Ọgbakọ Zuru ọha
Ọgbụgba ndụ niile na Oke na ọrụ niile
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ọgbụgba ndụ niile na Oke na ọrụ niile

Nzukọ Ahụ nsọ nke Jizọs Kraịst ka amaara dị ka otu nzukọ nsọ nke na-ekwusi ike ime ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke.

Olee otu Nzukọ nsọ gị ji pụọ iche site na ndị ọzọ? Azịza m nye ajụjụ a dị mkpa agbanwewo dị ka m tozuworo oke ma dị ka Nzukọ nsọ na-etowo. Mgbe a mụrụ m na Utah na 1932, ndị bụ ndị otu Nzukọ nsọ anyị bụ naanị ihe dị ka 700,000, ghasasịrị kachasị na Utah na steetị ndị nọ nso. N’oge ahụ, anyị nwere naanị tempụl 7. Taa ndị bụ ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a dị n’ọnụ ọgụgụ ihe karịrị nde 17 niihe ruru ka mba ndị dị 170, ọtụtụ ndị kachasị bi n’ofe United States. Ruo taa bụ Eprel 1st anyị nwere temple dị 189 edoworo nsọ niime ọtụtụ mba na 146 ndị ọzọ nọ nogo dị iche iche nke ịtụ atụmatu na owuwu. O metụwo m ikwu okwu gbasara ebumnoobi nke tempụl ndị a na agụgụala ahụ na oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile dị niime ofufe anyị.Notu ọgbakọ zuru ọha nwere ọtụtụ nkuzi dị mma gbasara ọgbụgba ndụ niile, o metụwo m ikwu gbasara ebumnoobi nke tempụl ndị a na agụgụala na oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile nọ na ofufe anyị. Nke ga-enyere nkuzi niile nke ndị buru ụzọ kwuo okwu aka.

I.

Ọgbụgba ndụ bụ ime mkpebi imejuputa oke na ọrụ ndị ama ama. Mkpebi niile dị oke mkpa na ime nhazi nke ndụ onye ọbụla niime anyị na omume nke ọha na eze mgbe niile. Echiche nke a bụ ihe a na-eche aka mgba ugbu a. Ndị dị nta n’ọnụ ọgụgụ na-ekwu nke a na-anụ megidere ndị ji ikikere na-ekwu ihe na-eme n’obodo ma na-esi ọnwụ na ndị mmadụ kwesịrị inwere onwe ha site na mgbochi ọbụla nke na-ebelata mnwere onwe nke onye ọbụla niime ha. Otu ọ dị anyị maara site n’otu puku afọ nhụmiihe na ndị dị iche iche na-esere aka n’ụfọdụ mnwere onwe nke onwe onye iji rite uru nke ibi n’obodo a haziri ahazi. Ụdịrị nhapụ nke mnwere onwe nke onye ọbụla bụ nke dabere kpọm kwem n’elu mkpebi ma ọ bụ ọgbụgba ndụ niile, ekwupụtara ma ọ bụ a tụnyere uche na ya.

Foto, oyiyi
Ndị ọrụ Ndị Agha.
Foto, oyiyi
Ndị ọrụ ahụ ike.
Foto, oyiyi
Ndị ọrụ mbịanyụ ọkụ ọgbụgba.
Foto, oyiyi
Ndị na-eje ozi mgbasa ozi ọma n’uju.

Ndị a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ banyere oke na ọrụ niile ọgbụgba ndụ niile n’ogige anyị: (1) ndị ikpe, (2) ndị agha, (3) ndị ọrụ ahụike, na ndị ọrụ na-abịanyụ ọkụ ọgbụgba. Ndị niile ahụ so na ọrụ ndị a a maara amara na-eme mkpebi—ọtụtụ mgbe a na-ewebata n’okpuru iwu site na ịńụ iyi ma ọ bụ ịgba ndụ—ịrụ ọrụ ndị ekenyere ha. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu banyere ndị mgbasa ozi ọma uju oge. Uwe ha pụrụ iche ma ọ bụ tag ndị bu aha ka ebu n’obi igosị na onye yi ya nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ ma ya mere nwere ọrụ ikuzi ihe na ije ozi. Ebumnobi yiri nke a bụ ichetara ndị yi ya banyere oke na ọrụ ha. Enweghị “anwansị” ọbụla n’uwe ma ọ bụ ọdịmara ha pụrụ iche, naanị ihe ncheta ma ọ bụ enyem aka a chọrọ banyere oke na ọrụ ndị pụrụ iche ndị yi ya na-ewerewo. Nke a bụkwa eziokwu banyere ọdịmara nke ịgbanye ọla na ọla nke agbam akwụkwọ niile na oke na ọrụ ha na-ịma ọkwa nye ndị na-ele ya ma ọ bụ na-echetara ndị yi ya banyere oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile.

Foto, oyiyi
Ọla agbam akwụkwọ niile.

II.

Ihe m kwuworo banyere ọgbụgba ndụ ịbụ ntọala maka nhazi nke ndụ mmadụ ọbụla na maka ọha ịrụ ọrụ gbasara nke ka nke ọgbụgba ndụ niile nke okpukperechi. Ntọala na agụgụala nke ọtụtụ okpukperechi ndị eso na ya na ihe ndị a chọrọ dabeere na ọgbụgba ndụ niile. N’ịmaatụ, ọgbụgba ndụ nke Abraham bụ isi ntọala nye ọtụtụ nnukwu omenaala okpukperechi. Ọ na-edubata echiche dị ukwuu banyere nkwa ọgbụgba ndụ niile nke Chineke nebe ụmụ Ya nọ. Agba Ochie mgbe na mgbe na-arụtụ aka na ọgbụgba ndụ dị na etiti Chineke na Abraham na mkpụrụ ya.1

Akụkụ nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, nke edere n’oge Agba Ochie, gosịpụtara n’ụzọ doro anya oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niime agụgụala na ofufe niime Israel. Onye mmụọ ozi gwara Nefi na odide niile nke ndị Israel banyere oge ahụ bụ “ndekọihe nke ndị Juu, nke nwere niime ya ọgbụgba ndụ niile nke Onyenwe anyị, nke o meworo nye ụlọ nke Israel.”2 Akwụkwọ nke Nefi rụtụrụ aka ugboro ugboro nye ọgbụgba ndụ nke Abraham3 ma nye Israel dị ka “ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.”4 Omume nke ịgba ndụ anyị na Chineke ma ọ bụ ndị ndu nke otu okpukperechi ka ededatara kwa niime ederede niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn gbasara Nefi, Josef nọ na Ijipt, Eze Benjamin, Alma, na Ọchị agha Moronaị.5

III.

Mgbe oge ruru maka mweghachite nke uju nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, Chineke kpọrọ otu onye amụma, Josef Smit. Anyị amaghị uju ọdịnaya nke nkuzi isimbụ niile nke onye mmụọ ozi Moronaị nye onye amụma nke a ka na-etozu etozu. Anyị maara na ọ gwara Josef na “Chineke nwere ọrụ maka [ya] ịrụ” ma na “ojuju nke Ozi ọma ebighị ebi” ahaghị ịpụta ihe, tinyere “nkwa niile e mere nye ndị nna nna ha ha.”6 Anyị makwa na akwụkwọ nsọ nke Josef nta gụsiri ike—ọbụna tupu enye ya ntuzi aka ịhazi otu nzukọ nsọ—so n’ọtụtụ nkuzi ndị gbasara ọgbụgba ndụ niile ọ naara atụgharị asụsụ ya niime Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ bụ ihe bara oke uru na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ isi nsipụta nke ojuju nke Mweghachite maka ojuju nke ozi ọma, gụnyere atụmatụ nke Chineke maka ụmụ Ya, ma o juputara na nrụaka niile enyere ọgbụgba ndụ niile.

Ebe ọ bụ onye gụrụ Baịbụlụ nke ọma, Josef garịrị ama ihe banyere akwụkwọ nke nrụtụaka ndị Hibru nye nzube nke Onye Nzọpụta “ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ya na ụlọ nke Israel na ya na ụlọ nke Judah.”7 Ọ nakwa arụtụ aka na Jizọs dị ka “onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”8 N’ụzọ dị mkpa, nkọwapụta nke baịbụlụ banyere ozi ndụ anụ ahụ nke Onye Nzọpụta nke a kpọrọ “Agba Ọhụrụ Ahụ“ myiri a na-ahụ anya maka “Ọgbụgba ndụ Ọhụrụ Ahụ.”

Ọgbụgba ndụ niile bụ isi ntọala na mweghachite nke ọzi ọma. Nke a pụtara ihe na nzọ ụkwụ ndị nke isimbụ Onyenwe anyị nyere Onye amụma ntuzi aka iwere na ịhazi Nzukọ nsọ Ya. Ozugbo ozugbo ebipụtara Akwụkwọ nke Mọmọn, Onyenwe anyị nyere ntuzi aka ihazi Nzukọ nsọ Ya eweghachitere mgbe na-adịghị anya a kpọrọ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.9 Mkpughe erekọdụrụ na Epril 1830 nyere ntuzi aka na-aga anabata ndị mmadụ na nzukọ nsọ ya site “na baptizim” mgbe ha “gbachara aka ebe” (nke pụtara ịgba aka ebe na nsọpụrụ) “na ha echegharịwo n’ezie site na mmehie ha niile, ma dị na njikere iwekwasị onwe ha aha nke Jizọs Kraịst, enwe mkpebi ijere ya ozi ruo ọgwụgwụ.”10

Otu mkpughe nke a kwa mgbe e mesịrị duziri Nzukọ nsọ ahụ “izukọta ọnụ ugboro ugboro iketa oke n’achịcha na mmanya [mmiri] na ncheta nke Onyenwe anyị Jizọs.” Ịdị mkpa emume nsọ nke a bụ nke a na-ahụta na mkpụrụokwu nke ọgbụgba ndụ ndị edepụtara maka okenye ma ọ bụ ụkọ chukwu na-eme emume nsọ. Ọ na-agọzi ihe nnọchi anya nke achịcha ahụ maka “mkpụrụ obi nke ndị niile ahụ ga-eri ya …, ka ha … gbaa aka ebe nye gị, O Chineke, Nna nke Ebighị ebi, na ha dị njikere iwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya mgbe niile ma dobe iwu nsọ ya niile nke O nyeworo ha.”11

Isi oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile dị niime Nzukọ nsọ ahụ eweghachitere ọhụrụ ka ekwugharịsịrị ike niime okwu mmalite Onyenwe anyị nyere maka mbipụta nke mbụ nke mkpughe Ya niile. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị mara ọkwa na Ọ kpọwo Josef Smit niihi na ndị bi n’ụwa “akpafuwo site na emume nsọ m niile, ma mebiwo ọgbụgba ndụ m dị ebighị ebi.”12 Mkpughe nke a gakwara niihu na-akọwa na iwu nsọ Ya niile ka enyere “ka e nwee ike hiwe ọgbụgba ndụ ebighị ebi m.”13

Taa anyị na-aghọta oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile dị niime Nzukọ nsọ ahụ eweghachitere na ofufe nke ndị otu ya. Onyeisi Gordon B. Hinckley nyere nchịkọta nke a banyere mpụtara nke baptizim anyị na iri oriri nsọ kwa izu ụka: “Onye otu ọbụla nke nzukọ nsọ nke a nke banyeworo na mmiri niile nke baptizim aghọwo onye so n’otu nke ọgbụgba ndụ dị nsọ. Oge ọbụla anyị riri oriri nsọ nke oriri anyasị nke Onyenwe anyị, anyị na-emegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ ahụ.”14

Echetaworo anyị site n’ọnụ ọtụtụ ndị kwuru okwu n’ọgbakọ nke a na Onyeisi Russell M. Nelson ugboro ugboro na-arụtụ aka na atụmatụ nke nzọpụta dị ka “okporo ụzọ ọgbụgba ndụ,” nke “na-edu anyị laghachikwuru [Chineke]” ma “ihe niile bụ gbasara mmekọrịta anyị na Chineke.”15 Ọ nakwa akuzi gbasara uru ọgbụgba ndụ bara na-emumetempụl anyị niile ma na-agba anyị ume ịhụta nsọtụ site na mmalite na “iche selestịal.”16

IV.

Ugbu a ana m ekwukarị maka ọgbụgba ndụ tempụl niile. Na imejuputa oke na ọrụ ya iweghachite ojuju nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, Onye amụma Josef Smit jiri ngwụcha afọ ya na-atụzi aka owuwu nke tempụl dị na Nauvoo, Illinois. Site n’aka ya Onyenwe anyị kpughere nkuzi niile, ozizi, na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ maka ndị ga-anọchi ọnọdụ ya na-ilekọta tempụl niile. Ebe ahụ ndị enyere onyinye dị nsọ ka a ga-akuziri atụmatụ nke Nzọpụta nke Chineke ma kpọkuo ime ọgbụgba ndụ niile dị nsọ. Ndị ahụ biri ndụ ikwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ndị ahụ ka e kwere nkwa ndụ ebighị ebi, ebe ahụ “ihe niile bụ nke ha” ma ha “ga-ebi niihu Chineke na Kraịst ya si na ebighị ebi ruo na ebighị ebi.”17

Mmemme onyinye dị nsọ niile niime Tempụl Nauvoo ka enyere naanị tupu ndị ogbuhere ụzọ anyị n’isimbụ a bụrụ ndị a chụpụrụ ịmalite njem nke agụgụala ha ruo na ugwu ukwu ndị nọ n’Ọdịda anyanwụ. Anyị nwere ọtụtụ ama sitere n’aka ọtụtụ ndị ogbuhere ụzọ na ike ha natara site na ịrachikọta ọnụ na Kraịst niime onyinye dị nsọ ha niime Tempụl Nauvoo nyere ha ume ime njem ha dị egwu ma hiwe onwe ha na Ọdịda anyanwụ.18

Ndị mmadụ enyeworo onyinye dị nsọ niime tempụl nwere oke na ọrụ iyi tempụl garment, ngwa dị iche nke uwe anya na-anaghị ahụ niihi na a na-eyi ya n’okpuru uwe elu. Ọ na-echetara ndị otu nwetaworo onyinye dị nsọ banyere ọgbụgba ndụ niile dị nsọ ha na-emewo na ngọzi niile ekweworo ha na nkwa niime tempụl dị nsọ. Na inwetezu ebumnuuche ndị ahụ dị nsọ, enyewo anyị ntụzi aka ị na-eyi garmentị tempụl mgbe niile esepụghị aka, ewezuga naanị oge ndị ahụ odoro anya dị mkpa. Niihi na ọgbụgba ndụ niile anaghị ewepụ otu ụbọchị, iyipụ garmentị nke otu onye ka a pụrụ ịghọta dị ka ịgbanyere oke na ọrụ niile na ngọzi niile nke metụtara ha azụ. N’aka nke ọzọ, ndị mmadụ na-eyi garmentị ha n’ikwesị ntụkwasị obi ma dobe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl ha na-esepụghị aka na ekwesi ike n’oke na ọrụ ha dị ka ndị otu na-eso ụzọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Foto, oyiyi
Maapụ nke tempụl niile.

Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a na-ewu ọtụtụ tempụl n’ụwa niile gburugburu. Ebumnuuche ha bụ ịgọzi ụmụ ọgbụgba ndụ nke Chineke site na ofufe tempụl na site na oke na ọrụ niile dị nsọ na ngọzi niile dị ebighị ebi ha natara site na ọgbụgba ndụ.

Foto, oyiyi
São Paulo Brazil Tempụl.

Nzukọ Ahụ nsọ nke Jizọs Kraịst ka amaara dị ka otu nzukọ nsọ nke na-ekwusi ike maka ime ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke. Ọgbụgba ndụ niile bụ ebumpụta ụwa na-adịgide na emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu nke Nzukọ nsọ nke a eweghachitere na-enyefe. Emume nsọ nke baptizim na ọgbụgba ndụ niile na-eso ya bụcha ihe ndị a chọrọ maka ịbanya n’alaeze selestịal. Emume nsọ niile ahụ na ọgbụgba ndụ tempụl niile na-eso ya bụ ihe ndị a chọrọ maka mbuli elu niime alaeze selestịal, nke bụ ndụ ebighị ebi, nke kachasị ukwuu na onyinye niile nke Chineke.”19 Nke ahụ bụ ihe Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a na-elekwasị anya.

Ana m agba ama banyere Jizọs Kraịst, onye bụ onyeisi nke Nzukọ nsọ ahụ, ma na-akpọku ngọzi Ya n’isi ndị niile na-achọ idobe ọgbụgba ndụ ha dị nsọ. Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.