Ọgbakọ Zuru ọha
Ikwesị Ntụkwasị obi ruo Ọgwụgwụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ikwesị Ntụkwasị obi ruo Ọgwụgwụ

Site na aka Ya, unu ga-enwe ike akwada Golayat ọbụla nke pụtara na ndụ unu.

Ezi ndị enyi nta, taa ọ ga-amasị m ịgwa unu okwu—ndị ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ.

Ọ ruwo otu afọ kemgbe akpọrọ Otu Ndịisi Zuru ọha nke Ndịiyom Nta. Ihe ole meworo niime afọ nke a gara aga!

Anyị ezutewo ọtụtụ niime unu ma amụkọtawo nkuzi niile nke Kraịst ọnụ. Anyị agụwo egwu niile, nwete ndị enyi ọhụrụ, ma soro unu jee ozi niime obodo anyị niile. Agbawo anyị ume site n’ịge ntị nye ama unu n’ọgbakọ ndị ntoroọbịa niile na mmemme niile nke ụwa. Ma anyị efekọtawo ofufe ọnụ n’ụlọ nke Onyenwe anyị.

Oge ọbụla anyị ekesawo ozi sitere n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Na-abalị a agaghị adị iche; e nwere m ozi maka unu, ndị ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

Nnukwu Ajụjụ niile

Enwewo mgbe i chere otu i nwere ike i si kwesị ntụkawsị obi nye Chineke mgbe i bi n’ụwa mmehie? Kedụ ebe i si enwete ume iji gaaniihu na esepụghị aka na-ime ihe ọma? Kedụ otu i si enwete nhụmiihe ezi ọńụ?

E chere m na nhụmiihe nke Devid na Golayat1 pụrụ inye aka.

Devid na Golayat

Niime Testamentị Ochie, otu ndị agha nke Ndị Filipi nọ na-agha ha na Ndị Israel, ma ụtụtụ ọbụla na abalị ọbụla, nnukwu mmadụ onye Filipi akpọrọ Golayat mara aka sị onye Israel nke ọbụla lụso ya ọgụ.

Foto, oyiyi
Devid na Golayat

N’etiti ndị Israel ka Devid dị, onye ọzụzụ atụrụ nta dị obere karịa Golayat mana nwee nnukwu okwukwe niime Jizọs Kraịst! Devid wepụtara onwe ya ịlụ ọgụ. Ọbụna eze ahụ gbalịrị ịkwapụ obi ya, mana Devid họọrọ itinye ntụkwasị obi ya niime Jizọs Kraịst.

Mgbe gara aga, Devid alụsowo ọdụm na nnukwu anụọhịa ọgụ. Site na nhụmiihe nke onwe ya, ọ maara na Chineke echekwawo ya ma mee ya onye mmeri. Nye Devid, ọrụ nke Chineke bụ ọrụ nke kachasị mkpa. Ya mere, ijuputa n’okwukwe niime Chineke onye na-agaghị ajụ ya, ọ tụtụkọtara nkume ise dị larịị, wepụta ụta ya, ma gaa iche nnukwu mmadụ ahụ aka ọgụ.

Foto, oyiyi
Okwute ise ne Devid.

Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị na nkume nke mbụ Devid tụrụ kụrụ ezi ihu nke Golayat, kwụsị ndụ ya.2

Ịchọgharị maka Azịza

Ebe Devid jiri naanị otu nkume iji gbuo Golayat, o jiri ise ji kwadoo. Jiri ise! Nke a na-eme m iche maka otu m si akwado onwe m izute ụwa.

Asịkwanụ na nkume ọbụla nke Devid nọchitere otu ike anyị ga-achọ iji nwee mmeri na ndụ anyị? Gịnị ka nkume ise ndị ahụ ga-abụ? E chere m maka ihe ndị a kwere omume:

  1. Nkume nke ịhụnaanya m maka Chineke.

  2. Nkume nke okwukwe m niime Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.

  3. Nkume nke mmata ihe nke ezigbo njirimara m.

  4. Nkume nke nchegharị m kwa ụbọchị.

  5. Nkume nke ohere m ruo ike nke Chineke.

Ka anyị kwuo banyere otu esiworo gọzie anyị site n’ike ndị a.

Nke mbụ, nkume nke ịhụnaanya m maka Chineke. Ịhụ Chineke naanya bụ iwu nsọ nke mbụ dị ukwuu.3 Akwụkwọ ntuziaka Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa na-akuziri anyị: Chineke hụrụ gị naanya. Ọ bụ Nna gị. Ịhụnaanya Ya zuru oke nwere ike ịkpate mmụọ gị ịhụ Ya naanya. Mgbe ịhụnaanya gị maka Nna nke Eluigwe bụ ike mmetụta kachasị mkpa na ndụ gị, ọtụtụ mkpebi na-adịzị mfe karịa.”4

Ịhụnaanya anyị maka Chineke na mmekọrịta anyị na Ya chiri anya nyere anyị ike anyị na-achọ iji gbanwee obi anyị ma dịrịzie mfe imeri aka mgba anyị.

Nke abụọ, nkume nke okwukwe m niime Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Mgbe Jizọs Kraịst bịara nụwa, Ọ tara ahụhụ maka mmehie anyị niile,5 ma wekwasị onwe Ya iru uju anyị, mgbu anyị, adịghị ike anyị niile, na ọrịa anụ ahụ na nke uche. Nke ahụ bụ ihe mere O jiri mara otu e si enyere anyị aka. Inwe okwukwe niime Jizọs Kraịst pụtara ịtụkwasị obi kpamkpam na amamiihe Ya, oge Ya, ịhụnaanya Ya, na ike Ya iji gbaa aja mgbaghara mmehie maka mmehie anyị niile. nkume nke okwukwe niime Jizọs Kraịst ga-emeri “nnukwu ihe” ọbụla niime ndụ anyị.6 Anyị nwere ike imeri ụwa nke a dara ada niihi na O meriri ya na mbụ.7

Nke atọ, nkume nke mmata ihe nke ezigbo njirimara m. Onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, kuziiri anyị na njirimara anyị ndị kachasị dị mkpa bụ dị ka ụmụ Chineke, ụmụ ọgbụgba ndụ, na ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.8

Ihe niile na-agbanwe mgbe m maara onye m bụ n’ezie.9 Mgbe m na-enwe obi abụọ n’ike m niile, ana m agwagharịkarị onwe m niime obi m ma ọ bụ ikwuputa ekwuputa, “a bụ m nwaada Chineke, a bụ m nwaada Chineke,” ka ha ra bụ ọtụtụ mgbe m nwere mkpa ya tutu ruo mụ enwetekwa obisike ọzọ ịganiihu.

Nke anọ, nkume nke nchegharị m kwa ụbọchị. Niime akwụkwọ ntuziaka Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa anyị na-agụ: “Nchegharị abụghị ntaram ahụhụ maka mmehie; ọ bụ ụzọ nke Onye Nzọpụta si atọghapụ anyị site na mmehie. Ichegharị pụtara ịgbanwe―ịtụgharị site na mmehie ma chee ihu na Chineke. Ọ pụtara imelite ma nata mgbaghara. Ụdị mgbanwe nke a abụghị ihe na-eme otu ugboro; ọ bụ usoro na-aganiihu.”10

Ọ dịghị ihe kacha enye mnwere onwe karịa mmetụta mgbaghara nke Chineke na ịmara na anyị dị ọcha ma kpezie anyị na Ya. Mgbaghara kwere omume maka onye niile.

Nkume nke ise bụ nkume nke ohere m ruo ike nke Chineke. Ọgbụgba ndụ ndị anyị na Chineke na-eme, dị ka ndị ahụ anyị na-eme n’emume nsọ nke baptizim, na-enye anyị ohere ruo nike nke iyi Chineke.11 Ike Chineke bụ ezigbo ike nke na-enyere anyị aka zute aka mgba niile, mee mkpebi ndị dị mma, ma mụbanye ike anyị ịnagide ọnọdụ ndị siri ike. Ọ bụ ike nke site na ya anyị pụrụ ito n’ike kpọmkwem anyị ndị dị anyị mkpa.12

Akwụkwọ ntuziaka Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa na-akọwa: “Ọgbụgba ndụ niile na-ejikọ gị nye Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta. Ha na-abawanye ike nke Chineke niime ndụ gị.”13

Ka anyị kwuo okwu banyere njikọ ahụ. Chetakwa mgbe Kraịst kuziri ndịiche dị n’etiti otu ụlọ arụrụ n’elu nkume na nke arụrụ nelu aja?14 Okenye Dieter F. Uchtdorf kọwara: “Ụlọ anaghị anya ndụ n’oke ifufe niihi na ụlọ ahụ siri ike. Ọ naghịkwa anya ndụ naanị n’ihi na oke nkume ahụ siri ike. Ụlọ ahụ na-alanarị oke ifufe n’ihi na ejikọtasiri ya ike na nkume ahụ siri ike. Ọ bụ ike nke njikọ na nkume ahụ bụ ihe dị mkpa.”15

Foto, oyiyi
Ụlọ ewuru n’elu oke nkume.

Njikọ nke onwe anyị nye Jizọs Kraịst ga-enye anyị ume na obisike ịganiihu n’etiti ndị na-anaghị akwanyere nkwenye anyị ugwu ma ọ bụ ndị na-emegbu anyị. Kraịst na-akpọku anyị idebe Ya niime echiche anyị mgbe niile; Ọ na-agwa anyị, “Lekwasị m anya niime echiche niile.”16 Ị na-eche banyere Onye Nzọpụta na-enye anyị idoanya nke obi iji mee mkpebi niile, ime ihe na-atụghị egwu, na ịsị mba nye ihe megidere nkuzi niile nke Chineke.17 Mgbe ụbọchị m siri ike ma ya adị m ka enweghị m ike ịnagide ọzọ, ị na-eche banyere Kraịst na-ewetere m udo ma na-enye m olileanya.

Kedụ otu anyị nwere ike ị sị ewekwasị ike nke a nke Jizọs Kraịst? Ị na-erubere ọgbụgba ndụ niile isi na ịbawanye okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst bụ ihe dị mkpa.

N’ezie ọ dị m ka Devid enwere nnọọ otu nkume ọzọ; nke ga-abụ nkume nke ama m. Ama anyị ka ewuru site na nhụmiihe niile nke ime mmụọ nke onwe nke anyị na-mata ike mmetụta sinachi niime ndụ anyị.18 Ọ dịghị onye pụrụ iwepụ mmata ihe ahụ n’aka anyị. Ịmata ihe anyị ma nke sitere na ibi ndụ nhụmiihe ime mmụọ anyị enweghị ọnụ ahịa. Ịdị eziokwu nye mmata ihe ahụ na-enye anyị mnwere onwe. Ọ na-enye anyị ọńụ! Ọ bụrụ na anyị hụ eziokwu naanya, anyị ga-achọ ya, ma ozugbo anyị chọtara ya, anyị ga-echebe ya.19

Ịkpọ oku

Dị ka nnọọ m họọrọ nkume nke isi, ana m akpọku unu izute na klas unu, kworum, ma ọ bụ ezi na ụlọ ma chee banyere ike ndị ọzọ unu ga-achọ inwete iji nọgịde ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma, ya mere, merie ụwa.

Nkwa

Ezi ndị enyi, ọ na-anụ Kraịst ọkụ n’obi isoro anyị na njem nke ndụ anyị. Ana m ekwe unu nkwa, dị ka unu na-ejigide aka n’okporo igwe ahụ, unu ga-eje ije aka na aka unu na Jizọs Kraịst.20 ga na-edu unu, ma ga na-akuziri unu ihe.21 Site na aka Ya, unu ga-enwe ike akwada Golayat ọbụla nke pụtara na ndụ unu.

Ama

Ana m agba ama na enwere ọńụ n’ikpe ekpere ụbọchị niile, n’ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile, n’iri oriri nsọ Sọnde niile, na n’ịga semịnarị—ọbụna n’isi ụtụtụ! E nwere ọńụ na ime ihe dị mma.

E nwere ọńụ na ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke nke eluigwe na ala, Onye Nzọpụta nke ụwa, Eze ndị Eze. E nwere ọńụ n’ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Chineke bụ Nna anyị. Ọ maara ọchịchọ nniile nke obi anyị na ihe ndị kwere gị omume, ma Ọ tụkwasịrị gị obi.

Ezi ndị ntoroọbịa, Jizọs Kraịst ga-enyere unu aka kwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. N’eziokwu ndị a ka m na-agba ama m n’aha Jizọs Kraịst, amen.