Ọgbakọ Zuru ọha
Ozizi nke Kraịst nke Dị ike, nke Ezi omume ya enweghi Ọgwụgwụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ozizi nke Kraịst nke Dị ike, nke Ezi omume ya enweghi Ọgwụgwụ

A na m akpoku unu ibi ozizi nke Kraịst mgbe na mgbe, ugboro ugboro ma kpachaara anya ma nyere ndị ọzọ aka na njem ha.

Ọtụtụ afọ gara aga, nwunye m, Ruth; na nwa anyị nke nwanyị, Ashley, na Mụ sonyere ndị njem nlere anya nime ụgbọ mmiri kayak n’ebe steeti nke Hawaii nime United States. Kayak bụ ụgbọ mmiri dị ezigbo ala na mmiri nke onye na-akwọ ya na anọdụ ala chewe ihu ya ihu ma jiri nkwọ ụgbọ ihu-abụọ na-adọ ya ihu na azụ n’otu akụkụ ma emesịa na adọ na akụkụ nke ọzọ. Atụmatụ enwere bụ ịkwọ ruo na ntakịrị agwaetiti gafere ikpere mmiri nke Oahu ma laghachi ọzọ. Obi siri m ike niihi na, dị ka nwa okorobịa, akwọwo m ọtụtụ kayak gafee ọdọmmiri niile nke ugwu. Nganga adịghịkwanụ mma, akwa ya?

Onye ndu anyị nyere anyị ntụziaka ma gosi anyị kayak nke oke osimiri nke anyị ga-eji. Ha dị iche na nke ndị ahụ nke m kwọworo na mbụ. Ekwesịrị m ị nọdụ ọdụ n’ebe isi nke kayak ahụ, kama ị nọdụ ọdụ n’etiti ya. Mgbe m bara nime kayak ahụ, etiti ike ndọda m dị elu karịa otu m maburu, ma akwụghị chim n’elu mmiri ahụ.

Mgbe anyị malitere, a kwọrọ m ọsịsọ karịa Ruth na Ashley. Mgbe nwantịtị oge gafere, a nọ m ha niihu ọfụma ọfụma. Agbanyeghi nganga m nihi ebe m ruworo, a kwụsịrị m ịkwọ ma chere ha ka ha chụkwute m. Nnukwu ebili mmiri—nke ruru dị ka sentimiter 131—kụrụ n’akụkụ kayak m ma tụba m nime mmiri ahụ. Mgbe oge ruru m tụgharịrị kayak ahụ ma gba mbọ ị banye n’elu ya, Ruth na Ashley a gafewo m, mana ezigbo ume apụwo m n’ahụ ị bidoghachi ịkwọ ụgbọ. Tupu m na-ekute ume, ebili mmiri ọzọ, nke a n’ezie dị nnukwu—opekampe sentimita 202—a kụọ kayak m ma tụbakwa m nime ọzọ. Mgbe oge m gbalịrị i dozigharị kayak ahụ, ezigbo ume apụwo m n’ahụ nke mere egwu jiri tụọ m na a gaghị m enwe ike irigonwu n’elu ọzọ.

Mgbe ọ hụrụ ọnọdụ m, onye ndu kwọruru ebe m nọ ma jide kayak m, nke mere o jiri dịrị m mfe irigo n’elu ya. Mgbe ọ hụrụ na-enweghizim ume ịkwọ n’aka m, o kere ụdọ na kayak nke m ma bido ịkwọ, wee dọrọ m na-aga n’azụ ya. Oteghi aka m nwetere ume m ma bido ịkwọ n’aka m. Ọ hapụrụ ụdọ ahụ, ma eruru m agwaetiti nke mbụ ahụ na-enweteghi enyemaka ọzọ. Mgbe m ruru, a dara m n’elu aja, ike agwuwo.

Mgbe otù ahụ zuchaworo ike, onye ndu ahụ jiri wayọ gwa m, “Mazi Renlund, ọ bụrụ na ị gaa niihu na-akwọ ụgbọ, na-ejigide ike na-abịa abịa gị, E chere m na ị ga adị mma.” E soro m ndụmọdụ ya dị ka anyị kwọọrọ ruo na agwaetiti nke abụọ ma emesịa laghachi n’ebe anyị bidoro na mbụ. Ugboro abụọ, onye ndu ahụ kworuru m nso ma gwa m na m na-eme ọfụma. Nagbanyeghi ebili mmiri karịrị akarị tiri m ihe n’akụkụ kayak m, mana atụbaghị m na mmiri.

