Ọgbakọ Zuru ọha
Kulie! Ọ Na-akpọ Gị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Kulie! Ọ Na-akpọ Gị

Ozi ọma abụghị ụzọ esi ezere aka mgba niile na nsogbu niile mana azịza nye mbawanye okwukwe anyị na ịmụta otu anyị si ejikwa ha.

Oge gara aga a jụrụ m nwunye m, “Inwere ike ị gwa m ihe mere, dị ka m nwere ike icheta, anyị enwetụbeghị ezigbote nsogbu ọbụla niime ndụ anyị?”

O lere m anya ma sị, “N’ezie. Aga m agwa gị ihe mere anyị ji enwebeghị ezigbote nsogbu ọbụla; ọ bụ niihi na ịnaghị echeta ihe!”

Azịza ya dị ọsịsọ ma nwee ọgụgụ isi mere ka m ghọta ọzọ na ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst anaghị ewepụ ihe mgbu ma ọ bụ mnwale niile, bụ ndị dị mkpa maka uto.

Ozi ọma abụghị ụzọ esi ezere aka mgba niile na nsogbu niile mana azịza nye mbawanye okwukwe anyị na ịmụta otu anyị si ejikwa ha.

E nwetere m echiche banyere eziokwu nke a ọnwa ole ma ole gara aga, mgbe m na-aga ije otu ụbọchị, ma na-otu ntabi anya anya m anaghị ahụmachakwa ụzọ, gbaa itiri, ma na-anyakọta anyakọta. Egwu tụrụ m. Emesịa, ndị dọkịnta gwara m: Ọ bụrụ na ịmaliteghị ịnata ọgwụgwọ ozugbo ozugbo, i nwere ike ikpu isi ọbụna niihe ruru izu ụka ole ma ole. Ọbụna egwu tụrụ m karịa.

Ma emesịa, ha sịrị: I nwere mkpa intravitreal injections—ọgwụ a na-agba agba niime anya—anya meghere emeghe—kwa izu ụka anọ niile, n’oge ndụ gị niile.

Nke ahụ bụ oku mkpọte na-edochaghị ahụ.

Mgbe ahụ otu ihe agbata m n’uche na-ụdị ajụjụ. A jụru m onwe m: OK! Anya nke anụ ahụ m adịghị mma, mana kedụkwa nụ maka anya nke ime mmụọ m? Ọ dị mkpa na m ga-achọ ọgwụgwọ ebe ahụ? Ma gịnị ka ọ pụtara inwe anya nke ime mmụọ na-ahụ ụzọ nke ọma?

Atụgharịrị m uche banyere akụkọ nke otu nwoke onye isi, a kpọrọ Batimọs, a kọwara niime ozi ọma Mak. Akwụkwọ nsọ sịrị, “Ma mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jizọs nke Nazareth, ọ malitere ịkpọku, ma sị, Jizọs, gị Ọkpara nke Devid, meere m ebere.”1

Enyochawa ya, naanya ọtụtụ mmadụ, Jizọs bụ nnọọ nwa nke Josef, ya mere gịnị mere Batimọs jiri kpọọ ya nwa nke Devid”? Naanị niihi na ọ kọtara na Jizọs bụ Mezaya ahụ n’ezie, onye e buru amụma ị mụ site na agbụrụ nke Devid.2

Ọ dị mmasị na nwoke onye isi nke a, onye na-enweghị anya eji ahụ ụzọ na anụ ahụ, kọtara Jizọs. Ọ hụrụ niime mmụọ ihe na ọ pụghị ịhụ na anụ ahụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwere ike ịhụ Jizọs na anụ ahụ, mana kpuchara isi kpam kpam niime mmụọ.

Site na akụkọ nke a anyị na-amụtakwu ihe gbasara anya ịhụ ụzọ nke ime mmụọ.

Anyị na-agụ, “Ma ọtụtụ sịrị ya gbachi nkịtị: mana o tisikwuru mkpu ike, Gị Ọkpara nke Devid, meere m ebere.”3

Ndị niile gbara ya gburugburu naara agwa ya mechie ọnụ, mana o tisikwararịị mkpu ike niihi na ọ maara onye Jizọs bụ n’ezie. Ọ gbachiri olu ndị ahụ nkịtị ma tisiekwa mkpu ike karịa.

O mere ihe kama ichere ka emee ihe n’elu ya. Na-agbanyeghị ọnọdụ ya na-ezuchaghị oke, o jiri okwukwe ya gaa karịa ka o nwere ike.

Ya mere, ụkpụrụ nke mbụ anyị na-amụta bụ anyị na-edobe anya ịhụ ụzọ nke ime mmụọ mgbe anyị lekwasịrị anya na Jizọs Kraịst ma na-anọgide n’eziokwu nye ihe anyị maara ị bụ eziokwu.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, idobe anya nke ime mmụọ anyị n’okpurukpu, anyị kwesịrị ikpebi ịhapụ ịńa ntị n’olu niile nke ndị ụwa nọ anyị gburugburu. N’ụwa nke a na-agbagwoju anya ma gbagwujuo anya, anyị ahaghị ikwesị ntụkwasị obi na ihe anyị maara, kwesị ntụkwasị obi na ọgbụgba ndụ anyị niile, ma na-akwadokwa nkwenye anyị ọzọ, ọbụna sie ike karịa, dị ka nwoke a mere. Anyị kwesịkwara itisi mkpu ike ọbụna daa ụda karịa ama anyị banyere Onyenwe anyị nye ụwa. Nwoke nke a maara Jizọs, nọgidere ikwesi ntụkwasị obi nye ihe o kwenyere, ma nweghị mmeghari anya site n’olu ndị gbara ya gburugburu.

Enwere ọtụtụ olu taa na-anwa iwedata olu anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Olu nke ndị ụwa na-agba mbọ imechi anyị ọnụ, mana nke ahụ bụ kpọm kwem ihe mere anyị ji gaghị ahapụ ịma ọkwa ama anyị banyere Onye Nzọpụta ịda ụda karịa ma sie ike karịa. N’etiti olu niile nke ndị n’ụwa, Onyenwe anyị na-elekwasị mụ na gị anya ikwupụta ama anyị, iwelite olu anyị, na ịghọ olu Ya. Ọbụrụ na anyị emeghị ya, onye ga-agba ama banyere Jizọs Kraịst? Onye ga-ekwu aha Ya, ma maa ọkwa ozi Ya dị nsọ?

Anyị nwere ọrụ nke ime mmụọ na-abịa site na mmata ihe anyị banyere Jizọs Kraịst.

Mana gịnị ka Batimọs mere mgbe nke ahụ gasịrị?

Mgbe Onyenwe anyị nyere iwu ikuli, o mere ihe ọzọ n’okwukwe.

Akwụkwọ nsọ sịrị, “Ma ya, na-etufu uwe ya, kuliri, ma bịakwute Jizọs.”4

Nwoke a dị umeala ma kwesị ntụkwasị obi ghọtara na o nwere ike ikuli nwee ndụ dị mma karịa site n’iwu nke Jizọs nyere. Ọ maara na ọ dị mma karịa ọnọdụ ya niile, ma ihe mbụ a maara o mere mgbe ọ nụrụ ka Jizọs na-akpọ ya bụ itufu uwe mwụda nke onye arịrịọ ya.

Ọzọkwa, o mere ihe kama ichere ka emee ihe n’elu ya.

O nweburu ike chee, “Achọzighị m nke a ọzọ, ugbu a Jizọs bataworo na ndụ m. Nke a bụ ụbọchị ọhụrụ. Ike ụwa ahụhụ nke a agwụwo m. Site na Jizọs e nwere m ike ịmalite ndụ ọhụrụ nke ańụrị na ọńụ niime Ya, mụ na Ya, ma site na Ya. Ọ gbasaghị m ihe ndị ụwa na-eche banyere m. Jizọs na-akpọ m, ma Ọ ga-enyere m aka bịe ndụ ọhụrụ.”

Olee mgbanwe dị ịrịba ama ka nke a!

Dị ka o tufuru uwe mwụda nke onye arịrịọ ya, ọ hapụkwara inye ọsịsa niile iji gbanahụ ụta.

Ma nke a bụ ụkpụrụ nke abụọ—Anyị na-edobe anya ihuzi ụzọ nke ime mmụọ mgbe anyị hapụrụ mmadụ anụ ahụ na-azụ, chegharịa, ma malite ndụ ọhụrụ niime Kraịst.

Ụzọ esi eme ya bụ site na-ime na idobe ọgbụgba ndụ niile iji kulie baa na ndụ dị mma karịa site na Jizọs Kraịst.

Ọ bụrụraa na anyị na-eme ihe ngọpụ iji meere onwe anyị ebere, ndo maka ọnọdụ na nsogbu anyị niile ma ndo maka ihe ọjọọ niile na-eme niime ndụ anyị ma ọbụna ndị ọjọọ niile ndị anyị na-eche na-eme anyị obi ọjọọ, anyị na-edobe uwe mwụda nke onye arịrịọ n’elu ubu anyị. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ ndị mmadụ, na mkpachara anya ma ọ bụ na ọ bụghị ya, na-emejọ anyị. Mana anyị kwesịrị ikpebi ime ihe n’okwukwe niime Kraịst site na-iwepụ uwe mwụda nke echiche na mmetụta uche nke anyị nwere ike ka na-eyi iji zoo ngọpụ niile ma ọ bụ mmehie ma tufuo ya, ebe anyị maara na O nwere ike ma ga-agwọ anyị.

Enwetụghị mgbe e nwere ngọpụ dị mma ị sị, “Adị m otu m dị niihi ọnọdụ ọjọọ na ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Ma enweghị m ike ịgbanwe, ma o ziiri m.”

Mgbe anyị chere echiche otu ahụ, anyị na-ekpebi ka e mee ihe n’isi anyị.

Anyị na-edobe uwe mwụda nke onye arịrịọ.

Ime ihe n’okwukwe pụtara ịdabere n’Onye Nzọpụta anyị, ikwere na site na Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere ike kulie gafee ihe niile, site n’inye iwu Ya.

Ụkpụrụ nke atọ nọ na mkpụrụokwu anọ nke ikpeazụ ahụ, “[Ọ] bịakwutere Jizọs.”

Olee otu ọ ga-esi agakwuru Jizọs ebe ọ bụ na o kpuru isi? Naanị ụzọ e nwere bụ ịgawa ebe Jizọs nọ site na-ịnụrụ olu Ya.

Ma nke a bụ ụkpụrụ nke atọ—Anyị na-edobe anya ihuzi ụzọ nke ime mmụọ mgbe anyị nụrụ olu nke Onyenwe anyị ma kwe Ya iduzi anyị.

Dị nnọọ ka nwoke a welitere olu ya elu karịa nke ndị nọ ya gburugburu, o nwere ike ịńa ntị n’olu nke Onyenwe anyị n’etiti olu ndị ọzọ niile.

Ọ bụkwa otu ụdị okwukwe ahụ nke nyere Pita ohere ije ije n’elu mmiri ọbụrụraa na o lekwasịrị anya nke ime mmụọ ya n’ebe Onyenwe anyị nọ ma hapụ inwe mmegheri anya site na ikuku niile nọ ya gburugburu.

Emesịa akụkọ nke nwoke a kpuru isi kwụsịrị site na mkpụrụokwu ndị a ọ natara anya ịhụ ụzọ ya, ma soro Jizọs n’ụzọ ahụ.”5

Otu niime ihe ọmụmụ kachasị mkpa niime akụkọ nke a bụ na nwoke nke a tinyere ezi okwukwe n’ọrụ niime Jizọs Kraịst ma nata otu ọrụ ebube niihi na ọ rịọrọ n’ezi nzube, ezi nzube nke isoro Ya.

Ma nke a bụ isi ihe mere anyị ji na-anata ngọzi niile anyị na-anata na ndụ anyị, nke bụ isoro Jizọs Kraịst. Ọ bụ gbasara ịmata Ya, ime na idobe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke niihi Ya, ịgbanwe eke ahụ e jiri mara anyị site na Ya, na ịnagide ruo ọgwụgwụ site na isoro Ya.

Ebe m nọ, idobe anya ịhụ ụzọ nke ime mmụọ bụ ihe niile gbasara ilekwasị anya na Jizọs Kraịst.

Ya mere, anya ịhụ ụzọ nke ime mmụọ m ọ na-ahụzi ụzọ nke ọma, dị ka m na enweta ndụdụ ọgwụ anya m niile? Ọdịmma, Onye ka m bụ ikwu? Mana obi juru m n’ekele maka ihe m na-ahụ.

Ana m ahụta nke ọma aka nke Onyenwe anyị niime ọrụ nke a dị nsọ niime ndụ m.

Ana m ahụ okwukwe nke ọtụtụ ndị ebe ọbụla m na-aga, onye nke na-agba okwukwe nke m ume.

Ana m ahụ ndị mmụọ ozi niile gbara m gburugburu.

Ana m ahụ okwukwe nke ọtụtụ ndị na-anaghị ahụ Onyenwe anyị na-anụ ahụ mana na-amata Ya niime mmụọ, niihi na ha ma Ya na-ime ime obi ha.

Ana m agba ama na ozi ọma ahụ bụ azịza maka ihe niile, niihi na Jizọs Kraist bụ azịza maka mmadụ niile. Obi juru m n’ekele maka ihe m nwere ike ịhụ dị ka m na-eso Onye Nzọpụta m.

Ana m ekwe nkwa na dị ka anyị na-anụ olu nke Onyenwe anyị ma kwere Ya ka ọ na-edu anyị n’okporo ụzọ ọgbụgba ndụ nke Onye Nzọpụta, anyị ga-enweta ngọzi site na-ihuzi ụzọ nke ọma, inwe nghọta nke ime mmụọ, na udo nke mkpụrụ obi na n’uche oge ndụ anyị niile.

Ka anyị tisie ama anyị banyere Ya ike, daa ụda karịa olu ndị gbara anyị gburugburu, niime ụwa nke kwesịrị ịnụ karịa banyere Jizọs Kraịst ma enweghị ihe ọzọ. Ka anyị wepụ uwe mwụda nke onye arịrịọ ahụ nke ga-eme ka anyị wee nwee kwa ike yiri, ma kulie gafee ụwa ahụ, baa na ndụ dị mma karịa niime na site na Kraịst. Ka anyị wezuga ngọpụ niile iji ghara isoro Jizọs Kraịst ma chọta ihe niile dị mma iji soro Ya, dị ka anyị na-anụ olu Ya. Nke a bụ ekpere m, n’aha Jizọs Kraịst, amen.