Ọgbakọ Zuru ọha
Ntụkwasị Obi nke Ọgbụgba ndụ site n’aka Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ntụkwasị Obi nke Ọgbụgba ndụ site n’aka Jizọs Kraịst

Mgbe anyị banyere n’ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-amalite njem dị nsọ nke ịmụta iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst dị elu na dị nsọ.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, A na m ekpe ekpere ka emegharịa anyị ịdị ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ site na ozi niile anyị ga-anụ n’ọnụ ndị isi anyị na ngwụcha izu ụka a ma ńụrịa ọńụ n’ihe m hụrụ n’anya ịkpọ “ntụkwasị obi nke ọgbụgba ndụ site n’aka Jizọs Kraịst.” Ntụkwasị obi nke a bụ nke dị jụụ ma bụrụ ihe mmesi obi ike nke ịnata ngọzi niile nke Chineke kwere nkwa maka ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha ma dị mkpa n’ime ọnọdụ ndị siri ike nke ụbọchị anyị.

Owuwu nke ụlọ ọhụrụ niile nke Onyenwe anyị n’ofe ụwa nokpuru nduzi mmụọ nsọ nke Onyeisi Russell M. Nelson, ebutela ọńụ dị ukwuu n’etiti ndị otu Nzukọ nsọ ma na-eje ozi dịka ihe nnọchianya dị mkpa nke mgbasawanye nke ala-eze nke Onyenwe anyị.

Na-ịtụgharị uche n’ahụmihe dị egwu m nwere na nraranye nke Tempụl Feather River California n’ọnwa Ọktoba gara aga, E cheburu m ma mgbe ụfọdụ anyị na-efunarị n’ime obi ụtọ nke inwe tempụl ọhụrụ niile nime obodo anyị niile ma na-eleghara ebumnuche nke ọgbụgba ndụ niile dị nsọ emere n’ime tempụl ahụ.

Akanyere nihu tempụl ọ bụla bụ okwu dị nsọ: “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị.”1 Okwu niile ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ bụ ihe nrịbama doro anya na mgbe anyị banyere n’ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-amalite njem dị nsọ nke ịmụta iji bụrụ ndị na-eso Kraịst dị elu na dị nsọ. Ka anyị na-eme ọgbụgba ndụ dị nsọ n’ihu Chineke ma na-agba mbọ ịsoro Onye Nzọpụta, anyị na-anata ike ịgbanwe obi anyị, mee ka mmụọ anyị dị ọhụrụ, na ime ka mmekọrịta anyị na Ya dịkwuo elu. Mgbalị dị otu ahụ na-ewetara mkpụrụ obi anyị niile nsọ ma mee ka anyị na Chineke na Jizọs Kraịst nwee njikọ dị nsọ, onye kwere nkwa na anyị nwere ike iketa onyinye nke ndụ ebighị ebi.2 Nsonaazụ nke njem a dị nsọ bụ na anyị ga-enweta ntụkwasị obi dị nsọ na nkwanye ugwu dị elu maka ndụ anyị kwa ụbọchị n’ime ọgbụgba ndụ anyị mere site na Jizọs Kraịst.

Ntụkwasị obi dị otu ahụ bụ ogo kasị elu nke njikọ dị nsọ anyị na Chineke ma nwere ike ịnyere anyị aka ịbawanye nraranye anyị na ekele maka Jizọs Kraịst na aja mgbapụta Ya. Ọ na-ewusi anyị ike ịhụ ndị ọzọ n’anya na ijere ha ozi, ma na-ewusi mkpụrụ obi anyị niile ike ibi n’ime ụwa adịghị nsọ nke na-agbawanye n’ọchịchịrị ma na-akụda mmụọ. Ọ na-enye anyị ike ịmeri mkpụrụ niile nke obi abụọ na obi nkoropụ, egwu na obi ntakasị, obi mgbawa na enweghị olileanya nke onye iro na-anwa ịbanye n’ime obi anyị niile, karịsịa mgbe ndụ siri ike, ọnwụnwa dị ogologo, ma ọ bụ ọnọdụ niile siri ike. Otu amaokwu akwụkwọ nsọ na-enye onye ọ bụla n’ime anyị ezigbo ndụmọdụ ka anyị na-adabere na ifufe siri ike nke ihe ịma aka niile nke ụwa taa: “Ya mere unu atụfula ntụkwasị obi unu.”3

Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị, ndị ahụ na-enweta ezigbo ntụkwasị obi n’ime ọgbụgba ndụ niile ndị e mere n’ụlọ nke Onyenwe anyị site n’aka Jizọs Kraịst nwere otu n’ime ike niile kachasị ike anyị nwere ike ịnweta n’ime ndụ nke a.

Dị ka anyị mụrụla Akwụkwọ nke Mọmọn n’ime Bịa, Soro M n’afọ a, anyị ahụwo ka Nefi siri bụrụ ọmarịcha ihe nlere anya maka ike nke ụdị ntụkwasị obi ọgbụgba ndụ a site na-ikwesị ntụkwasị obi ya mgbe o zutere ihe ndọghachi azụ na ihe ịma aka niile dị ka inweta epekele niile dịka Onyenwe anyị nyere n’iwu. Nefi, n’agbanyeghị na ọ na-ewute ya nke ukwuu n’ihi egwu na enweghị okwukwe nke Laman na Lemuel, nọgidere na obi siri ya ike na Onyenwe anyị ga-enyefe ha epekele niile ahụ. O gwara ụmụnne ya ndị nwoke, “Ebe Onye-nwe na-adị ndụ, anyị onwe-anyị na-adị kwa, anyị agaghị alaghachịkwuga nna anyị n’ime ọzara ahụ wee ruo mgbe anyị mezuworo ihe nke Onye-nwe ziworo anyị mee.”4 N’ihi na Nefi nwere ntụkwasị obi na nkwa niile nke Onyenwe anyị, ọ nwere ike mezuo ihe e nyere ya n’iwu ka o mee.5 Mgbe e mesịrị, n’ọhụ ya, Nefi hụrụ mmetụta nke ụdị obi ike a, na-ede, “Mụ, Nefi, hụrụ ike nke Nwa atụrụ nke Chineke, na ọ dakwasịrị n’elu ndị nsọ nke nzukọ nsọ nke Nwa-atụrụ, ma n’elu ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, … ma ngwa-ọgụ ha ji bụ ezi omume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto.”6

A hụla m n’onwe m nkwa niile na ike nke Onyenwe anyị na-eruba n’ime ndụ ụmụ nke Chineke, na-agba ha ume ichebịrị akamgba niile nke ndụ ha. N’ụbọchị nke ọzọ nwunye m lọtara n’ụlọ mgbe o fechara ofufe n’ime tempụl ma gwa m otu ihe ahụ o nwetara n’ebe ahụ si metụ ya n’ahụ. Dịka o banyere n’ụlọ nke Onyenwe anyị, ọ hụrụ otu nwoke n’oche nkwaghari ka ọ na-aga nwayọ nwayọ na otu nwanyị n’eje ije jiri mkpara ya, ha abụọ jiri obi ike na-abịa ife Onyenwe anyị ofufe n’ime ụlọ Ya. Dịka nwunye m na-abanye na mpaghara nkwado, ọ hụrụ nwanne nwanyị dị ụtọ onye otu ogwe aka na-efunahụ—ma nwee naanị akụkụ nke ogwe aka ọzọ—na-arụ ọrụ ọ bụla enyere ya nke ọma jiri obi selestial.

Dịka mụ na nwunye m kparịtara ụka gbasara nhụmihe ahụ, anyị kwekọrịtara na ọbụ naanị ezigbo ntukwasị obi si n’obi nime nkwa niile nke ebighị ebi Chineke na-enye site na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anyị na Ya mere n’ime ụlọ Ya nwere ike ime ndị ahụ na-eso ụzọ nke Kraịst ịhapụ ebe obibi ha niile n’ụbọchị oyi ahụ, agbanyeghị ọnọdụ onwe niile nke ndụ ha.

Ndị ezigbo enyi m, ọ bụrụ na onwere otu ihe anyị nwere ike inwe—na otu ihe anyị nwere ike ịnyefe ụmụ na ụmụụmụ anyị ga enwe ike nyere onye ọ bụla niime ha aka n’ime mnwale na onwụnwa niile nọ n’ihu—ọ ga-abụ ntụkwasị obi nime ọgbụgba ndụ niile e mere site na Jizọs Kraịst. Ị nweta ụdị onwunwe dị nsọ otu ahụ ga-enyere ha aka ibi ndụ dị ka Onyenwe anyị kwere ụmụazụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi na nkwa: “Ndị na-eso ụzọ m niile ga-eguzoro n’ebe nsọ niile, ma agaghị akwagharị ha.”7

Olee otu anyị si enweta ntụkwasị obi dị otu a site na Jizọs Kraịst? Ọ na-abịa site n’ịdị umeala n’obi, na-etinye ndụ anyị n’ebe Onye Nzọpụta nọ, ibi ndụ site n’ụkpụrụ niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, na-anata emume nsọ nke nzọpụta na mbuli elu, na ịsọpụrụ ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke na-agba n’ụlọ nsọ Ya.

N’okwu mmechi ya na ọgbakọ zuru ọha nke Ọktoba 2019, ezigbo onye amụma anyị chetara anyị maka otu nzọụkwụ dị mkpa na-inweta ntụkwasị obi ọgbụgba ndụ, na-asị: “Itozu oke n’otu n’otu ịbanye n’ụlọ nke Onyenwe anyị chọrọ nkwado nke mmụọ n’otu n’otu. … Ntozu oke nke onye ọbụla na-achọ mgbanwe zuru ezu nke uche na obi ịdịrịzi karịa dị ka Onyenwe anyị, ị bụ amaala kwụwara aka ya ọtọ, ị bụ ọmụmatụ dị mma karịa, na ị bụkwa onye dị nsọ karịa.”8 Ya mere, ọ bụrụ na anyị agbanwe nkwadobe anyị ị banye n’ime tempụl, anyị ga-agbanwe ahụmihe anyị n’ime tempụl, nke ga-agbanwe ndụ anyị niile n’ezi tempụl. “ Mgbe ahụ ka nchekwube gị ga-esi ike karịa n’ihụ Chineke; ma ozizi nke ọkwa nchụ-aja ga-atasa na mkpụrụ obi gị dịka igirigi site n’elu-igwe”9

Otu bishọp m maara na-akpọ klass kacha ochie n’ime Praịmarị ọbụghị dịka klass “Praịmarị” kama dịka klass “nkwadebe tempụl”. N’ime ọnwa Jenụarị bishọp ahụ mere ka ndị otù klass ahụ na ndị nkuzi ha bịa n’ụlọ ọrụ ya ebe ha na-ekwu maka otu ha ga-esi jiri afọ ahụ kwado ịbanye na tempụl. Bishọp ahụ na-ewe oge iji jụọ ajụjụ ọnụ niile nke rekọmend tempụl dị mkpa, bụ ndị a na-agụnye n’ihe ọmụmụ ha niile na Praịmarị. Ọ na-akpọ ụmụntakịrị ka ha nọrọ na njikere nke ga-eme na mgbe ha bịarutere n’ụlọ ọrụ bishọp n’ime otu afọ, ha ga-enwe ntụkwasị obi, ntụkwasị obi ọgbụgba ndụ, dị njikere ịnata rekọmend tempụl ma banye n’ụlọ nke Onyenwe anyị. N’afọ a bishọp ahụ nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị nwere oke mmasị, dị njikere, ma nwee ntụkwasị obi ịga tempụl nke na ha chọrọ ka bishọp bipụta rekọmend tempụl ha na Ụbọchị mbụ Afọ Ọhụrụ na elekere 12:01 a.m.

Nkwadebe abụghị naanị maka ndị na-aga tempụl maka oge mbụ. Anyị niile kwesịrị ịdị na-akwado mgbe niile ịga n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Otu stek m maara anabatawo isiokwu nke a dị ka ejirimara ha “Nke dabere n’ebe obibi, Nke Nzukọ nsọ kwadoro, ma na-agarịrị tempụl.” Na-agarịrị10 bụ okwu na-adọrọ mmasị n’ihi ọ pụtara ilekwasị anya na otu ebe, mana ọ pụtakwara akpọgidere ya ma ọ bụ chekwaa ya, ekpebiri, ma kpebisie ike, n’ezie. Ya mere ịbụ ndị jikere ịga tempụl na-eme ka anyị soro Onye Nzọpụta, na-enye anyị ezi ntụzịaka na nkwụsị ike nke ọma ma na-ahụ n’anyị nwere ntụkwasị obi nke ọgbụgba ndụ site n’aka Jizọs Kraịst. Ya mere, anyị niile kwesịrị ịma ụma kwalite njide dị otu ahụ site n’ime nhazi oge ọzọ anyị na Onyenwe anyị ga-anọ na ụlọ nsọ Ya, ma tempụl ahụ ọ dị nso ma ọ bụ n’ebe dị anya.11

Onye amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, n’echetara anyị ụkpụrụ ndị a dị mkpa site na-ikwu: “Tempụl ahụ dị n’etiti nke ịgba okwukwe na obisike ime mmụọ anyị ume n’ihi na Onye Nzọpụta na ozizi Ya bụ kpọmkwem obi nke tempụl. Ihe niile a n’akụzi nime tempụl, site na nkuzi ma site na mmụọ, n’eme ka nghọta anyị na Jịzọs Kraịst bawaanye. Emume nsọ Ya niile nke dị mkpa n’ekekọta anyị na ya site na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụ aja dị nsọ. Mgbe ahụ,dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, Ọ n’enye anyị onyinye ike ọgwụgwọ Ya nke na-agba ume. Ma o, otu anyị ga-esi achọ ike Ya n’ime ụbọchị ndị dị n’ihu.”12

Onye Nzọpụta chọrọ ka anyị dị na njikere ị ghọta, n’ụzọ doro anya, kpọm kwem otu anyị ga-esi mee omume dị ka anyị na Nna nke Eluigwe na-eme ọgbụgba ndụ niile n’aha Ya. Ọ chọrọ ka anyị dịrị njikere inweta ihe ugwu anyị niile, nkwa, na ọrụ dịịrị anyị niile; ka anyị dịrị njikere inwe nghọta nke mmụọ na mkpalite niile anyị chọrọ na ndụ nke a. A maara m na mgbe Onyenwe anyị hụrụ ọbụna ntakịrị mkpa nke ọchịchọ anyị ma ọ bụ mgbawa nke mbọ ezi omume na-ịdị njikere anyị itinye ndụ anyị na Ya ma n’ime emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme n’ụlọ Ya, Ọ ga-agọzi anyị, n’ụzọ Ya zuru oke, jiri ọrụ ebube niile na obi ebere niile anyị chọrọ.

Ụlọ nke Onyenwe anyị bụ ebe anyị nwere ike ịgbanwe n’ụzọ niile kacha dị elu na nke kacha dị nsọ. Ya mere, mgbe anyị na-apụ site na tempụl, agbanwere site na olile anya anyị na nkwa nke ọgbụgba ndụ niile, jiri ike nke sitere n’elu, anyị na-ewere tempụl ahụ soro anyị baa n’ebe obibi na ndụ anyị niile. A si m unu na inwe Mmụọ nke ụlọ nke Onyenwe anyị n’ime anyị na-agbanwe anyị, kpam kpam.

Anyị maara site na tempụl na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Mmụọ nke Onyenwe anyị bụrụ ihe anaghị egbochi na ndụ anyị niile, anyị enweghị ike ma ghara inwe mmetụta na-adịghị mma n’ebe onye ọ bụla nọ. Inye ọnọdụ n’ime obi anyị ma ọ bụ n’uche anyị maka mmetụta niile na-adịghị mma ma ọ bụ echiche na-adịghị mma ga-eweta okwu niile na omume ọjọọ niile, ma ọ bụ na social media ma ọ bụ n’ụlọ anyị, na-eme ka mmụọ nke Onyenwe anyị pụọ n’obi anyị. Ya mere, biko atụpụla ntụkwasị obi gị, kama, ka ntụkwasị obi gị gbasie ike.

Owuwu tempụl niile na-aga n’ihu ga-aga n’ihu na-akpali, kpalie mmụọ, ma gọzie anyị. Ma nke ka mkpa, ka anyị na-agbanwe nkwadobe anyị ịbanye nime tempụl, anyị ga-agbanwe ahụmihe anyị na tempụl, nke ga agbanwe ndụ anyị niile nezi tempụl. Ka mgbanwe a mejupụta anyị na ntụkwasị obi na ọgbụgba ndụ dị nsọ anyị na Chineke mere site na Jizọs Kraịst. Chineke dị ndụ, Jisọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị, ma nke a bụ Nzukọ nsọ Ya eweghachitere n’ụwa. A na m agba aka ebe nye eziokwu ndị a na nkwanye ugwu n’aha dị nsọ nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, amen.