Site na ị nọgide na-akwọ ụgbọ, ejigidere m ike na-abịa abịa ma gaa niihu, na-emegide ebili mmiri ndịa ahụ na-eti m ihe n’akụkụ. Otu ụdị ụkpụrụ nke a ka anyị nwekwara ike itinye nime ndụ nke ime mmụọ anyị. Anyị na-etinye onwe anyị niime ọnọdụ ihe egwu mgbe anyị jiri nwayọọ nwayọọ na karịsịa mgbe anyị kwụsiiworo kpam kpam.3 Ọ bụrụ n’anyị jigide ike na-abịa abịa site na-ịga niihu “na-akwọ” ruo ebe Onye Nzọpụta nọ, anyị ga-enwe ezi nchekwa karịa nihi na ndụ ebighị ebi anyị dabere n’elu okwukwe anyị nwere na Ya.4

Ike na-abịa abịa nke ime mmụọ ka a na-arọpụta “n’ogologo ndụ anyị dị ka anyị na-anabata ozizi nke Kraịst ugboro ugboro.”5 Site na-ime otu a, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, ga-arọpụta “ezi omume dị ike na-enweghi ọgwụgwụ.”6 N’ezie, mmewere niile nke ozizi nke Kraịst—nke dị ka okwukwe niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nchegharị, ịbanye na njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Onyenwe anyị site na baptizim, ị nata onyinye nke Mmụọ Nsọ ma ịnagide ruo ọgwụgwụ oge7—abụghị nke echere ibụ nhụmihe nke otu oge, nke a ga akanye na emewo ya. Nke ka nke, “ịnagide ruo ọgwụgwụ oge” abụghị nnọọ nzọpụ ụkwụ dị iche nime ozizi nke Kraịst—nke ga-adị ka aga asị na mgbe emezuru otu nime mmewere anọ ahụ ma atọgbọrọzie n’ala, kechie eze anyị ma chewe mgbe a ga-anwụ. Mba, ịnagide ruo ọgwụgwụ oge bụ itinye mgbe na mgbe na ugboro ugboro mmewere ndị ọzọ nke ozizi nke Kraịst na ndụ anyị, wee na “arọpụta ezi omume dị ike na-enweghi ọgwụgwụ” nke Onyeisi Nelson kọwara.8

Mgbe na mgbe pụtara na anyị ga-enwe nhụmihe niile nke mmewere niile nke ozizi nke Kraịst ọzọ ma ọzọ ruo ogologo ndụ anyị. Ugboro ugboro pụtara na anyị ga-ewulite n’elu na melite ihe nihi nke ọbụla emegharịrị. Nagbanyeghi na anyị na emegharị mmewere niile ahụ, anyị anọghị na-agbagharị gburugburu nime okirikiri na-agaghị ihu. Kama, anyị na-abịaru Jizọs Kraịst nso n’oge ọbụla site na okirikiri ahụ.

Ike na-abịa abịa gụnyere ọsịsọ na ụzọ a na-aga.9 Ọ bụrụ na m jiri ike ike kwọọ kayak ahụ jewe ụzọ na-ezighi ezi, enwere m ike ịrọpụta ike na-abịa abịa dị ukwuu, mana a garaghị m erute ebe ahụ m bu n’obi. N’otu aka ahụ, na ndụ a, anyị kwesịrị “ịkwọ” jewe ebe Onye Nzọpụta nọ iji bịakwutenụ Ya.10

Okwukwe na Jizọs Kraịst kwesịrị ka a na-azụ ya kwa ụbọchị.11 A na-azụ ya dị ka anyị na-ekpe ekpere, na-amụ akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, na-atule uche banyere ịdịmma nke Chineke kwa ụbọchị, na-echegharị kwa ụbọchị, ma na-esoro mkpali niile nke Mmụọ Nsọ kwa ụbọchị. Dị ka otu osi ọdịghị mma maka ahụike, ị hapụ iri nri anyị niile tutu ruo na Sọnde ma ribiga oke n’otu ụbọchị ihe oriri na-edozi ahụ nke ekenyere kwa izu, ọ dịghịkwa mma maka ahụike nke ime mmụọ ịdebe akparamagwa nke na-azụlite ịgba ama anyị maka naanị otu ụbọchị na otu izu.12

