Ọgbakọ Zuru ọha
Kpee Ekpere, Ọ Nọ Ebe Ahụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Kpee Ekpere, Ọ Nọ Ebe Ahụ

Ana m akpọku unu ikpe ekpere ịmata na Nna nke Eluigwe nọ ebe ahụ, kpee ekpere ito eto ịghọ dị ka Ya, ma kpee ekpere igosị ịhụnaanya Ya nye ndị ọzọ.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, e nwere m ọńụ dị ka m na-azaghachi na mmetụta nke ịgwa ụmụ ntakịrị okwu!

Ụmụntakịrị nwanyị na ụmụntakịrị nwoke, ebe ọbụla unu nọ n’ụwa, a chọrọ m ịkọrọ unu otu ihe.

Nna anyị nke Eluigwe hụrụ unu naanya! Ị bụ nwa Ya. Ọ maara gị. Ọ chọrọ ịgọzi gị. Eji m obi m niile ekpe ekpere na ị ga-enweta mmetụta ịhụnaanya Ya.

Ị chọrọ inweta onyinye buru ibu? A chọrọ m ịgwa gị okwu gbasara otu onyinye pụrụ nnọọ ezigbo iche nke Nna nke Eluigwe nyeworo gị iji nyere gị aka. Ọ bụ onyinye nke ekpere. Lee ka ekpere si bụrụ ngọzi! Anyị nwere ike ịgwa Nna nke Eluigwe okwu oge ọbụla, ebe ọbụla.

Foto, oyiyi
Jizọs ya na ụmụntakịrị

Mgbe Jizọs nọ n’elu ụwa, Ọ kuziiri anyị ikpe ekpere. Ọ sịrị, “Rịọnụ, ma unu ga-anata.”1

Olee onyinye ndị unu na-ekpe ekpere banyere ha? E nwere ọtụtụ, mana taa a chọrọ m ịkọ maka atọ:

  1. Kpee ekpere ịmata.

  2. Kpee ekpere ito eto.

  3. Kpee ekpere igosị.

Ka anyị kwuo okwu banyere nke ọbụla niime ha.

Nke mbụ, Kpee ekpere Ịmata

Onye ka i kwesịrị ịmata?

E nwere otu ukwe gbasara ekpere nke ụmụ Praịmarị na-ekwe na gburugburu ụwa niile. Ọ na-eji ajụjụ ebido. Ị maara ukwe nke ọ bụ? Ọ bụrụ na m nwere obi ike n’ezie, agara m ekwere unu ya!

“Nna nke Eluigwe, ịnọ ebe ahụ n’ezie? Ma ị na-anụ ma na-aza ekpere nke nwata ọbụla?”2

Olee otu i si amata na Nna nke Eluigwe nọ ebe ahụ n’ezie, ọbụna mgbe na inweghị ike ịhụ Ya?

Onyeisi Russell M. Nelson akpọkuwo gị “ịwụpụta mkpụrụ obi gị nye Nna gị nke Eluigwe. … Ma mgbe ahụ gee ntị!”3 Gee ntị na ihe ị na-enweta mmetụta ya niime mkpụrụ obi gị na nye echiche niile na-abata n’uche gị.4

Nna nke Eluigwe nwere ahụ nwere otuto nke anụ ahụ na ọkpụkpụ ma bụ Nna nke mmụọ gị. Niihi na Nna nke Eluigwe ji ike niile ma mazuru ihe niile, O nwere ike ịhụ ụmụ Ya niile5 ma nwere ike ịnụ ma zaa ekpere ọbụla. Ị ga-abịa mata n’onwe gị na Ọ nọ ebe ahụ ma na Ọ hụrụ gị naanya.

Mgbe ịma na Nna nke Eluigwe dị adị ma na Ọ hụrụ gị naanya, inwere ike bie ndụ na mgbam ume na olileanya! “Kpee ekpere, ọ nọ ebe ahụ; Kwuo, ọ na-ańa ntị.”6

Ọ dịtụla mgbe owu mara gị? Otu ụbọchị mgbe nwa nwa anyị nwanyị Ashley gbara afọ isii, ọ bụụrụ naanị ya nọ na-enweghị enyi ya na ya ga-egwu egwu na mbara egwuregwu nke ụlọakwụkwọ. Dị ka o guzooro ebe ahụ, na-eche na ọ baghị uru na enweghị onye na-ahụ ya, otu echiche nnọọ batara n’uche ya: “Chere! Anọghị m naanị m! E nwere m Kraịst!” Ashley gbisara ikpere n’etiti mbara egwuregwu ebe ahụ, fụkọta ogweaka ya, ma kpee ekpere nye Nna nke Eluigwe. Oge ahụ o meghere anya ya, otu nwata nwanyị bụ ọgbọ ya guzoro ebe ahụ na-ajụ ya ma ọ chọrọ igwu egwu. Ashley bịara mata, “Anyị dị mkpa nye Onyenwe anyị, ma o nweghị mgbe anyị nọ naanị anyị n’ezie.”

Mgbe ụfọdụ i nwere ike chọọ ịmata ihe mere ihe rara ahụ ji na-eme na ndụ gị ma ọ bụ ihe mere iji nataghị ngọzi nke i kpere ekpere maka ya. Ọtụtụ mgbe ajụjụ kachasị mma ịjụ Nna nke Eluigwe abụghị maka gịnị mana gịnị mere?

I chetara mgbe Nefi na ezi na ụlọ ya nọ na-agụụ mgbe ha na-eme njem niime alaịkpa? Mgbe Nefi na ụmụnne ya ndị nwoke gara ịchụ nta ihe oriri, Nefi gbajiri ụta ya. Mana Nefi ajụghị maka gịnị.

Foto, oyiyi
Nefi na-ajụ Lehi ebe aga achọta ihe oriri.

Nefi rụrụ ụta ọhụrụ ma jụọ Nna ya, Lehi, ebe o nwere ike gaa iji nweta ihe oriri. Lehi kpere ekpere, ma Onyenwe anyị gosịrị ha ebe Nefi nwere ike gaa.7 Nna nke Eluigwe ga-edu gị mgbe ịrịọrọ Ya ihe i nwere ike ime na ihe i nwere ike ịmụta.

Nke abụọ, Kpee ekpere ito eto

Nna nke Eluigwe chọrọ i nyere gị aka too etoo! Ọ hụrụ anyị naanya nke ukwuu nke mere na O zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, igosi anyị ụzọ ibi ndụ.7 Jizọs tara ahụhụ, nwụọ, ma bilitere n’ọnwụ ka e wee gbaghara anyị mmehie anyị ma etoo uto ịdịkarị ka Ya.

Ị chọrọ ito eto na ndidi ma ọ bụ ị na-ekwu eziokwu? Ị chọrọ ito eto n’otu aka nka? Elemaanya ị na-eme ihere ma chọọ ito eto na-inwe mgbam ume. Kpee ekpere, ọ nọ ebe ahụ”!9 Site na Mmụọ Ya, obi gị nwere ike gbanwee, ma i nwere ike nata ume.

Enyi m ọhụrụ Jona dere, “Ọtụtụ mgbe ụjọ na-atụ m mgbe m na-aga ụlọakwụkwọ n’ụtụtụ. Ana m eche echiche gbasara ihe ndị dị ka ejeghị n’oge, ichefu ihe, ma ọ bụ ile ule niile. Mgbe m gbara afọ 10, a malitere m ikpe ekpere mgbe nne m na-akwọga m ụlọakwụkwọ. Arịọrọ m maka enyem aka m chọrọ, ma ana m ekpe ekpere maka ezi na ụlọ m kwa. A nakwa m eche echiche banyere ihe ndị m nwere ekele maka ha. [Ikpe ekpere nye Nna nke Eluigwe] enyeworo m aka. Mgbe ụfọdụ anaghị m enweta enyem aka ozugbo mgbe m pụtara n’ụgbọ ala, mana site n’oge m nọ n’ọnụ ụlọ klaasị m ana m enwe udo.”9

Okwukwe nke Jona na eto eto dị ka ọ na-ekpe ekpere ụbọchị niile ma mesịana-aganiihu.

Nke atọ, Kpee ekpere Igosị

I nwere ike ikpe ekpere maka enyem aka iji gosị ndị ọzọ ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe.11 Site na Mmụọ Ya, Nna nke Eluigwe ga-enyere gị aka hụta ụfọdụ ndị nke na-enweghị obi ụtọ nke ga-eme ka ịkasie ha obi. O nwere ike inyere gị aka na-egosị ịhụnaanya Ya site na ịgbaghara ụfọdụ ndị. O nwere ike inye gị mgbamume iji jeere ụfọdụ ndị ozi ma kọọrọ ha na ha bụ nwa nke Chineke. Mbọ gị niile nwere ike nyere ndị ọzọ aka ịbịa mata ma hụ Jizọs na Nna nke Eluigwe naanya dị ka i mere.12

Oge ndụ m niile e kpere m ekpere ka nna m ghọọ onye otù Nzukọ Nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a. Ọbụna dị ka nwata nwanyị, a maara m ọtụtụ ngọzi ndị o nwere ike ịnata. Ezi na ụlọ anyị pụrụ ịnata ngọzi niile nke inwe nrachi maka oge ebighị ebi. Ezi na ụlọ m, ndị enyi m, na mụ onwe m kpere ekpere ọtụtụ mgbe maka ya, mana o sonyeghị Nzukọ nsọ. Nna nke Eluigwe anaghị amanye onye ọbụla ime nhọrọ.12 O nwere ike zitara anyị azịza nye ekpere anyị n’ụzọ ndị ọzọ.

Foto, oyiyi
Onyeisi Porter ya na ndị nne na nna ya na ụmụnne ya.

Mgbe m tozuru oke, anatara m ngọzi nke onye petrak m. Niime ngọzi ahụ onye petrak gwara m ihe kachasị mma m nwere ike ime iji nyere ezi na ụlọ m aka ịnọkọta ọnụ n’eluigwe bụ ịbụ onye eji amaatụ banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ọ bụ ihe m nwere ike ime!

Nna m biri ndụ iru 86. Mkpụrụ ụbọchị ise ọ nwụchara, anatara m mmetụta ọńụ dị nsọ. Nna nke Eluigwe kwere m ịmata site na Mmụọ Ya na nna m chọburu ịnata ngọzi niile nke ozi ọma Jizọs Kraịst! Enweghị m ike ichefu ụbọchị ahụ m gbisara n’ebe nchụaja niime tempụl mụ na nwanne m nwanyị na ụmụnne m ndị nwoke irachi anyị na ndị nne na nna anyị. Amalitewo m rịị ikpe ekpere maka ngọzi nke a mgbe m nọ na Praịmarị, ma anatara m ya mgbe m bụ nne nne.

Ikekwe ị na-ekpe ekpere maka ngọzi ndị nke ezi na ụlọ gị na ndị ọzọ ị hụrụ naanya. Mana adakwala mba! Nna nke Eluigwe ga egosị gị ihe i nwere ike ime.

Kọsara Nna nke Eluigwe ihe nọ gị n’obi.13 Mgbe i jiri obi gị niile rịọ maka enyem aka Ya, ị ga-anata Mmụọ Ya idu gị.14 Ikpe ekpere ụbọchị niile ga-ejuputa gị n’ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Nke a ga-enyere gị aka ịchọ isoro Ha na ndụ gị niile!

Chegodụ ihe gaara eme ma ọ bụrụ na ụmụntakịrị niile nọ na Afrịịka, South America, Asia, Europe, North America, na Australia kpere ekpere ụbọchị niile? Ụwa dum ga-anata ngọzi site na ịhụnaanya karịrị akarị nke Chineke!

Foto, oyiyi
Ụmụntakịrị na gburugburu ụwa na-ekpe ekpere.

Ana m akpọku unu ikpe ekpere ịmata na Nna nke Eluigwe nọ ebe ahụ, kpee ekpere ito eto ịghọ dị ka Ya, ma kpee ekpere igosị ịhụnaanya Ya nye ndị ọzọ. Ama m na Ọ dị ndụ ma hụrụ gịnaanya. “Kpee Ekpere, ọ nọ ebe ahụ.” N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.