Ọgbakọ Zuru ọha
“Dere Duu, ma Mata Na A Bụ M Chineke”
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


“Dere Duu, ma Mata Na A Bụ M Chineke”

Anyị nwere ike dere duu ma mata na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị.

Nʼoge mgbape ụlọ na ụbọchị midịa e mere na nso nso a maka otu ụlọ ọhụrụ nke Onyenwe anyị, e duru m otu otu nke ndị nta akụkọ nọ na njem nlereanya gagharịa na gburugburu ụlọ ahụ dị nsọ a rụrụ. A kọwara m ebumnuuche niile nke tempụl niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazụ a ma zaghachi ọtụtụ ajụjụ ha dị oke mma.

Tupu abanyewa na-ọnụ ụlọ selestịal, a kọwara m na ọnụ ụlọ nke a pụrụ iche niime ụlọ nke Onyenwe anyị n’ọnọdụ ihe iriba ama nọchiri anya udo na amara nke ebe obibi nke eluigwe bụ ebe anyị nwere ike ịlaghachi ma ndụ nke a gasịa. E mere m ka ndị ọbịa anyị mata na anyị agaghị ekwu okwu mgbe anyị nọ niime ụlọ selestịal, mana obi ga-atọ m ụtọ ịza ajụjụ ọbụla mgbe anyị gafere nʼebe ọzọ anyị ga-akwụsị na njem nlere anya anyị.

Mgbe anyị pụchara na ọnụ ụlọ selestịal ma dị ka anyị gbakọrọ nʼebe ọgbakọ anyị nke ọzọ, a jụrụ m ndị ọbịa anyị ma ha nwere ihe ndị ha hụrụ ha chọrọ ịkọwa. Otu niime ndị nta akụkọ kwuru na nnukwu anya mmiri, “Ahụtụbeghị m ihe ọbụla dị otu ahụ mbụ nʼoge ndụ m niile. Amazighị m nke ọma na ihe dị otu ahụ dị adị nʼụwa; ekweghị nnọọ nʼụdị ị nọ jụụ dị otu ahụ kwere omume.”

O riri m ọnụ ịhụ ma ikwu eziokwu ma mkpatu nke okwu nke onye a. Ma mmetụta nke a onye nta akụkọ gosịpụtara ziri otu akụkụ dị mkpa nke idere duu—imeri na iji ya gee ntị na ọgbaaghara nke dị na mpụta ebe anyị nọ.

Dị ka m mechara tụgharịa uche na okwu nke onye nta akụkọ ahụ kwuru ma tụgharịa uche na otu nzọụkwụ nke otu anyị si ebi ndụ ugbu a sị aga ọsịsọ ọsịsọ ọtụtụ mgbe—ezughị ike, mkpọtụ, nkwapụ ihu, mmegheri anya, na mgbawara ụzọ niile nke na-adịkarị ọtụtụ mgbe yiri ka ihe na-ewe uche anyị—otu akwụkwọ nsọ gbatara m nuuche: “Dere duu, ma mara na abụ m Chineke.”1

Ana m arịọ ka Mmụọ Nsọ nye onye ọbụla niime anyị amamiihe dị ka anyị na-atụle ntụ nke ịdị jụụ dị elu karịa ma dị nsọ karịa niime ndụ anyị—ịdị jụụ nke ime mmụọ dị niime ime obi nke na enyere anyị aka ịmata na icheta na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Ngọzi nke a dị ịrịba ama dị adị nye ndị otu Nzukọ nsọ niile ndị na-agbasi mbọ ike nʼokwukwe ịghọ ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.”2

Dere Duu

Na 1833, Ndị nsọ nọ na Missouri bụụrụ ndị nọ na mkpagbu dị egwu. Ndị ọgba aghara achụpụwo ha site n’ebe obibi ha niile na Ógbè Jackson, ma ụfọdụ ndị otu Nzukọ nsọ anwawo ihiwe onwe ha na mba ndị ọzọ nọ nso nso. Mana mkpagbu ahụ garaniihu, ma iyi egwu nke ọnwụ dịịrị ọtụtụ. Niime ọnọdụ ịma aka mgba ndịa, Onyenwe anyị kpughere ntuziaka ndị a na-esote nye Onye amụma Josef Smith na Kirtland, Ohio.