Mgbe anyị nabatara oke n’ọrụ maka iwulite ịgba ama anyị,13 anyị na-erite ike na-abịa abịa nke ime mmụọ ma jiri nnọ nwayọọ wulie okwukwe siri ike nime Jizọs Kraịst ma mgbe ahụ ozizi nke Kraịst abụrụzie nhibe isi nke ebumnobi ndụ.14 N’otu aka ahụ ike na-abịa abịa na-abawanye dị ka anyị na-agbalisị ike irube isi nye iwu niile nke Chineke ma chegharịa. Nchegharị dị aṅụrị ma na-ekwe ka anyị mụta ihe site na njehie anyị, nke bụ otu anyị si aga niihu ebighị ebi. Na-esighi agụgọ, a ga enwe ọtụtụ oge mgbe a ga atụpụ anyị site na kayak anyị ma anyị ahụ onwe anyị n’ala ala mmiri. Site na nchegharị, anyị nwere ike ịlaghachi n’elu ma gaa niihu, nagbanyeghi ọtụtụ mgbe anyị dapụrụ adapụ.15 Nke kachasị mkpa bụ na anyị ekwesịghị ịda mba.

Mmewere ozizi nke Kraịst nke na-esote bụ baptizim, nke gụnyere baptizim nke mmiri ma, site na nnabata, baptizim nke Mmụọ Nsọ.16 Nagbanyeghi na baptizim bụ otu ihe omume nọọrọ onwe ya, anyị na-emegharị ọgbụgba ndụ anyị nke baptizim ahụ ọhụrụ mgbe na mgbe n’oge anyị na-eri oriri nsọ. Oriri nsọ ahụ anaghị anọchị anya baptizim, kama ọ na ejikọ mmewere ndị isi mbụ ahụ dị nime ozizi nke Kraịst—okwukwe na nchegharị—ha na nnabata nke Mmụọ Nsọ.17 Dị ka anyị kpachara anya na-eri oriri nsọ ahụ,18 anyị na-akpoku Mmụọ Nsọ ahụ nime ndụ anyị, dị ka oge ahụ emere anyị bapizim ma nabata anyị.19 Dị ka anyị na-edebe ọgbụgba ndụ ahụ akọwara nime ekpere oriri nsọ, Mmụọ Nsọ ahụ ga-abụ onye nsiso anyị.

Dị ka Mmụọ Nsọ ahụ na-abụ nnukwu ike mmetụta nime ndụ anyị, anyị na-aga niihu ma ugboro ugboro na-ewulite agwa niile yiri Kraịst. Obi anyị agbanwee. Ọnwụnwa maka ị mee ịhe ọjọọ ebelata. Ọchịchọ anyị ịme ihe ọma abawanye tutu ruo mgbe nanị ihe anyị chọrọ bụ “i mee ihe ọma esepụghị aka.”20 Ma site otu ahụ nata ike si n’igwe nke dị mkpa maka ị nagide ruo ọgwụgwụ.21 Okwukwe anyị abawanyewo, ma anyị adịwo njikere imegharị ezi omume ahụ dị ike na-enweghi ọgwụgwụ ọzọ.

Ike na-abịa abịa nke na-aga niihu na-akwabakwa anyị ị mee ọgbụgba ndụ ndị ọzọ anyị na Chineke niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọtụtụ ọgbụgba ndụ na-adọta anyị nso n’ebe Kraịst nọ ma na-ejikọ anyị na ya n’ọnọdụ sikwuru ike. Site na ọgbụgba ndụ ndị a, anyị nwekwuru ohere nke ike ebighị ebi Ya. Ka o doo anya, ọgbụgba ndụ niile nke baptizim na nke tempụl abụghị, nime ma n’onwe ha, isi iyi nke ike. Isi iyi nke ike bụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe. Ịme ma ịdobe ọgbụgba ndụ niile na-arọpụta otu ụzọ ike Ha si abata nime ndụ anyị niile. Dị ka anyị na-ebi n’usoro ọgbụgba ndụ ndị a, anyị na-emesịa bụrụ ndị nketa nke ihe niile nke Nna nke Eluigwe nwere.22 Ike na-abịa abịa nke a na-arọpụta site na-ibi ozizi nke Kraịst anaghị enye ike nanị maka mgbanwe nke ọdịdị anyị si n’igwe ruo na akaraka ebighi ebi anyị kama nakwa akpali anyị ịnyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ndị ziri ezi.

Cheegodi maka otu onye ndu njem ahụ si nyere m aka mgbe m tụgharịrị nime kayak ahụ. Ọ tighi mkpu site n’ebe dị anya iji jụọ ajụjụ n’adịghị enye aka nke dị ka, “Mazị Renlund, kedụ ihe i na-eme niime mmiri ahụ?” Ọ kwọghị ụgbọ ya ruo ebe m nọ ma baara m mba na-asị, “Mazị Renlund, ị garaaghị anọ na ọnọdụ a ma ọ bụrụ na ị nwere ahụ ike kwụrụ chim.” O bidoghi ịdọ kayak m mgbe ahụ m kana agba mbọ irigote n’elu ya. Ma ọ gbazighi m olu niihu ọha ndị ahụ. Kama, ọ nyere m aka ahụ nke m chọrọ n’oge ahụ m chọrọ ya. Ọ nyere m ndụmọdụ mgbe ahụ m di njikere ị ṅaa ntị. Ma ọ wee jiri nnọ obi ya ịgba m ume

Dị ka anyị na-elekọta ndị ọzọ, anyị ekwesịghị ịjụ ajụjụ ndị enyemaka adịghị niime ma ọ bụ kwuo nnọọ ihe onye ọbụla maara. Ọtụtụ mmadụ ndị na-agba mbọ maara nnọọ na ha na-agba mbọ. Anyị ekwesịghị ịma ikpe; ịma ikpe anyị anaghị enye aka ma ọ bụkwanụ ma anabatara ya ma ọtụtụ mgbe ọ na-enwekarị echiche na-ezighi ezi.

Ịtụnyere onwe anyị nye ndị ọzọ nwere ike iduba anyị ime mperi ndị dị njọ, tụmadị ma ọ bụrụ ma anyị kpebie na anyị kacha nwe ezi omume karịa ndị ahụ na-agba mbọ. Ntụnyere dị otu ahụ dị ka mmiri iri mmadụ niime mmiri omimi ya dị23 mita atọ, ma ị na-ahụ dị ka mmiri omimi ya dị mita anọ si24 na-eri onye ọzọ, wee na-ama ya ikpe na ọ bụ onye kacha eme njọ, ma na-enwe obi ụtọ maka onwe gị. A sị ka e kwuwe, anyị niile na-adọga n’ụzọ nke anyị. Enweghị onye n’ime anyị ga-erite nzọpụta site n’ike anyị.25 Anyị agaghị enwe ike ma ọlị. Jekọb, niime Akwụkwọ nke Mọmọn kuziri, “Ma cheta, mgbe [anyị] meworo udo [anyị] na Chineke, na ọ bụ naanị n’ime na site n’amara nke Chineke ka a ga azọpụta [anyị].”26 Anyị niile chọrọ aja mgbaghara mmehie agwụghị agwụ nke Onye Nzọpụta, nabụghị nnọọ otu akụkụ ya.

Anyị niile nnọọ chọrọ omiiko anyị, obi ebere, na ịhụnaanya dị ka anyị na-akparịta anyị na ndị ahụ gbara anyị gburu gburu.27 Ndị ahụ niile na-agba mbọ “kwesịrị inweta nhụmiihe ịhụnaanya Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ egosịpụtara n’okwu na ihe omume [anyị] niile.”28 Dị ka anyị na-eje ozi nlekọta, anyị na-agba ndị ọzọ ume mgbe na mgbe ma na-enye aka. Ma ọ bụrụgodi na onye ahụ aṅaghị anyị ntị, anyị ga a ga niihu na-eje ozi nlekọta dị ka ha kwere anyị. Onye Nzọpụta kuziri na “n’ihi na nye ụdị ahụ ka unu ga-aga n’iru na-ekwusa ozi-ọma; n’ihi na unu amataghị ma ha ga-alaghachị ma chegharịa, ma jiri nzube juru-eju nke obi bịakwute m, ma aga m agwọ ha; ma unu ga-abụ ngwa-ọrụ nke iwetara ha nzọpụta.”29 Ọrụ nke Onye Nzọpụta bụ ịgwọ ọrịa. Ọrụ anyị bụ ịhụ naanya—ịhụ naanya ma lekọta n’ụzọ nke ga eme ndị ọzọ abịakwute Jizọs Kraịst. Nke a sonyere nime mkpụrụ osisi niile nke ozizi nke Kraịst nke dị ike, nke ezi omume ya enweghi ọgwụgwụ.

A na m akpoku unu ibi ozizi nke Kraịst mgbe na mgbe, ugboro ugboro ma kpachaara anya ma nyere ndị ọzọ aka na njem ha. A na m agba ama na ozizi nke Kraịst nọ n’etiti atụmatụ Nna nke Eluigwe; ọ bụ n’ezie, ozizi Ya. Dị ka anyị na-egosi okwukwe anyi nime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, a na-akwaba anyị n’okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ ma kpalie anyị ị nyere ndị ọzọ aka bụrụ ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs Kraịst. Anyị nwere ike ịbụrụ ndị nketa nke alaeze nke Nna nke Eluigwe, nke bụ isi njedebe iguzosi ike na-ibi ozizi nke Kraịst. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen