Ọgbakọ Zuru ọha
Ñụrịa ọñụ nime Onyinye nke Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ñụrịa ọñụ nime Onyinye nke Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-achịkọta otu enwere ike iji ọkwa nchụaja nke Chineke mejupụta ebumn’obi nke Onyenwe anyị ma gọzie ndị niile nabatara ozi ọma ahụ eweghachitere.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, taa bụ ụbọchị dị mkpa maka Onyeisi Dallin H. Oaks na mụ. Ọ bụ afọ 40 gara aga, na Eprel 7, 1984, mgbe akwadoro anyị ịbata Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ.1 Anyị an̄ụrịwo ọn̄ụ niime ọgbakọ zuru ọha ọbụla kemgbe ahụ, tinyekwara nke a. Anyị enwetawokwa ọzọ ngọzị nke mnwukwasị dị nsọ nke Mmụọ. Enwere m olile anya na unu kwa mgbe ga-amụ ozi niile nke ọgbakọ nke a ruo n’ọnwa ndị n’abịa abịa.

Mgbe a mụrụ m,2 enwere tempụl isii nke Nzukọ nsọ na-arụ ọrụ—otu otu nime St. George, Logan, Manti, na Salt Lake City, Utah; makwa na Cardston, Alberta, Canada; nakwa Laie, Hawaii. Enwere tempụl abụọ ndị rụtụrụ ọrụ na mbụ nwantịtị oge na Kirtland, Ohio, na Nauvoo, Illinois. Dịka igwe ndị Nzukọ nsọ gawara ọdịda anyanwụ, Ndị nsọ ka amanyere n’ike ị hapụ tempụl ndị ahụ n’azu.

Tempụl nke Nauvoo ka-ebibiri site n’ọkụ ndị kpachara anya mụnye ya ọkụ. Arụgharịri ya ma mee nraranye ya site n’aka Onyeisi Gordon B. Hinckley.3 Tempụl nke Kirtland ka ndị iro Nzukọ nsọ merụrụ. Emesịa Tempụl nke Kirtland ka ndị Community nke Kraịst zụrụ, nke ọ bụ ha nwe ya ruo ọtụtụ afọ.

Ọnwa gara aga anyị mara ọkwa na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a azụrụwo Tempụl Kirtland, tinyekwara ebe ndị ọzọ dị mkpa maka agụgụala anyị na Nauvoo. Anyị nwere obi ekele dị ukwuu maka mkparịta nwere ugwu ma baara onye ọbụla uru nke anyị nwere anyị na ndị ndu sitere na Community nke Kraịst nke mere nkwekọrịta nke a ji nwe isi.

Foto, oyiyi
Tempụl Kirtland

Tempụl nke Kirtland nwere ịdị mkpa pụrụ iche maka Mweghachite ozi ọma ahụ nke Jizọs Kraịst. Ọtụtụ ihe mere n’ebe ahụ ka eburu n’amụma na puku afọ gara aga ma ha dị mkpa maka mweghachite Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị iji mejupụta ebumnuuche nke ụbọchị ikpeazụ.

Ihe omume kachasị mkpa mere na Ista Sọnde, Eprel 3, 1836.4 N’ụbọchị ahụ, Josef Smit na Oliver Cowdery nwere usoro nleta ole n’ole dị iriba ama. Nke mbụ, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst pụtara. Onye amụma dere maka Onye nzọpụta na “anya ya abụọ dịka ire nke ọkụ; agịrị nke isi ya dị ọcha dịka ezi snow; mbara iru ya na-enwu karịa mmụke nke anyanwụ; na olu ya dịka ụda ọtụtụ nnukwu mmiri nile na-asọ-asọ.”5

N’oge nleta nke a, Onyenwe anyị gbara ama maka njirimara Ya. O kwuru, “A bụ m onye mbụ ahụ na onye ikpe azụ ahụ; a bụ m onye ahụ na-adị ndụ, a bụ m ya onye ahụ egburu egbu; a bụ m onye nkwuchita ọnụ unu n’ebe Nna nọ.”6

Emesịa Jizọs Kraịst kwupụtara na Ọ nabatawo tempụl ahụ dịka ụlọ Ya na kwe nkwa nke a dị ịtụnanya: “a ga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a.”7

Nkwa nke a pụrụ iche metụtara tempụl ọbụla emeworo nraranye ya taa. A na m akpọku unu ka unu tulee ihe nkwa nke Onyenwe anyị pụtara nye unu onwe unu.

Mgbe nleta nke Onye Nzọpụta gasịrị, Mozis pụtara. Mozis nyefere n’isi Josef Smit ọtụghe niile nke mkpokọta nke Israel na mweghachi nke agbụrụ iri ahụ.8

Mgbe ọhụ nke a mechiri, “Elaias pụtara, na nyefee ọkwa-ọrụ ahụ nke ozi-ọma nke Abraham” nye Josef.9

Emesịa Elijah Onye amụma apụta. Mpụta ya mezuru nkwa nke Malakaị na tupu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, Onyenwe anyị ga-ezite Elijah ka “atụgharị obi nke ndị nna nna nye ụmụ, na obi nke ụmụ nye ndị nna nna ha.”10 Elijah enyefee ọtụghe niile nke ike nrachị n’isi Josef Smit.11

Uru dị nime mnweghachite ọtụghe niile ndịa n’ụwa site n’aka ndị ozi nke eluigwe n’ọkpuru ntụziaka nke Onyenwe anyị abụghị nke a ga-ekwubigara ya ókè. Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja sonyere niime ikikere na ike nke ndịisi. Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-achịkọta otu enwere ike iji ọkwa nchụaja nke Chineke mejupụta ebumn’obi nke Onyenwe anyị ma gọzie ndị niile nabatara ozi ọma Jizọs Kraịst eweghachitere.

Ọ dị mkpa ka ahụba ama na tupu nhazi nke Nzukọ nsọ, ndị ozi nke eluigwe enyefoworịị Ọkwa nchụaja nke Erọn na Melkizedek n’isi Onye amụma Josef ma enyeworịị ya ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja abụọ ahụ.12 Ọtụghe ndịa nyere Josef Smit ikikere iji hazie Nzukọ nsọ ahụ n’afọ 1830.13

Emesịa nime Tempụl nke Kirtland n’afọ 1836, nnyefe nke ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja atọ ndị ọzọ ndịa—akpọrọ, ọtụghe niile nke mkpọkọta Izrel, ọtụghe niile nke ozi ọma Ebreham, na ọtụghe niile nke ike nrachị—dị mkpa. Ọtụghe niile ndịa nyere Josef Smit ikike—ma nye Ndịisi niile nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị sochiri ya—ka eji kpọkọta Izrel n’ofe abụọ nke akwa mgbochi, iji gọzie ụmụ ọgbụgba ndụ niile jiri ngọzi niile nke Ebreham, iji debe nrachi akwadoro n’elu emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụaja, ma iji rachikọta ezinụlọ niile ebighị ebi. Ike nke ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja enweghi ọgwụgwụ ma ha dị egwu.

Tulee otu ndụ gị naara ịdị iche ma ọ bụrụ na eweghachighi ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja n’ụwa.14 Ma ọbụghị ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, ị gaghị enwete onyinye dị nsọ gị site na ike nke Chineke.15 Ma ọbụghị ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, Nzukọ nsọ nke a naara ị na-eje ozi nanị dịka otù nwere nkuzi pụrụ iche na nke n’ahụ maka ọdịmma mmadụ ma enweghi ihe ọzọ. Ma ọbụghị ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, enweghi onye niime anyị naara ịnwe ohere inwete emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị mkpa nke na-ekechikọta anyị nye ndị anyị hụrụ n’anya ebighị ebi ma kwee k’anyị bie ndụ ebighị ebi n’ihu Chineke.

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-egosi ịdị iche nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a site n’otù ọzọ nọ n’ụwa. Ọtụtụ otù ndị ọzọ nwere ike ma na-eme ka ndụ gị n’ụwa anụ ahụ nke a dịtụ mma karịa. Mana enweghi otù ọzọ nwere ike ma ga-eme mmetụta nye ndụ gị mgbe ọnwụ gasịrị.16

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-enye anyị ikikere iji gbatịa ngọzi niile ahụ ekwere Ebreham na nkwa ruoro nwoke na nwanyị ọbụla na-edebe ọgbụgba ndụ. Ọrụ nke tempụl na-eme ka ngọzi niile ndịa dị ịtụnanya dịịrị ụmụ niile nke Chineke, nagbanyeghi ebe ma ọ bụ n’oge ha bibuuru ma ọ bụ bi ugbua. Ka anyị n̄ụrịa ọn̄ụ na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja nọ ọzọ n’ụwa!

A na m akpọku gị ka ịkpachara anya tule okwu atọ ndịa:

  1. Mkpọkọta nke Izrel bụ ihe akaebe na Chineke hụrụ ụmụ Ya niile n’anya n’ebe ọbụla ha nọ.

  2. Ozi ọma nke Ebreham bụ ihe akaebe ọzọkwa na Chineke hụrụ ụmụ Ya niile n’anya n’ebe ọbụla ha nọ. Ọ na-akpọku ndị niile ịbịakwute Ya—“ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị; … ma ha niile dị otu ụdị n’anya Chineke.”17

  3. Ike nke nrachị bụ ihe akaebe kachasị elu maka otu Chineke siri hụ ụmụ Ya niile nọ ebe niile naanya ma chọọ ka onye ọbụla niime ha họrọ ịlaghachikwuru Ya n’ebe obibi.

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja eweghachiri site n’aka Onye amụma Joseph mere ka ọ kwee omume maka nwoke na nwanyị ọbụla na-edebe ọgbụgba ndụ rite ohere ime mmụọ nke onwe dị ịtụnanya. N’ebe a ọzọ, enwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta sitere na agụgụala dị nsọ nke Tempụl nke Kirtland.

Ekpere nraranye nke Josef Smit kpere maka Tempụl nke Kirtland bụ ihe nkuzi maka otu tempụl si enye mụ na gị ike ime mmụọ iji zute aka mgba niile nke ndụ n’ụbọchị niile nke ikpeazụ a. A na m agba gị ume ka ịmụọ ekpere ahụ, edere nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile nkeji 109. Ekpere nraranye ahụ, nke a natara site na mkpughe, na-akuzi na tempụl bụ “ụlọ nke ekpere, ụlọ nke obubu ọnụ, ụlọ nke okwukwe, ụlọ nke ọmụmụ-ihe, ụlọ nke ebube, ụlọ nke usoro, ụlọ nke Chineke”18

Ndepụta agwa niile nke a karịrị nnọọ nkọwa maka otu tempụl. Ọ bụ nkwa banyere ihe ga-eme ndị ahụ na-eje ozi ma na-efe ofufe n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Ha nwere ike tụọ anya ịnata azịza nye ekpere ha, mkpughe nke onwe, okwukwe dị nnukwu, ume, nkasị obi, mmbawanye mmụta ihe, na mbawanye ike.

Oge a nọ niime tempụl ga-enyere gị aka ka ị chee maka selestial ma nwete ọhụ nke onye ị bụ n’ezie, onye ị nwere ike ịbụ, ma ụdị ndụ ịnwere ike ịnwe ebighi ebi. Ofufe tempụl kwa mgbe ga-amụba ụzọ isi ahụta onwe gị ma ọtu isi bata nime atụmatụ magburu onwe ya nke Chineke. A na m ekwe gị nkwa ahụ.

Ekwere anyị nkwa na nime tempụl anyị nwere ike “nata uju nke Mmụọ Nsọ.”19 Cheegodi ihe nkwa nke ahụ pụtara n’usoro nke ịnwe eluigwe mepere emepe maka onye ọbụla ji obi achọsi eziokwu ike.

Akuziiri anyị na onye niile na-efe ofufe nime tempụl ga-enwe ike Chineke ya na ndị mmụọ ozi enyere iwu ị “bụrụ ndị na-eche ha nche.”20 Kedu ogo obisike gị na-eru mgbe ị matara na, dịka nwoke ma ọ bụ nwanyị nataworo onyinye dị nsọ ya, onye ejikwara na ngwa agha nke ike Chineke, ịkwesịghị izute ndụ a naanị gị? Kedụ obisike ọ na-enye gị ị mata na ndị mmụọ ozi n’ezie n’ezie ga-enyere gị aka?

N’ikpeazụ, ekwere anyị nkwa na enweghi “mgbakọ-aka nke ajọọ-omume” ga-emeri ndị ahụ na-efe ofufe n’ụlọ nke Onyenwe anyị.21

Ịghọta ugwu niile nke ime mmụọ nke kwere omume nime tempụl dị mkpa nye onye ọbụla nime anyị taa.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nke a bụ nkwa m. Enweghi ihe ga-aka enyere unu aka ijigidesi okporo igwe ahụ aka22 ma ọbụghị ife ofufe nime tempụl kwa mgbe dịka ọnọdụ niile unu kwere unu. Enweghị ihe ga-aka echekwa unu dị ka unu na-ezute ijiriji ọchịchịrị nke ụwa. Enweghi ihe ga-ebuli ịgba ama unu nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya ma ọ bụ nyere unu aka ghọta atụmatụ magburu nwe ya nke Chineke karịa. Enweghị ihe ga-akacha eme ka mmụọ unu dajụọ n’oge niile nke mgbu. Enweghi ihe ga-akaemepe eluigwe niile. Enweghi!

Tempụl bụ ọnụ ụzọ esi enwete ngọzi niile kachasị nke Chineke chekwara maka onye ọbụla niime anyị, n’ihi tempụl bụ naanị ebe n’elu ụwa anyị nwere ike ịnata ngọzi niile ahụ ekwere Ebreham na nkwa.23 Ọ bụ ya kpatara anyị ji na-eme ihe niile dị n’ike anyị, n’okpuru ntuziaka nke Onyenwe anyị, iji mee ka ngọzi niile nke tempụl rutere ndị otù niile nke Nzukọ nsọ. Yamere, ọ dị obi anyị mma ịkwupụta atụmatụ anyị nwere ịrụ otu tempụl ọhụrụ nime ebe 15 ndị a:

  • Uturoa, French Polynesia

  • Chihuahua, Mexico

  • Florianópolis, Brazil

  • Rosario, Argentina

  • Edinburgh, Scotland

  • Brisbane, Australia south area

  • Victoria, British Columbia

  • Yuma, Arizona

  • Houston, Texas south area

  • Des Moines, Iowa

  • Cincinnati, Ohio

  • Honolulu, Hawaii

  • West Jordan, Utah

  • Lehi, Utah

  • Maracaibo, Venezuela

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, A na m agba aka ebe na nke a bụ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a. Ọ nọ n’isi ya. Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Ya.

Ka anyị n̄ụrịanụ ọn̄ụ nime mweghachite nke ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, nke mere ka ọ kwe omume maka gị na mụ irite ngọzi ime mmụọ ọbụla nke anyị dị na njikere ma tozuo oke ịnata. Ana m agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.