“Ya mere, ka akasie unu obi gbasara Zayọn; n’ihi anụ ahụ niile nọ n’aka m; dere duu ma mata na abụ m Chineke.”3

Ekwere m ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị “idere duu” pụtara ihe dị mkpa karịa naanị ekwughị okwu ma ọ bụ emegharịghị ahụ. Ikekwe ebumnuuche Ya bụ maka anyị icheta ma dabere na Ya na nʼIke Ya “nʼoge niile na niihe niile na nʼebe niile nke [anyị] nwere ike ịnọ niime ya.”4 Site otu a, “dere duu” nwere ike ị bụ ụzọ nke ichetara anyị ilekwasị anya na Onye Nzọpụta na-adaghị mba dị ka okwuchaa ọgwụ nke ịdị jụụ nke ime mmụọ nke mkpụrụ obi nke na-agba anyị ume ime na imeri ihe ndị siri ike.

Wuo nʼelu Oke nkume ahụ

Ezigbo okwukwe na-elekwasị anya mgbe ọbụla niime na nʼelu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst—niime Ya dị ka Onye Dị nsọ na Onye Nna nke Eluigwe Mụrụ Naanị Ya ma n’elu Ya na ozi nke mgbapụta O mejuputara.

N’ihi na ọ zawo nsọtụ niile nke iwu ahụ, ma ọ na-akpọrọ ndị niile nke nwere okwukwe na ya; ma ndị nke nwere okwukwe na ya ga-arapara nʼihe ọma ọbụla; ya mere ọ na-ekwuchita ihe gbasara ụmụ mmadụ.”5

Jizọs Kraịst bụ Onye Mgbapụta anyị,6 Onye ogbugbo anyị,7 na Onye nkwuchite ọnụ anyị8 anyị na Nna nke Eluigwe na oke nkume nke anyị ga-ewu ntọala nke ndụ ime mmụọ anyị.

Helaman kọwara, “Chetanụ, chetanụ na ọ bụ nʼelu oke nkume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ka unu ga-ewurịrị ntọala unu; ka ọ ga-abụ mgbe ekwensu ga-ezipụ ikuku ike ya, ee, akụ ya niile niime oke ifufe, ee, mgbe uzu mmiri eluigwe ya na oke ebili mmiri ya ga-etikwasị unu, ọ gaghị enwe ike nʼahụ unu ịdọda unu nʼolulu nke nhuju anya na ahụhụ na-enweghị nsọtụ, n’ihi oke nkume ahụ nʼelu nke e wuru unu, nke bụ isi ntọala, ntọala nʼelu nke ọbụrụ na umu mmadụ wuo ha enweghị ike ịda.”9

Ihe ịrịba ama nke Kraịst dị ka “oke nkume” n’elu onye nke anyị ga-ewu ntọala nke ndụ anyị bụ ntuziaka kachasị mkpa. Biko mata na niime amaokwu nke a na Onye Nzọpụta abụghị ntọala ahụ. Kama, ana adọ anyị aka na ntị iwu ntọala nke ime mmụọ anyị na n’elu Ya.10

Ntọala ahụ bụ akụkụ nke ụlọ ewuru ewu nke jikọtara ya ruo na ala. Ntọala siri ike na-eweta nchekwa sitere na ọghọm dị egwu niile sitere n’eke na ọtụtụ ike ndị ọzọ na-emebi ihe. Ntọala kwesịrị ekwesị nakwa ekesa ịnyị arụ nke ụlọ ruo mpaghara dị ukwuu iji zere ibufe aja ji ya oke ibu ma wete ala dị larịị maka iwu ụlọ.

Foto, oyiyi
Ụlọ nwere ntọala siri ike.

Njikọ siri ike ma nwee njikọ pụrụ ịdabere nʼetiti ala na ntọala dị oke mkpa ma ọ bụrụ na ụlọ ahụ ga-anọgide sie ike ma kwusie ike ọtụtụ oge. Ma maka ụdị ịrụ ụlọ ndị a kpọrọ aha, okpi igwe niile, na okporo igwe niile ka e nwere ike itinye iji jigide ntọala nke ụlọ iji “hiwesie ike,” okwute siri ike, dị arụ n’okpuru ihe ndị ahụ nọ n’elu ụdị dị ka aja na gravụl.

Foto, oyiyi
Ụlọ dabeere n’okwute siri ike.

N’ụzọ ọzọ yiri nke ahụ, ntọala nke ndụ anyị ahaghị ijikọ nʼoke nkume nke Kraịst ma ọ bụrụ ma anyị ga-anọgịde chịm ma guzosie ike. Ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile dị nsọ nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta eweghachitere ka enwere ike iji tụnyere okpi igwe na okporo igwe niile ejiri jikọta otu ụlọ na ihe e jiri hiwesie ya ike. Oge ọbụla anyị jiri okwukwe nata, mee nnyocha, chete, ma megharịa ọhụrụ ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, okpi igwe nke ime mmụọ anyị ka ana ejigidesị ike karịsịa ma kwụdesie ike karịsịa “n’oke nkume” nke Jizọs Kraịst.

Ya mere, onye ọbụla nke kwere na Chineke ga-enwe ike jiri obisike nwee olileanya maka ụwa nke ka mma, ee, ọbụna ọnọdụ nʼaka nri nke Chineke, bụ olileanya nke na-abịa site nʼokwukwe, na-eme ndabere nye mkpụrụ obi niile nke ụmụ mmadụ, nke ga-eme ka ha kwusie ike ma guzogide, na-anọgide nʼezi ọrụ niile oge niile, ebe a na-eduga ha na-ito Chineke.”11

Ịdị na-agbakwunye na ịdị na abawanye “dị ka oge na-aganiihu,”12 omume ọma [na-aja] ihe ndị anyị na-eche mma na-akwụsịghị akwụsị,” “ntụkwasị obi anyị [na-ebuwanye ibu karịsịa] niihu nke Chineke,” ma “Mmụọ Nsọ na-esepụghị aka [bụ] onye nsiso anyị mgbe niile.”13 Anyị na-aghọ ndị kara kwụsie ike, kara mie emie, kara nọzie anọzie, ma kara biri ebiri.14 Dị ka a tọrọ ntọala nke ndụ anyị n’elu Onye Nzọpụta, anyị bụ ndị a gọziri agọzi “idere duu”—inwe mmasị obi ike nke ime mmụọ ịmata na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị.

Oge ndị Dị nsọ, Ebe niile Dị nsọ, na Ebe obibi

Onyenwe anyị na-ewete ma oge ndị dị nsọ ma ebe niile dị nsọ iji nyere anyị aka nwete ma mụta gbasara ịdị jụụ nke a niime ime nke mkpụrụ obi anyị.

Nʼịmaatụ Ụbọchị izu ike bụ ụbọchị nke Chineke, oge dị nsọ edopụrụ iche iji cheta ma fee Nna ofufe nʼaha nke Ọkpara Ya, isonye na-emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja, na ịnata ma megharịa ọhụrụ ọgbụgba ndụ niile dị nsọ. Izu ụka ọbụla anyị na-efe Onyenwe anyị ofufe nʼoge ọmụmụ ihe nʼebe obibi anyị nakwa ma dị ka “ndị so nwere ala anyị na ndị nsọ”15 nʼoge oriri nsọ na nzukọ ndị ọzọ. Nʼụbọchị nsọ Ya, echiche anyị, ihe omume anyị, na omume anyị bụcha ihe ịrịba ama anyị na-enye Chineke na ihe na-egosị ịhụnaanya anyị nwere maka Ya.16 Sọnde niile, ọ bụrụ na anyị ga-ekwe, anyị nwere ike dere duu ma mata na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị.

Ihe bụ isi ofufe nke Ụbọchị izu ike anyị bụ ịga nʼụlọ nke ekpere ma nyefee oriri nsọ [anyị] nʼaka ụbọchị nsọ [nke Onyenwe anyị].”17 “Ụlọ [niile] nke ekpere” niime nke anyị na-agbakọ nʼỤbọchị izu ike bụcha ụlọ ụka na ebe ndị ọzọ enyere nkwado—ebe niile dị nsọ nke nkwanye ugwu, ife ofufe, na ịmụ ihe. Ụlọ nzukọ ọbụla na ngwa ọrụ aranyere site nʼikike ọkwa nchụaja dị ka ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nwere ike ibi na ebe ụmụ Chineke nwere ike ịbịa nwee ọmụma ihe nke Onye Mgbapụta ha.”18 Ọ bụrụ ma anyị kwe, anyị nwere ike “dere duu” nʼebe ofufe anyị niile dị nsọ ma matakwuo karịa nʼezie na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị.

Tempụl bụ ebe nsọ ọzọ a kpachapụrụ anya dopụ iche maka ofufe na ijere Chineke ozi na ịmụ eziokwu niile dị ebighị ebi. Anyị na-eche, na-eme ihe, ma na-eji ojiji nʼụzọ dị iche niime ụlọ nke Onyenwe anyị site nʼebe ndị ọzọ anyị nwere ike na-agakarị. Niime ụlọ nsọ Ya, ọ bụrụ ma anyị ga-ekwe, anyị nwere ike idere duu ma mata na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị.

Isi ebumnuuche niile nke oge dị nsọ na ebe nsọ niile bụcha otu ihe kpọm kwem: ịdị nʼatụkwasị uche anyị ugboro ugboro nʼaka Nna nke Eluigwe na atụmatụ Ya, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, ike mbuli elu nke Mmụọ nsọ, na nkwa niile ya na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta eweghachitere so.

Taa ana m ekwugharị otu ụkpụrụ nke m kwusiworo ike oge gara aga. Ebe obibi anyị ga-abụ ma emesịa ntụgwa nke ma oge dị nsọ ma ebe nsọ niime ebe ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ nwere ike “dere duu” ma mata na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Ịhapụ ebe obibi anyị niile ije fee ofufe nʼỤbọchị izu ike na niime ụlọ nke Onyenwe anyị na-ezie dị oke mkpa. Mana naanị mgbe anyị lọghachiri nʼebe obibi anyị niile nirri nhụmiihe nke ime mmụọ na ume enwetara nʼebe nsọ ndị ahụ na ihe omume niile ka anyị nwere ike mgbe ahụ kwadoo nlekwasị anya anyị nʼelu isi ebumnuuche niile nke ndụ anụ ahụ ma merie ọnwụnwa niile nke juputara nʼụwa daworo ada.

Ụbọchị izu ike, tempụl, na nhụmiihe ebe obibi anyị niile na-aganiihu ga-akwadosi anyị ike site nʼike nke Mmụọ Nsọ, site na ọgbụgba ndụ na-aganiihu ma sie ike karịa na-ejikọ anyị na Nna na Ọkpara, nakwa ihe nke olileanya zuru oke”19 niime nkwa niile dị ebighị ebi nke Chineke.

Dị ka ebe obibi na Nzukọ nsọ gbakọtara ọnụ nʼotu niime Kraịst,20 anyị nwere ike nwee nsogbu nʼakụkụ niile, mana anyị agaghị enwe nchekasị ahụ niime uche anyị na nʼobi anyị. Unu nwere ike nwee mgbagwoju anya site nʼọnọdụ anyị niile na ihe aka mgba niile, mana anyị agaghị ada mba. Enwere ike kpagbuo anyị, mana anyị gakwa amata na enweghị mgbe naanị anyị nọ.21 Anyị nwere ike nata ume nke ime mmụọ ịghọ ma nọgide kwụrụ chịm, guzogidesie ike, ma zie ezie.

Nkwa na Ama

Ana m ekwe nkwa na dị ka anyị na-ewu ntọala nke ndụ anyị nʼelu “oke nkume” nke Jizọs Kraịst, anyị nwere ike nata ngọzi site nʼaka Mmụọ Nsọ ịnata idere duu nke mkpụrụ obi nke onwe na nke ime mmụọ nke na enyere anyị aka ịmata ma cheta na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị, ma anyị nwere ike nata ngọzi ime na imeri ihe ndị siri ike.

Eji m ọńụ na-agba aka ebe na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, anyị bụ ụmụ Ya, ma Jizọs Kraịst bụ Onye Mgbapụta anyị na “oke nkume” nke nzọpụta anyị. Esi m otu a agba ama n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.