Ọgbakọ Zuru ọha
Kpọọ oku, Adakwala
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Kpọọ oku, Adakwala

Ọ bụrụ na anyị kpọkuo Chineke, A na m agba ama na anyị agaghị adaa.

Taa Ọ ga-amasị m ibido site na ịgba ama maka ezi obi ike nime obi m na Chineke na-anụ ekpere anyị ma na-aza ha n’ụzọ ahaziri ahazi.

Nime ụwa nke na-agabiga oge ejighị n’aka, ihe mgbu, ndakpọ olileanya, na obi mgbawa, anyị nwere ike inwe mmasị ịdabere karịa n’ikike niile na mmasị nke onwe niile, yana ihe ọmụma na nchebe nke sitere n’ụwa abịa. Nke a nwere ike ime ka anyị wefee n’azụ isi mmalite nke enyemaka na nkwado nke nwere ike igbo ihe ịma aka niile nke ndụ ịnwụ anwụ a.

Foto, oyiyi
Ụlọ nta Ụlọ-ọgwụ.

E chetara m otu oge mgbe a kpọgara m n’ụlọ ọgwụ n’ihi otu ọrịa, ma ọ na-esiri m ike ihi ụra. Mgbe m gbanyụrụ ọkụ niile ma ụlọ nta ahụ wee gbaa ọchịchịrị, A hụrụ m akara na-egosipụta n’uko ụlọ n’ihu m nke kwuru, “Kpọọ oku, adakwala.” Na ịtụnanya m, echi ya a hụrụ m otu ozi ahụ ka a na-ekwughachi ya n’ọtụtụ akụkụ nke ụlọ nta ahụ.

Foto, oyiyi
Kpọọ oku, adakwala mba.

Gịnị kpatara ozi ahụ jiri dị oke mkpa? Mgbe m jụrụ nọọsụ ahụ banyere ya, ọ sịrị, “Ọ bụ iji gbochie otu ntigbu nke nwere ike ime ka mgbu ị na-enwe buwanye.

Ndụ a, site na ọdịdị ya, na-eweta nhụmiihe niile na-egbu mgbu, ụfọdụ sitere n’anụ ahụ anyị niile, ụfọdụ n’ihi adịghị ike anyị ma ọ bụ mkpagbu anyị niile, ụfọdụ n’ihi otu ndị ọzọ si eji ikike nhọrọ ha eme ihe, ma ụfọdụ n’ihi otu anyị si eji ikike nke nhọrọ eme ihe.

E nwere nkwa dị ike karịa nke Onye Nzọpụta N’onwe ya kwere mgbe O kwupụtara, “Rịọnụ, ma a ga-enye unu; chọọnụ, ma unu ga-achọta; kụọnụ,” ma ọbụ kpọọ oku, “ma a ga-emeghere unu”?1

Ekpere bụ ụzọ anyị na Nna anyị nke Eluigwe na-esi ekwurịta okwu nke na-enye anyị ohere “ịkpọ oku ma adakwala.” Agbanyeghị, enwere ọnọdụ ndị anyị nwere ike chee na a nụbeghị oku ahụ n’ihi na anyị anataghị nzaghachi ozugbo ma ọ bụ otu dị ka otu atụmanya anyị siri dị.

Nke a mgbe ụfọdụ na-eduba na nchekasị, obi ọjọọ, na ndakpọ olileanya. Mana cheta okwu okwukwe nke Nefi n’ime Onyenwe anyị mgbe o kwuru, “Olee otu ọ ga-esị ghara ịkụziri m, ka m ga-esị wuo ụgbọ mmiri?”2 Ugbu a, A jụọ m gị, olee ihe mere na Onyenwe anyị enweghị ike izi gị, na ị gaghị adaa?

Inwe obi ike na azịza niile nke Chineke pụtara ịkwere na ụzọ Ya abụghị ụzọ anyị3 ma na “ihe niile garịrị emezu n’oge ha.”4

Nkwenye nke ịmara na anyị bụ ụmụ nke Nna nke Eluigwe hụrụ anyị n’anya ma nwee obi ebere kwesịrị ịbụ ihe mkpali “ịkpọku” n’ekpere nke mmụọ site n’omume nke “ịkpe ekpere oge niile, ma na-adaghị mba; … ka omume [anyị] nwee ike bụrụ maka ọdịmma nke mkpụrụ obi [anyị] [niile].”5 Chee maka mmetụta niile nke Nna nke Eluigwe mgbe nime ekpere ọbụla anyị arịọ arịrịọ n’aha nke Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Olee ụdị ike na umeala, m kwenyere, ka a na-egosịpụta mgbe anyị mere otu a!

Akwụkwọ nsọ jupụtara na ọtụtụ ọmụmatụ nke ndị ahụ kpọkuru Chineke ka ha hara ịda. Hilaman na ndị amị ya, ka ha n’ata ahụhụ ha niile, kpọkuru Chineke, wụpụtara obi ha na ekpere. Ha natara mmasi obi ike, udo, okwukwe, na olileanya, nweta mgbamume na mkpebi siri ike ruo imezu ebum nobi ha.6

Chegodị otu Mozis gaara esi na-akpọku Chineke mgbe ọ hụrụ onwe ya n’etiti Osimiri Uhie na ndị Ijipt na-abịaru nso ibuso ya agha, ma ọ bụ Ebreham mgbe ọ na-erube isi n’iwu nke iji nwa ya nwoke Aịzik chụọ aja.

Eji m aka na onye ọbụla nime unu enweela ma ga-enwe ahụmịhe niile ebe ọkpụkpọ oku ga-abụ azịza nye adakwala.

Afọ iri atọ gara aga, ka mụ na nwunye m nọ na-akwado maka alụm di na nwunye obodo anyị na alụm di na nwunye nke tempụl, anyị nwetara oku na-agwa anyị na a kagburu alụm di na nwunye obodo n’ihi nkwụsị ọrụ. Anyị natara oku ahụ ụbọchị atọ tupu emume ahụ a haziri. Mgbe anyị gbalịsịrị ọtụtụ ugboro n’ọfịs ndị ọzọ ma na-achọtaghị ọkwa ndị dị, anyị malitere inwe nkụda mmụọ na obi abụọ na anyị nwere ike ịlụ n’ezie dịka e mere atụmatụ.

Mụ na onye m n’alụ “kpọkuru” ịwụpụ mkpụrụ obi anyị nye Chineke n’ekpere. N’ikpeazụ, otu onye gwara anyị banyere otu ọfịs dị na obere obodo dị na mpụga obodo ukwu ahụ bụ ebe otu onye anyị maara bụ onyeisi obodo. N’egbughị oge, anyị gara leta ya ma jụọ ya ma ọ ga-ekwe omume ịlụ anyị. Obi tọrọ anyị ụtọ, na o kwetara. Odeakwụkwọ ya mesiri ya ike na anyị ga-eweta otu asambodo n’obodo ukwu ahụ ma weruo dọkumentị niile tupu ehihie echi ya.

N’echi ya, anyị gara n’obere obodo ahụ ma gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ịrịọta dọkumentị anyị chọrọ. N’iju anyị anya, onye uwe ojii ahụ kwuru na ya agaghị enye anyị ya n’ihi na ọtụtụ ndị na-eto eto na-agbapụ site na ezinaụlọ ha ka ha lụọ na nzuzo n’obodo ahụ, bụ nke na-abụghị ọnọdụ anyị. Ọzọ, ụjọ na mwute dakwasịrị anyị.

E chetara m ka m si were nwayọọ kpọkuo Nna m nke Eluigwe ịgbochi ọdịda. E nwetara m mmetụta doro anya n’uche m, na-ekwu ugboro ugboro, “rekọmend tempụl, rekọmend tempụl.” E wepụtara m rekọmend tempụl m ozugbo ma nyefe ya n’aka onye uwe ojii, na mgbagwoju anya nke onye m chọrọ ịlụ.

Anyị nwere ihe ijuanya mgbe anyị nụrụ ka onye uwe ojii na-asị, “Gịnị kpatara na ị gwaghị m na ị si na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a? A mara m nzukọ nsọ gị nke ọma.” Ọ malitere ozugbo ịkwadebe dọkumentị ahụ. O juru anyị anya karịa mgbe onye uwe ojii ahụ hapụrụ steshịọn ahụ n’ekwughị ihe ọ bụla.

Nkeji iri ise gafere ma ọ lọhachiteghị. Ọ bụ 11:55 nke ụtụtụ, ma anyị nwere naanị ruo etiti ehihie ịbunye akwụkwọ ahụ niile. Na mberede ọ pụtara ya na nwa nkịta mara mma ma gwa anyị na ọ bụ onyinye agbamakwụkwọ ma nye anyị ya na dọkumentị ahụ.

Anyị gbagara ọsọ gawa n’ụlọ ọrụ nke onyeisi obodo jiri akwụkwọ na nkịta ọhụrụ anyị. Mgbe ahụ anyị hụrụ ụgbọ ala ọrụ na abịakwute anyị. A kwụsịrị m n’ihu ya. Ụgbọ ala ahụ kwụsịrị, ma anyị hụrụ onye odeakwụkwọ nime ya. Ka ọ hụrụ anyị, ọ sịrị, “ewela iwe, a gwara m unu ehihie. A ga m agarịrị ozi ọzọ.”

E wedara m onwe m ala ekwughị okwu, na-akpọku jiri obi m niile nye Nna m nke Eluigwe, na-arịọ maka enyemaka ọzọ ka m “ghara ịda.” Na mberede, ọrụ ebube ahụ mere. Onye odeakwụkwọ ahụ sịrị anyị, “Kedu ọmarịcha nkịta unu nwere. Ebe ka m nwere ike chọta otu dị ka nke a maka nwa m nwoke?

“Ọ bụ nke gị” anyị zara ozugbo.

Onye odeakwụkwọ ahụ lere anyị anya na ijuanya wee sị, “Ọ dị mma, ka anyị gaa n’ụlọ ọrụ ma mee ndokwa niile.”

Ka ụbọchị abụọ gasịrị, mụ na Caroll lụrụ n’ụzọ iwu obodo, dị ka e mere atụmatụ, ma mgbe ahụ arachiri anyị nime Tempụl Lima Peru.

N’ezie, anyị kwesịrị icheta na ịkpọku bụ okwu okwukwe na omume—okwukwe iji mata na anyị nwere Nna nke Eluigwe onye na-aza ekpere anyị niile dị ka amamihe Ya na-enweghị ngwụcha siri dị, na mgbe ahụ mee ihe kwekọrọ n’ihe anyị rịọrọ maka ya. Ikpe ekpere—ịkpọ oku—nwere ike ịbụ ihe iriba ama nke olile anya anyị. Mana ime ihe mgbe anyị kpechara ekpere bụ ihe iriba ama na okwukwe anyị dị ire—okwukwe nke anwalere n’oge niile nke mgbu, egwu, ma ọ bụ ndakpọ olileanya.

A na m atụ aro ka ị tụlee ihe ndị a na-esote:

  1. Na-eche mgbe niile maka Onyenwe anyị dị ka nhọrọ mbụ gị maka enyemaka.

  2. Kpọọ oku, adakwala. Jiri ezi obi kpọkuo Chineke n’ekpere.

  3. Mgbe i kpechara ekpere, mee ihe niile i nwere ike ime iji nweta ngọzi ndị i kpere maka ha.

  4. Weda onwe unu ala ịnara azịza ahụ na oge Ya na ụzọ Ya.

  5. Akwụsịla! Na-aga n’ihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ ka ị na-eche azịza.

Ikekwe enwere otu onye ugbu a onye, n’ihi ọnọdụ ya niile, ọ dị ya ka ha na-achọ ịda ma ga-achọ ịkpọ oku dịka Josef Smit mere mgbe o tiri, “O Chineke, o lee ebe i nọ? … “Ruo ole mgbe ka aga edebe aka gị ?”7

Ọ bụna n’ọnọdụ ndị dị otu a, jiri “ume ime mmụọ dị ọkụ ọkụ” kpee ekpere, dịka Onyeisi Nelson kuziri,8 n’ihi na a na-anụ ekpere unu mgbe niile!

Cheta abụ nke a:

Ka ị hapụrụ ụlọ nta gị n’ụtụtụ a.

Ị chetara ikpe ekpere?

Site na aha nke Kraịst, Onye Nzọpụta anyị,

Ị rịọrọ maka ebere ịhụnanya

Dịka ihe mgbochi taa?

O, lee ka ekpere si enye onye ike gwụrụ ezumike!

Ekpere ga-agbanwe abalị ka ọbụrụ ehihie.

Ya mere, mgbe ndụ na-agba ọchịchịrị ma na-atụ egwu,

Echefukwala ikpe ekpere.9

Ka anyị na-ekpe ekpere anyị nwere ike inwe mmetụta nnabata nke Nna anyị nke Eluigwe, onye ziitere Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya ka o wepụrụ anyị ibu niile, n’ihi na ọ bụrụ na anyị kpọkuo Chineke, A na m agba ama na anyị agaghị ada. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen