Ọgbakọ Zuru ọha
Ịgba ama nke Jizọs
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ịgba ama nke Jizọs

Oku m na-akpọ bụ ime ihe ugbu a iji nwete ohere dị ka onye bụ dike na-ọgbụgba ama nke Jizọs.

Na 1832, Josef Smit na Sidney Rigdon natara ọhụ dị mkpa gbasara akaraaka dị ebighị ebi nke ụmụ Chineke. Mkpughe nke a kwuru banyere alaeze eluigwe atọ. Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru okwu gbasara “alaeze nke otuto” ndị a na Ọktoba gara aga,1 na-ekwu na “site na mmeri na otuto nke Nwa atụrụ ahụ,”2 mmadụ niile mana dịtụ mmadụ ole ma ole ka emechara gbapụta ịbanye n’otu niime alaeze ndị a, “dị ka otu ọchịchọ ndị egosịpụtara site na nhọrọ ha siri dị.”3 Atụmatụ mgbapụta nke Chineke nwere niime ya ohere zuru ụwa ọnụ maka ụmụ Ya niile, mgbe ọbụla na ebe ọbụla ha nwere ike bie n’elu ụwa.

Ebe otuto nke ọbụla nke kachasị nta na alaeze atọ ahụ, telestịal, “karịrị nghọta niile,”4olileanya nke Nna anyị bụ na anyị ga-ahọrọ—ma, site na amara nke Ọkpara Ya, tozuo oke maka—nke kachasị elu ma kachasị dị ebube site na alaeze atọ ndị a, selestịal, ebe anyị nwere ike ńụrịa ọńụ ndụ ebighị ebi dị ka “ndị so keta oke anyị na Kraịst.”5 Onyeisi Russell M. Nelson arịọsiwo anyị ike “iche echiche selestịal,” na-eme alaeze selestịal ebumnobi anyị dị ebighị ebi ma mesịa “kpachara anya tulee ebe mkpebi nke ọbụla [anyị] na-eme nelu ụwa ebe a ga-edobe [anyị] niime ụwa na-abịa abịa.”6

Ndị ahụ nọ na alaeze selestịal bụ “ha ndị natara ama nke Jizọs, … ndị bụ ndị ezi omume emere ka ha zuo oke site na Jizọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.”7 Ndị bi na nke abụọ, ma ọ bụ terestrịal, alaeze bụ ndị akọwara dị ka ndị dị oke mma, tinyere ndị a na-enye nsọpụrụ nke ụwa, ndị kpuru isi site na nka aghụghọ nke ụmụ mmadụ.” Isi ihe mgbochi dị iche eji mara ha bụ na ha “esighị ike na ọgbụgba ama nke Jizọs.”8 N’aka nke ọzọ, ndị nke nọ na nke dị ala, alaeze telestịal bụ ndị ahụ ndị “na-anataghị ozi ọma ahụ, ọ bụghị ma ọ bụ ama nke Jizọs.”9

Matakwa na ejiri mara pụrụ iche maka ndị bi na alaeze nke ọbụla bụ otu ha si na-emekụta “ọgbụgba ama nke Jizọs,” malitere site na (1) iji obi niile nwee nnukwu ịhụnaanya na (2) esighị ike na (3) ịjụ kpam kpam. N’elu otu onye ọbụla si eme ihe kooro ọdịniihu dị ebighị ebi nke ya bụ nwoke ma ọ bụ ya bụ nwanyị.

I.

Gịnị bụ ama nke Jizọs Kraịst?

Ọ bụ aka ebe nke Mmụọ Nsọ na Ọ bụ Ọkpara nke Chineke dị nsọ, Mezaya na Onye Mgbapụta. Ọ bụ ama nke Jọn na Jizọs nọ na mmalite ya na Chineke, na Ọ bụ Onye Okike nke eluigwe na ụwa, nakwa “niime ya ka ozi ọma dị, ma ozi ọma ahụ bụ ndụ, ma ndụ bụ ihe nke ụmụ mmadụ.”10 Ọ bụ “ama nke Ndị ozi na Ndị amụma, … na Ọ nwụrụ, elie ya, ma bilite ọzọ n’ụbọchị nke atọ, ma gbagoro niime eluigwe.”11 Ọ bụ mmata ihe na “ọ dịghị aha ọzọ e nyere ebe nzọpụta si abịa.”12 Ọ bụ “ama, nke ikpeazụ na ha niile,” enyere site n’ọnụ Onye amụma Josef Smit “na ọ dị ndụ! … Na ọ bụ Onye A Mụrụ Naanị Yasite n’aka Nna—na site n’aka ya, ma site na okpuru ya, na site na ya, ụwa niile dị, ma e kere ha, ma ndị bi n’ebe ahụ bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị a mụrụ nye Chineke.”13

II.

Agafee ama nke a bụ ajụjụ ahụ: gịnị ka anyị ga-eme gbasara ya?

Ndị ga-eketa oke alaeze selestịal “ga-anata” ama nke Jizọs n’ụzọ kachasị ju eju site na-ime baptizim, ịnata Mmụọ Nsọ, na imeri site na okwukwe.14 Ụkpụrụ niile na eziokwu niile banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-achị ihe ndị ha kachasị nwee mmasị na ya na nhọrọ ha niile. Ozi ọma nke Jisọs na-apụta ihe niihe ha bụ na ihe ha na-aghọzi. Ihe kpatara ha ji eme ya na-abụ afọ ọma, “ihụnanya nke Kraịst na enweghi ntụkpọ.”15 Ebumnuuche ha bụ na-ịna agbaso “atụ nke ogo nke ojuju nke Kraịst.”16

Opekampe ụfọdụ niime ndị ahụ ndị aga ahụta na alaeze terestịal nakwa anabata ama nke Jizọs, mana ha na-apụiche site na ihe ha na-anaghị eme banyere ya. Ị nọ na-adịghị ike n’ịgba aka ebe nke Onye Nzọpụta na-egosị ogo nke enweghị mmasị ma ọ bụ ejighị ihe kpọrọ ihe—ị nọ “na-enweghị agụụ”17—dị ka nke megidere ndị nke Amọn niime Akwụkwọ nke Mọmọn, iji maatụ, ndị bụ “ndị ana akwanyere ugwu niihi ọnụnụ ọkụ n’obi ha n’ebe Chineke nọ.”18

Ndị nke ga-ebi na alaeze telestịal bụ ndị ahụ ga-ajụ ama nke Jizọs ya na ozi ọma Ya,ọgbụgba ndụ Ya niile, na ndị amụma Ya. A kọwara ha site n’aka Abinadaị dị ka “ebe agaworo dị ka otu uche na ọchịchọ nke anụ ahụ ha siri dị; ebe na-enwebeghị mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị n’oge e setịpụrụ ogweaka nke ebere n’ebe ha nọ; niihi na ogweaka nke ebere ka agbatịrị n’ebe ha nọ, ma ha agaghị ekwe.”19

III.

Gịnị ka ọ pụtara ịdị ike na-ama nke Jizọs?

E nwere ọtụtụ ụzọ kwere omume nke enwere ike itule na-ịsa ajụjụ nke a. Aga m akpọpụta ole ma ole. Ịdị ike na-ama nke Jizọs nezie gụnyere ọzụzụ na ịkwadosị ama ahụ ike. Ezi ndị na-eso ụzọ anaghị eleghara ihe ndị yiri ihe ndị dị nta anya nke na-akwado ma na-akwadosi ike ama ha banyere Jizọs, ụdị dị ka ekpere, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, idobe Ụbọchị izu ike nsọ, na iri oriri nsọ, ije ozi nlekọta, ije ozi, na ife ofufe n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Onyeisi Nelson na-echetara anyị na “site n’ọsọ dị egwu, ama nke na-azụghị azụ kwa ụbọchị ‘site n’okwu dị mma nke Chineke’ [Moroni 6:4 nwere ike ịkụ afọ n’ala. N’ụzọ dị otu a, … anyị chọrọ nhụmiihe kwa ụbọchị ife Onyenwe anyị ofufe na ịmụ ozi ọma Ya. Emesịa ya agbakwunye: “Ana m arịọ unu ka unu kwe ka Chineke merie n’ime ndụ unu. Nye Ya ezigbo ohere gị. Dị ka ị na-eme nke a, hụta ihe ga-eme na ike nke ime mmụọ na-abịa abịa na-enye aka nke gị.”20

Isi ike nakwa na-atụpụta ighewe ọnụ oghe na ikwu na mbara ọha ihe gbasara aka ebe nke onwe onye. Na baptizim, anyị na-eme ka amata ịdị njikere anyị “iguzo dị ka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile nke (anyị) nwere ike ị nọ, ọbụna tutu ruo n’ọnwụ.”21 Nke ka nke noge Ista nke a, anyị na-eji ọńụ, niihu ọha na-eze, ma na-enweghị ihe edokwara ama ọkwa ama anyị banyere Kraịst ahụ dị ndụ, bilitere n’ọnwụ.

Otu akụkụ nke Ịdị ike na-ama nke Jizọs bụ ịńa ndị ozi Ya ntị. Chineke anaghị amanye anyị ịbanye n’ụzọ kacha mma, okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ, mana Ọ akụziri ndị amụma Ya ime ka anyị mata n’uju ya banyere ndapụta niile na-eso nhọrọ anyị. Ma ọ bụghị nnọọ naanị ndị otu nke Nzukọ nsọ Ya. Site na ndị amụma na ndị ozi Ya, O ji ịhụnaanya na-arịọ ndị niile bi n’ụwa ka ha ńaa ntị n’eziokwu nke ga-eme ka ha nwere onwe ha,22tọghapụ ha n’ahụhụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma wetara ha ọńụ na-adịgide adịgide.

Ị bụ onye dị ike na ama nke Jizọs pụtara ị na-agba ndị ọzọ ume, site n’okwu ọnụ na ọmụmaatụ, ruo na isikwa otu ahụ dị ike nke ka nke ndị nke bụ ndị nke ezi na ụlọ anyị. Okenye Neal A. Maxwell otu mgbe kwuru banyere “ndị dị oke mkpa ‘ana asọpụrụ’ ndị otu [nke Nzukọ nsọ ahụ] ndị nke na-enyochasị n’elu elu kama imikpu ịbụ ndị na-eso ụzọ ha na ndị na-anaghị akpachara anya esonye n’ọrụ karịa ịbụ ndị ‘na-eji ọnụnụ ọkụ n’obi esonye n’ọrụ’ [(Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:75.; 58:27].”23 Na-ahụ na mmadụ niile nwere ohere ịhọrọ, Okenye Maxwell kwara arịrị: Nke ka njọ, ka osila dị, mgbe ụfọdụ họọrọ nghakasị, ha na-ahọrọ ọbụghị naanị maka onwe ha, mana maka ndudugandu na-abịa abịa na nke ọzọ. Ụmụ obere iti mkpu na-ebe ndị nne na nna nọ nwere ike imepụta nnukwu ndịiche na-ebe ụmụ ha nọ! Ndudugandu ndị isi mbụ nọ na ezi na ụlọ nwere ike nwee nraranye egosịpụtara, ebe ụfọdụ niime ndudugandu nke ugbu a na-egosịpụta iti mkpu. Nke jọgburu onwe ya, na nke na-abịa abịa, ụfọdụ nwere ike họrọ ndapụ, dị ka mbuze na-ewere ọnọdụ ya.”24

Ọtụtụ afọ gara aga, Okenye Jọn H. Groberg kọrọ akụkọ banyere otu ezi na ụlọ nta bi n’otu ngalaba nta nọ na Hawaii na mmalite 1900 gawa niihu. Ha abụrụworịị ndị otu Nzukọ nsọ ihe dị ka afọ abụọ mgbe otu niime ụmụada ha dabara n’ọrịa nke a na-amaghị ihe aga akpọ ya ma nọọrọ n’ụlọ ọgwụ. Na nzukọ nsọ na Sọnde na-esote, nna ya na nwa ya nwoke kwadoro oriri nsọ dị ka ha na-eme n’ọtụtụ izu ụka, mana dị ka onye nna ahụ dị nta gbisara ịgọzi achịcha ahụ, onyeisi ngalaba nta, n’otu ntabi anya matara onye nọ na tebụlụ oriri nsọ, wụliri elu ma tie, “Kwụsị. Ịnweghị ike ibitụ oriri nsọ aka. Nwa gị nwanyị nwere ọrịa a na-amaghị aha ya. Pụọ ozugbo ozugbo ebe onye ọzọ ga-edochi achịcha oriri nsọ ọhụrụ. Anyị enweghị ike ekwe ka ịnọrọ ebe a. Pụọ.” Nna ahụ ọ tụrụ naanya kpachapụrụ anya lee onyeisi ngalaba nta ahụ ma mesịa lee ndị ọgbakọ ma, na-ahụta omimi nke nchegbu na ihere sitere na ndị niile, feere ndị ezi na ụlọ ya aka ịpụta, ma ha jiri nwayọ site na chapụlụ ahụ pụọ.

Enweghị otu mkpụrụokwu ekwuru dị ka, n’ụzọ ndị a jụrụ ajụ, ezi na ụlọ ahụ gbasooro nzọ ụkwụ ha laa n’ebe obere ebe obibi ha. Ebe ahụ ka ha nọdụrụ ala gburugburu, ma nna ahụ sịrị, .”Biko gbanụ nkịtị tutu ruo mgbe m jikerela ikwu okwu.” Nwa ya nwoke nta chere echiche banyere ihe ha ga-eme iji bọọ ụbọ maka ihere e mere ha: ha ga-egbu ezi ndị nke onyeisi ngalaba nta, ma ọ bụ kpọọ ụlọ ya ọkụ, ma ọ bụ sonye nzukọ nsọ ọzọ? Nkeji ise, iri, iri na ise, iri abụọ na ise agafewo na-enweghị mkpọtụ.

Nna ahụ kwụkwụchiri aka ọkpọ ya ma malite ịdajụ, ma anya mmiri juru ya anya. Onye nne malitere ibe akwa, ma mgbe na-adịghị anya, nke ọbụla niime ụmụ ya jiri nwayọ na-ebe akwa. Nna ahụ tụgharịrị n’ebe nwunye ya nọ ma kwuo, “A hụrụ m gị naanya,” ma mesịa kwugharịa mkpụrụokwu ndị ahụ nye nke ọbụla niime ụmụ ha. “A hụrụ m unu niile naanya ma a chọrọ m ka anyị nọkọta ọnụ, ruo ebighị ebi, dị ka ezi na ụlọ. Ma naanị ụzọ nke ahụ nwere ike i si dị bụ maka anyị niile ịbụ ndi otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ma nwee ike rachikọta ọnụ site nọkwa nchụaja dị nsọ niime tempụl. Nke a abụghị nzukọ nsọ nke onyeisi ngalaba nta. Ọ bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Anyị agaghị ekwe nwoke ọbụla ma ọ bụ mmerụ ahụ ọbụla ma ọ bụ ihere ma ọ bụ mpako gbochie anyị site na ịnọkọta ọnụ ruo ebighị ebi. Sọnde na-esote anyị ga-agaghachi na nzukọ nsọ. Anyị ga-anọdụrụ onwe anyị tutu ruo mgbe aga amata ọrịa nke nwa anyị nwanyị, mana anyị ga-alaghachi.”

Ha laghachiri azụ, nwa ha nwanyị gbakere, ma ezi na ụlọ ahụ ka arachiri na Laie Hawaii Tempụl mgbe arụchara ya. Taa, ihe karịrị mkpụrụ obi dị 100 na-akpọ nna ha, nna nna ha, na nna nna ukwu ha onye a gọziri agọzi niihi na o lekwasịrị anya ya na ndụ ebighị ebi.25

Otu akụkụ ikpeazụ nke ịdị ike na ama nke Jizọs nke m ga-akpọpụta bụ ọchịchọ nke ịdị nsọ nke onwe anyị. Jizọs bụ Onye Mgbapụta anyị dị oke mkpa,26 ma Ọ na-arịọ, “Chegharịanụ, unu nsọtụ niile nke ụwa, ma bịakwutenụ m ma ka e mee unu baptizim n’aha m, ka e wee sachaa unu site na nnabata nke Mmụọ Nsọ, ka unu wee guzoro na-enweghị ntụpọ n’ihu m n’ụbọchị ikpeazụ.”27

Onye amụma Mọmọn kọwara otu otu nke Ndị Nsọ ndị nagidere n’ụdị ụzọ dị otu a na-agbanyeghị “ịgabiga nnukwu mkpagbu”:28

“Otu o sila dị ha buru ọnụ ma kpee ekpere ugboro ugboro, ma gbasie ike nʼelu mgbasike nʼumeala ha, na nkwụsike nʼelu nkwụsike nʼokwukwe nke Kraịst, ruo nʼimejupụta mkpụrụ obi ha nʼọn̄ụ na nkasi obi, ee, ọbụna ruo nʼịsachasị na ido nsọ nke obi ha, bụ ido nsọ nke na-abịa n’ihi inyefe obi ha n’aka Chineke.”29 Ọ bụ nnukwu mgbanwe obi nke a—inyefe obi anyị n’aka Chineke na ị bụ ndị amụgharịrị na mmụọ site na amara nke Onye Nzọpụta—ka anyị na-achọ.30

Oku m na-akpọ bụ ime ihe ugbu a iji nwete ebe nke unu dị ka otu onye nke dị ike niime ama nke Jizọs. Dị ka enwere ike chọọ nchegharị, “egbukwala oge ụbọchị nke nchegharị gị,”31 n’ụjọ ma “n’oge awa mgbe na-ịgaghị echeta na oge ọkọchị ga-agafe, ma owuwe ihe ubi agwụsịa, ma mkpụrụ obi unu enwetaghị nzọpụta.”32 Gbasie ike n’idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke. “Ewekwala iwe [site na] n’isi ike nke okwu ahụ.”33 “Chetanụ ijigide niime gị aha [nke Kraịst] e deworo mgbe niile niime obi unu, … ka unu [nwee ike] nụrụ ma mata olu ahụ nke a ga-eji kpọọ unu, na kwa, aha ahụ nke ọ ga-eji akpọ unu.”34 Ma na-ikpeazụ, “dozienụ nke a niime obi unu, na unu ga-eme ihe ndị nke [Jizọs] ga-akuzi, ma nye unu n’iwu.”35

Nna anyị chọrọ ụmụ Ya niile ndị ga-ańụrị ọńụ ndụ ebighị ebi ha na Ya niime alaeze selestịal Ya. Jizọs tara ahụhụ, nwụọ ọnwụ, ma bilitere n’ọnwụ iji mee ka nke ahụ kwe omume. Ọ “gbagorowo niime eluigwe, ma nọdụwo n’aka nri nke Chineke, iji nata site nʼaka Nna ihe niile ruru ya nke ebere nke o nwere nʼebe ụmụ mmadụ nọ.”36 Ana m arịọ ka anyị niile wee nwee ike nwete ngọzi jiri ama nke Jizọs Kraịst na-ere ọkụ, ńụrịa ọńụ ma dị ike na ama ahụ, ma ńụrịa ọńụ na mkpụrụ niile nke amara Ya niime ndụ anyị esepụghị aka. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen