Ọgbakọ Zuru ọha
Mmegide N’ihe Niile
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Mmegide N’ihe Niile

Iji nwee ike iji ohere nhọrọ anyị rụọ ọrụ, anyị kwesịrị itule nhọrọ abụọ ndị na-emegide onwe ha.

Na nso nso a, mgbe m na-anya ụgbọala nime otu obodo nke anyị na-amaghị, amaghị m ama baa n’ụzọ n’ezighi ezi, nke mere mụ na nwunye m bara mbasara okporo ụzọ ma gbatee maịlụ agwụghị agwụ na-enweghi ike ichigharị ọzọ. Anyị natara oku obi ebere ị bịa n’ebe obibi otu enyi ma nwee nchegbu n’anyị gazi erute mgbe oge gafere karịa otu anyị si wee chọọ.

Mgbe anyị nọ n’okporo ụzọ mbasara nke a ma nwee oke mmasị ịchọta ụzọ esi apụta ọzọ, a tara m onwe m ụta maka na-elerughị m anya nye sistem njem ahụ. Nhụmihe nke a mere ka m chee banyere otu nime ndụ anyị mgbe ụfọdụ, anyị na-abanye nime mkpebi na-ezighị ezi ma otu anyị ga-esi bie ndụ anyị na ndapụta niile si na ya jiri obi umeala na ndidi tutu mgbe anyị nwere ike ịgbanwe ụzọ anyị ọzọ.

Ndụ bụ ihe niile gbasara ime nhọrọ. Nna anyị nke Eluigwe nyere anyị onyinye dị nsọ nke ohere nhọrọ kpọmkwem ka anyị nwee ike mụta ihe site na nhọrọ anyị niile—ma site na ndị ziri ezi nakwa ndị na-ezighị ezi. Anyị na-edozi nhọrọ anyị ndị na-ezighị ezi mgbe anyị chegharịrị. N’ebe a ka uto na-eme. Atụmatụ nke Nna maka anyị niile bụ banyere mmụta ihe, mwulite, na ịganiihu ruo ndụ ebighị ebi.

Kemgbe ahụ akuziri mụ na nwunye m ihe site n’aka ndị mgbasa ozi ọma ma sonye Nzukọ nsọ ọtụtụ afọ gara aga, a na m enwetakarị mmetụta site na nkuzi miri emi ndị nke Lehi kuziiri nwa ya nwoke Jekọb niime Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ kuziiri ya na “Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ka o jiri aka ya mee ihe ọ ga-emere onwe ya”1 ma na “ọ dịrịrị mkpa na a ga-enwe mmegide n’ihe niile”2 Iji nwee ike iji ohere nhọrọ anyị rụọ ọrụ, anyị kwesịrị itule nhọrọ abụọ ndị na-emegide onwe ha. Na-ime otu a, Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ na-echetakwara anyị na “akuziworo anyị otu o zuuru anyị”3 na “Mmụọ nke Kraịst ahụ”4 ka enyeworo onye ọbụla niime anyị iji “mata ezi ihe site na ajọọ ihe.”5

Na ndụ, anyị mgbe niile na-ezute ọtụtụ nhọrọ ndị dị mkpa. Maka ọmụmaatụ:

  • Ịhọrọ ma anyị ma ọ bụ naanyị agaghị esoro iwu nsọ niile nke Chineke.

  • Ịhọrọ inwe okwukwe ma mata mgbe ọrụ ebube mere ma ọ bụ iji obi abụọ chere mgbe otu ihe ga-eme tupu ahọrọzie ị kwere nanị mgbe ahụ.

  • Ịhọrọ iwulite ntụkwasị obi na Chineke ma ọ bụ ijiri ụjọ na-eche ịma aka ọzọ nke ụbọchị na-esote.

Dị ka mgbe ahụ m bara ụzọ ahụ na-ezighị ezi n’okporo ụzọ mbasara ahụ, ita ahụhụ sitere na ndapụta nke nhọrọ ahụ na-ezighị ezi nke onwe m nwere ike mgbe ụfọdụ dị mwute nihi na ọ bụ naanị onwe anyị ka anyị ga-ata ụta. Kosiladị, anyị nwere ike ịhọrọ mgbe niile ị nata nkasị obi site na usoro dị nsọ nke nchegharị, mee ka ajọọ ihe bụrụ ezi ihe, ma site na-ime otu a mụta ụfọdụ nkuzi ndị na-agbanwe ndụ.

Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike nwete mmegide na mnwale site nihe ndịa ahụ na anọghị anyị n’aka, dị ka:

  • Oge niile nke ahuike na oge niile nke nrịa nrịa.

  • Oge niile nke udo na oge niile nke agha.

  • Awa niile nke ehihie na nke abalị ma oge niile nke summer na nke winter

  • Oge niile nke nrụsi ọrụ ike nke sochiri ya abụrụ oge niile nke ezumike.

Na-agbanyeghi na anyị apụghị ịhọrọ n’etiti ụdị ọnọdụ ndịa nihi ha na emere onwe, anyị nweere onwe anyị ị họrọ otu anyị si emeso ha. Anyị nwere ike mee otu a jiri obi dị mma ma ọ bụ jiri obi na-adighị mma. Anyị nwere ike chọọ ị mụta ihe site na nhụmihe ahụ ma rịọ maka enyemaka na nkwado Onyenwe anyị, ma ọ bụ anyị nwere ike chee na anyị nọrọ onwe anyị nime mnwale ndịa na anyị kwesịrị ịta ahụhụ dị na ya n’onwe anyị. Anyị nwere ike “hazigharịa echiche anyị” ka ọ daba adaba na nsiridị ọhụrụ, ma ọ bụ anyị nwere ike kpebie n’anyị agaghị agbanwe ihe ọbụla. Niime ọchịchịrị nke abalị, anyị nwere ike gbanye ihè anyị niile. Niime ntụ oyi nke winter, anyị kwesịrị họrọ iyi uwe na-ekpo ọkụ. N’oge niile nke nrịa nrịa, anyị nwere ike chọọ enyemaka ahụike na nke ime mmụọ. Anyị nwere ike họrọ otu anyị ga-esi emeso ọnọdụ niile ndịa.

Hazigharịa, mụta ihe, chọọ, họrọ bụcha ngwaa omume. Cheta n’anyị bụ mmadụ ma anyị abụghị ihe ndụ n’adịghị. Ka anyị ghara ichefu na Jizọs kwere nkwa na “ọ ga ebukwasị onwe ya ihe mgbu niile na ọrịa niile nke ndị ya … ka o wee … nyee aka,” ma ọ bụ nyere anyị aka dị ka anyị na-echigharị n’ebe Ọ nọ.6 Anyị nwere ike họrọ iwu ntọala anyị n’elu oke nkume ahụ bụ Jizọs Kraịst ka mgbe oke ifufe ahụ ga-abịa ọ gaghị enwe ike nʼahụ [anyị].”7 Ọ kwewo nkwa na “onye ọbụla ga-abịa [kwute Ya], ya ka [Ọ] ga-anabata; ma ngọzi na-adịrị ndị na abịakwute [Ya].”8

Ugbua, enwere otu ụkpụrụ ọzọ nke kacha dị ezigbote mkpa. Lehi kwuru na “ọ dịrịrị mkpa, na a ga-enwe … mmegide n’ihe niile.”9 Nke a pụtara na mmegide abụọ anaghị a nọpụ iche site n’ibe ya. Ha pụrụ ọbụna imeju ibe ha. Anyị agaghị enwe ike ịmata ọṅụ ọ gwụla ma anyị enwewokwa nhụmiihe mwute n’oge ụfọdụ gara aga. Ịnwe mmetụta agụụ mgbe ụfọdụ na-enyere anyị aka nwee obi ekele mgbe anyị nwere nke ga-ezuru anyị iri ọzọ. Anyị agaghị enwe ike ịchọta eziokwu ma ọbụghị ma anyị ahụwokwa asị ebe a na ebe ahụ.

Mmegide ndịa dị nnọ ka ihu abụọ nke otu mkpụrụ ego. Ofe abụọ ahụ nọ ya mgbe niile. Charles Dickens rọpụtara otu ọmụmaatụ nke echiche nke a mgbe ọ dere na “ọ bụ oge ahụ kacha mma, ọ bụ oge ahụ kacha njọ.”10

Ka m nye otu atụmatụ sitere na ndụ anyị. Ịgba akwụkwọ, iwulite ezi na ụlọ, na ịmụ nwa weteere anyị oge ọńụ ndị ahụ kacha nke anyị kacha nwee na mbụ na ndụ anyị ma bụrụkwa nnukwu oge mgbu, nhujuanya, na mwute mgbe ihe mere otu onye niime anyị. Ọńụ na obi ụtọ na-enweghi ọgwụgwụ nke anyị na ụmụ anyị nwere na-abụ ihe mgbe ụfọdụ ihe na-esochi ha bụ nrịa nrịa, ịga ụlọọgwụ, ịmụ anya abalị nke juputara na mgbakasị ahụ, ma tinyekwara ịchọta enyemaka nime ekpere na ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Nhụmiihe ndịa na-emegide onwe ha kuziiro anyị na anyị anọghị naanị anyị n’oge niile nke ntaram ahụhụ, ma ha na-egosikwa anyị ihe ole anyị nwere ike ibuli jiri nkwado na enyemaka nke Onyenwe anyị. Nhụmihe ndị a nyere aka ịkpụzi anyị n’ọtụtụ ụzọ magburu onwe ha, ma ọ bụwokwarịị ihe bara uru nke ukwuu. Ọ bụna ọ bụghị ihe mere anyị jiri bịa n’ebe a?

Nime akwụkwọ nsọ anyị na-achọta ọtụtụ ọmụmatụ dị ịtụnanya:

  • Lehi kuziri nwa ya Jekọb na mkpagbu niile nke ọ tara ahụhụ ya niime alaịkpa nyeere ya aka ị mata ịdị ukwuu nke Chineke nakwa na “[Chineke] ga-agọzi mkpagbu [ya] niile ka ha bụrụ [ya] uru.”11

  • N’oge mkpochi obi ọjọọ nke akpochiri Josef Smith na Mkpọrọ Libati, Onyenwe anyị gwara ya na “ihe ndịa ga-enye [ya] uche nke onwe, ma ga-abụ maka ọdịmma [ya].”12

  • N’ikpeazu, aja agwụghị agwụ nke Jizọs Kraịst bụ nnọọ ọmụmatụ kachasị ibe ya nke gosiri mgbu na ntaram ahụhụ anya na-ahụbeghi mbụ, mana ọ wetekwara ngọzị niile dị ịtụnanya nke Aja mgbaghara mmehie Ya nye ụmụ niile nke Chineke.

Ebe enwere anyanwụ, ọchịchịrị ga-anọrịrị ebe ahụ. Ide mmiri nwere ike wete mbibi, mana ọ na-ewetekarị ndụ otu aka ahụ. Anya mmiri nke mwute mgbe ụfọdụ na-abụzi anya mmiri nke enyemaka na ańụrị. Mmetụta nke obi mwute mgbe onye a hụrụ naanya nwụrụ ka a na-akwụghachi jiri ọńụ nke izute ọzọ. N’oge niile nke agha na mbibi, ọtụtụ obere omume nke obi ebere na ịhụnaanya na-emekwara ndị ahụ ji “anya na-ahụ ụzọ, ma jiri ntị na-anụ ihe.”13

Ụwa anyị taa ka ejirimara ya na-abụkarị ụjọ na nchegbu—ụjọ nke ihe ọdịnihu nwere ike ị wetere anyị. Mana Jizọs akuziworo anyị ịtụkwasị obi ma “lekwasịnụ [Ya] anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla egwu.”14

Ka anyị mgbe niile gbaa mbọ ejiri obi niile mee iji hụ ofe abụọ nke mkpụrụ ego ọbụla ekenyere anyị nime ndụ anyị. Na-agbanyeghị na ofe abụọ ndị ahụ mgbe ụfọdụ anaghị egosi onwe ha nye anyị ozugbo, anyị nwere ike ị mata ma tụkwasị obi na ha nọ ebe ahụ mgbe niile.

Obi anyị nwere ike ruo ala na nsogbu anyị niile, iri uju, mkpagbu, na mgbu anaghị akọwa onye anyị bụ; kama, ọ bụ otu anyị si emeso ha ga-enyere anyị aka tolite ma biaruo Chineke nso. Ọ bụ agwa na nhọrọ anyị niile na-akọwa anyị n’ụzọ kacha mma karịa ịma aka anyị.

Mgbe ị nọ n’ezi ahụike, nwee mmasị ma nwe ekele maka ya oge ọbụla. Mgbe ị nọ na nrịa nrịa, chọọ ka ijiri ndidi mụta ihe na ya ma mara na nke a nwere ike gbanwee ọzọ dị ka uche Chineke siri dị. Mgbe ị na-eri uju, tụkwasị obi na ańụrị nọ nso n’akụkụ, anyị anaghị ahụkarị ya mgbe ahụ. Jiri obi niile hazịgharịa nlekwasị anya gị ma bulie echiche gị niile elu ruo nihe ndị dị mma nke ịma aka ndị ahụ, nihi n’ezie n’ezie ha nọkwa ebe ahụ mgbe niile kwa! Echefule inwe obi ekele. Họrọ ikwere Họrọ inwe okwukwe nʼime Jizọs Kraist. Họrọ mgbe niile ịtụkwasị obi na Chineke. Họrọ “iche maka selestial,” dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziiri anyị na nso nso a!15

Ka anyị mgbe niile buru n’uche atụmatụ dị ịtụnaanya nke Nna anyị nke Eluigwe nwere maka anyị. O hụrụ anyị naanya ma O zitere Ọkpara Ya inyere anyị aka nime mnwale anyị ma imepere anyị ụzọ ahụ maka ịlaghachikwutere Ya. Jizọs Kraịst dị ndụ ma guzooro n’ebe ahụ n’oge ọbụla, na-eche anyị ịhọrọ ịkpọku Ya ka ọ rọpụtara anyị enyemaka, ume, na nzọpụta. Maka ihe ndị a ka m na-agba ama ya n’aha Jizọs Kraịst, amen.