara “ịhụ ndị iro [ha] naanya.”

  14. Lee Mozaya 5:2. Iji nwee ike maka ebere nke Jizọs Kraịst inwe ike rụọ ọrụ niime ndụ anyị, anyị ahaghị ịtụgharị nye Ya. Alma Nta na-akuzi na “atụmatụ mgbapụta nke a dị ebube ka a na-enweghị ike eweta na mmezu, naanị n’ọnọdụ niile nke nchegharị niihi ewezuga maka ọnọdụ ndị a, ebere enweghị ike adị ire” (Alma 42:13).

  15. Lee Mozaya 3:19.

  16. Jọn 8:11.

  17. Jọn 6:38.

  18. Lee Russell M. Nelson, “Aja mgbaghara mmehie,” Ensign, Nov. 1996, 35: “Aja mgbaghara mmehie Ya adịghị agwụ agwụ—enweghị nsọtụ. Ọ bụkwa adịghị agwụ agwụ bụ na ụmụ mmadụ niile ka aga azọpụta site n’ọnwụ na-enweghị nsọtụ. Ọ bụ adịghị agwụ agwụ n’ihe gbasara nnukwu ntaram ahụhụ Ya. Ọ bụ adịghị agwụ agwụ ugbu a, na-akwụsị ụdị aja anụmanụ ya a naara eme. Ọ bụ adịghị agwụ agwụ n’oke—emere ya otu mgbe. Ma ebere nke Aja mgbaghara mmehie setipụrụ ọbụghị naanị nye ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ na-enweghị ngụta, mana nyekwa ọnụọgụgụ nke ụwa na-enweghị ngụta ekere n’aka Ya. Ọ bụ adịghị agwụ agwụ karịa atụ mmadụ ọbụla ma ọ bụ nghọta anụ ahụ.”

  19. 2 Nifaị 26:24.

  20. Lee Luk 15:4.

  21. 2 Pita 3:9; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:11–12.

  22. 3 Nifaị 9:14

  23. 3 Nefi 17:7; lee kwa amaokwu 6.

  24. Niime nkuzi niile nke Jizọs Kraịst na-egosi na ụfọdụ ndị mmadụ agaghị erite alaeze nke eluigwe, O mere ka o doo anya na ndapụta nke a abụghị ọchịchọ Ya maka ha mana ọ bụ resọọtụ nke nhọrọ nke onwe ha niile (lee Matiu 7:13-14, 21-25).

  25. Lee Matiu 27:50–51; Ndị Hibru 9:6–12.