Ọgbakọ Zuru ọha
Otu Ndekọihe nke Ihe M Hụworo ma Nụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Otu Ndekọihe nke Ihe M Hụworo ma Nụ

E nwebeghị oge ka mma ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

Mgbe m gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ iwu, nwunye m, Marcia, na mụ họrọ ịbanye n’otu ụlọ ọrụ iwu nke ọkachamara n’iwu ikpe ikpe. Dịka m malitere ọzụzụ m n’ọrụ, e jiri m oge m na-akwado ndị akaebe ịgba akaebe n’ụlọ ikpe. A mụtara m ngwa ngwa na a na-achọpụta eziokwu n’ime ụlọ-ikpe dị ka ndị akaebe, n’okpuru iyi, gbara akaebe na ihe ha hụrụ ma nụ bụ eziokwu. Dịka ndị aka ebe gbara ama, e dekọrọ ma chekwaa okwu ha niile. Mkpa nke ndị aka ebe kwesịrị ntụkwasị obi bụ mgbe niile ihe na-ebute ụzọ na nkwadebe m.

O wereghị m ogologo oge ị mata na otu okwu ahụ m na-eji kwa ụbọchị dịka onye ọka iwu bụkwa okwu ndị m na-eji na mkparịta ụka ozi ọma m. “Ịgba ama” na “aka ebe” bụ okwu ndị anyị na-eji ka anyị na-ekerịta ihe ọmụma na mmetụta niile anyị gbasara eziokwu nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Mgbe a kwadoro m dịka Onye Mpaghara Iri Asaa ọhụrụ, E meghere m akwụkwọ nsọ ka m wee mụọ ọrụ m niile ma gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:25, nke na-ekwu, “Ndị Iri Asaa ahụ ka akpọkwara … ka ha bụrụ ndị aka ebe pụrụ iche nye ndị Jentaịlụ niile na n’ime ụwa.” Dịka ị pụrụ iche n’echiche, anya m gara n’okwu ahụ “onye aka ebe pụrụ iche.” Ọ bịara doo m anya na m nwere oke na ọrụ ị gbaa aka ebe m—ịgbaa ama nke aha Jizọs Kraịst—ebe ọ bụla m na-eme njem n’ụwa.

E nwere ọtụtụ ihe ịmaatụ n’ime akwụkwọ nsọ nke ndị ahụ ji anya ha hụ na ndị gbara ama maka ihe ha hụrụ ma nụ.

Dịka onye amụma mgbe ochie Mọmọn bidoro na ndekọihe ya, “Ma ugbua mụ, Mọmọn, na-eme ndekọihe nke ihe ndị nke m hụworo ma nụ, ma kpọọ ya Akwụkwọ nke Mọmọn.”1

Ndị ozi nke Onye Nzọpụta bụ Pita na Jọn gwọrọ otu nwoke n’aha nke Jizọs Kraịst.2 Mgbe e nyere ha iwu ka ha e kwula okwu n’aha nke Jizọs, ha zara:

“Ọ bụrụ na o ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị, kpenu ikpe.

“N’ihi na ayi apụghị ikwu ihe ndị anyị huworo ma nụ.”3

Ọgbugba ama ọzọ na-akpali mmụọ sitere na Ndị nsọ Akwụkwọ nke Mọmọn ndị hụrụ nleta nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst. Gee ntị nye nkọwa nke aka ebe ha: “Ma n’ụdị a ka ha na-agba ama: Anya ahụtụbeghị, ọbụghị ma ntị ọ nụtụwo, mbụ, nnukwu ihe dị otu a na ihe ịtụnaanya nile dịka anyị hụrụ ma nụ Jizọs gwara Nna.”4

Ụmụnne nwoke na nwanyị, taa a na m ekwupụta ịgba ama m ma na-edekọ ihe m hụworo ma nụ n’oge ije ozi m dị nsọ dịka onye Iri Asaa nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. N’ime nke a, A na m agba ama nye unu maka Nna nke Eluigwe nwere ịhụnanya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, onye tara ahụhụ, nwụọ, ma bilie ọzọ inye ụmụ Chineke ndụ ebighị ebi. Ana m agba ama maka “ọrụ dị ebube ma dị ịtụnaanya”5 ma na Onyenwe anyị esetipụwo aka Ya ọzọ iweghachi ozi ọma Ya n’ụwa site n’aka ndị amụma Ya dị ndụ na ndị ozi.5 Ana m agba ama na ịdabere na ihe m hụworo ma nụ, enwebeghị oge ka mma ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a karịa taa. A maara m nke a site na omụma ihe nke m, n’adabereghị n’ebe ọ bụla ọzọ n’ihi ihe m hụworo ma nụ.

N’ime afọ ikpeazụ m n’ụlọ akwụkwọ nke sekọndịrị, ka m wee gụchaa na semịnarị A ghaghị m ịmata tempụl 15 nke Nzukọ nsọ. Foto nke tempụl ọ bụla dị n’ihu klas anyị, ma aghaghị m ịma ebe nke ọ bụla dị. Ugbu a, ọtụtụ afọ gachara, ọ ga-abụ nnukwu ihe ịma aka—ebe enwere tempụl 335 na-arụ ọrụ na ndị a mara ọkwa—iji mata nke ọ bụla. Mụ onwe m ahụla ọtụtụ ụlọ ndị a nke Onyenwe anyị ma n’agbaa ama na Onyenwe anyị na-enye ọtụtụ ụmụ Ya n’ofe ụwa ngọzi na emume nsọ Ya niile.

Ndị enyi m na FamilySearch akuziworo m na ha na-agbakwụnye ihe karịrị otu nde aha ọhụrụ na FamilySearch kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị hụghị nna nna gị ụnyahụ, A na m akpọ gị oku ka ị lee anya ọzọ echi. Mgbe ọ bịara n’ịkpọkọta Izrel n’akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi, enwebeghị oge ka mma ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a karịa taa.

Ka anyị na-azụlite ụmụ anyị n’ime Twin Falls, Idaho, echiche anyị gbasara Nzukọ nsọ zuru ụwa ọnụ nwere oke. Mgbe a kpọrọ m ịbụ onye Ji Ikike Zuru ọha, e kenyere mụ na Marcia ije ozi na Mpaghara Pacific, bụ ebe anyị na-agatụbeghị. Obi dị anyị ụtọ ịhụ ọtụtụ stek site na elu nke New Zealand ruo na ala, tinyere otu tempụl edoro nsọ na 1958. Ọ bụ otu niime 15 nndị ahụ m buru n’isi na semịnarị. Anyị hụrụ tempụl niile n’ime obodo ukwu ọ bụla nke Australia, ya na stek niile n’ofe kọntinent ahụ. E kenyere anyị ọrụ na Samoa, bụ ebe ha nwere stek 25, na Tonga, bụ ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ndị bi na ya bụ ndị otu Nzukọ nsọ. Anyị nwere ọrụ n’agwaetiti nke Kiribati, ebe anyị hụrụ stek abụọ. Anyị nwere ọrụ ịga leta stek niile na Ebeye nime Marshall Island na Daru nime Papua New Guinea.

Mgbe anyị jechara ozi n’Agwaetiti Pacific, e nyere anyị ọrụ ije ozi na Philippines. Ọ tụrụ m n’anya, Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst dị na Philippines na-eto eto karịa ihe ọ bụla m ghọtara. Ugbu a ha dị stek 125, mishọn 23, na tempụl 13 narụ ọrụ ma ọ bụ a mara n’ọkwa. A hụrụ m otu nzukọ nsọ nwere ihe karịrị ndị otu 850,000 nime obodo ahụ. Kedu ka m si esoghị m na nhiwe nke Nzukọ nsọ nke Kraịst n’ofe ụwa niile?

Mgbe anyị nọsịrị afọ atọ na Philippines, a gwara m ka m jee ozi na Ngalaba Mịshọn. Ọrụ m mere ka anyị gaa ozi na mịshọn niile dị n’ụwa. Echiche m banyere Nzukọ nsọ zuru ụwa ọnụ nke Onye Nzọpụta gbasara nke ukwuu. E kenyere mụ na Marcia ịga leta ndị mịshọn niile nọ na Eshịa. Anyị chọtara ebe mara mma na stek nime Singapore, nwere ndị otu dị ịtụnanya, ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị letara ndị otu na ndị mgbasa oziọma nime chapel na Kota Kinabalu, Malaysia. Anyị zutere ndị mgbasa oziọma na Hong Kong ma sonye na ọgbakọ stek dị ebube anyị na Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi.

Nhụmihe nke a mere ugboro ugboro ka anyị zutere ndị mgbasa oziọma na ndị otu nọ n’ofe Europe, niime Latin America, Caribbean, na Afrịịka. Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na eto nke ukwuu n’ime Afrịịka.

A bụ m onye ji anya ya hụ mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na mmezu nke amụma nke onye amụma nke Josef Smith na “eziokwu nke Chineke ga-aga niihu atụghị ụjọọ, jidesie ezi ukpuru ya aka, ma nọrọ n’onwe ya, ruo mgbe o mikpuru ala ukwu niile, zute mpaghara niile, zachaa mba niile, ma daa ụda na ntị niile.”7

Ndị mgbasa oziọma anyị magburu onwe ha bụ ndị zuru ụwa niile dị 74,000. Ha na ndị otu na-arụkọ ọrụ, ha na-eme ihe karịrị mmadụ 20,000 baptizim kwa ọnwa. N’oge na-adịbeghị anya ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ dị afọ 18-, 19-, na 20- bụ ndị, site n’enyewmaka nke Onyenwe anyị, rụpụtaworo nnukwu ọrụ ebube nke mkpọkọta nke a. Anyị na-ahụ ụmụ agbọghọ ndị a na ụmụ okrobịa n’obere ime obodo Vanuatu na n’obodo ukwu ndị dị na New York, Paris, na London. A hụrụ m ka ha na-akuzi gbasara Onye Nzọpụta niime ọgbakọ ndị dịpụrụ adịpụ na Fiji na nnukwu ọgbakọ kacha n’ebe ndị dịka Texas, California, na Florida niime United States.

Ị ga-ahụ ndị mgbasa oziọma nime akụkụ niile nke ụwa na-asụ asụsụ 60 dị iche iche ma na-arụzu ọrụ dị ukwuu nke Onye Nzọpụta nyere na Matiu 28: “Ya mere gaanụ, ma kuziere mba niile, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.”8 Ana m asọpụrụ ndị mgbasa oziọma gara aga na ndị ugbu a nke Nzukọ nsọ ma na-echetara ọgbọ anyị na-ebilite banyere ọkpụkpọ oku nke Onyeisi Russell M. Nelson ịbịa kpọkọta Izrel.9

Ana m agba ama taa na a hụla m Mweghachite nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta n’anya m abụọ ma nụ ya na ntị m abụọ. Abụ m otu onye aka ebe nke ọrụ Chineke n’ofe ụwa niile. E nwebeghị oge ka mma ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a karịa taa.

Ikekwa ọrụ ebube kachasị akpate mmụọ nke Mweghachite nke m hụworo bụ unu, ndị otu Nzukọ nsọ kwesịrị ntụkwasị obi n’ala niile. Unu, Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ, ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ka akọwara site n’aka Nefi n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, dịka ọ hụrụ ụbọchị anyị ma gbaa ama, “Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, hụrụ ike nke Nwa atụrụ Chineke, na ọ dakwasịrị n’elu ndị nsọ nke nzukọ nsọ nke Nwa atụrụ ahụ, na n’elu ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, ndị gbasasịrị na mbara elu ụwa; ma ngwa ọgụ ha ji bụ ezi omume na ike nke Chineke n’ime nnukwu otuto.”10

Ana m agba ama na ejila m anya abụọ hụ ihe Nefi hụrụ—unu, Ndị nsọ gbara ndụ na ala ọ bụla, ji eziomume na ike nke Chineke. Dịka m nọ n’elu ikpo okwu n’otu n’ime nnukwu mba nke ụwa, Onyenwe anyị kụnyere n’uche m ihe Eze Benjamin kụziri na Mosaia 2 n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Brent, “A ga m achọ ka unu tụgharịa uche na ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke. N’ihi na lee, agọziri ha n’ihe niile, ma n’ihe nke arụ ma nke mụọ.”11

Ana m agbara unu ama na m ejila anya m hụ nke a ma were ntị m nụ ya dị ka m hụrụ unu, ndi nsọ nke Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ofe ụwa ndị na-edobe iwu nsọ niile. Unu bụ ụmụ ọgbụgba ndụ nke Nna. Unu bụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Unu makwara ihe m maara nihi unu a natala ama nke onwe unu banyere ịbụ eziokwu nke mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Onye Nzọpụta kuziri, “Mana ngọzi ga-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ: ma ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.”12

N’okpuru ntụziaka nke Onyenwe anyị na ndị nduzi nke ndị amụma Ya na ndị ozi Ya, anyị ga-aga n’ihu n’ịkwado ndi mgbasa oziọma, mee ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, hiwe Nzukọ nsọ nke Kraịst n’ofe ụwa niile, ma nata ngọzi niile na-abịa dịka anyị na-edobe iwu nsọ niile nke Chineke. Anyị dị n’otu. Anyị bụ ụmụ Chineke . Anyị maara Ya ma anyị hụrụ Ya n’anya.

A na m esonye unu niile, ndị enyi m, dịka anyị jikọtara ọnụ agba ama na ihe ndị a bụ eziokwu. Anyị na-edekọ ihe banyere ihe ndị anyị hụworo ma nụ. Mụ na Gị bụ ndị aka ebe ndị na-agba ama. Ọ bụ site n’ike nke ịgba ama nke a ejikọtara ọnụ ka anyị ji aganiihu na okwukwe n’ime Onyenwe anyị jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. A na m agba akaebe m na Jizọs Kraịst dị ndụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen