Ọgbakọ Zuru ọha
Tụkwasị obi na Onyenwe anyị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Tụkwasị obi na Onyenwe anyị

Mmekọrịta anyị na Chineke ga-eto eto naanị ruo n’ogo anyị dị njikere idebe ntụkwasị obi anyị na Ya.

Niime ezi na ụlọ anyị, anyị mgbe ụfọdụ anyị na-egwu egwuregwu anyị kpọrọ “Mmegharị ahụ Ntụkwasị obi Ara.” Enwekwara ike unu emewo ya kwa. Mmadụ abụọ na-eguzoro fiiti ole ma ole iche iche, ha ejiri azụ ha guzoro niihu ibe ha. Na mgbaàmà site n’aka onye nke nọ na azụ, onye nọ niihu na-adala azụ n’aka nchere nke enyi ha.

Ntụkwasị obi bụ ntọala nke mmekọrịta niile. Ajụjụ ọnụ nye mmekọrịta nke ọbụla bụ “Enwere M ike inwe ntụkwasị obi n’onye nke ọzọ?” Mmekọrịta na-adị naanị mgbe ndị mmadụ dị njikere ịtụkwasị obi n’ibe ha. Ọ bụghị mmekọrịta ọbụla ọ bụrụ ma otu onye tụkwasị obi kpamkpam mana onye nke ọzọ emeghị.

Onye ọbụla nime anyị bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwaada nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya.1 Mana, ebe akụkọ agbụrụ ime mmụọ ahụ na-ewete ntọala, ọ naghị n’onwe ya emepụta mmekọrịta bara uru anyị na Chineke. Mmekọrịta ka a pụrụ iwulite naanị mgbe anyị họọrọ ịtụkwasị obi na Ya.

Nna nke Eluigwe nwere ọchịchọ iwulite mmekọrịta nke onwe na nke miri emi ya na ụmụ Ya nke mmụọ ọbụla.2 Jizọs gosiputara ọchịchọ ahụ mgbe O kpere ekpere, “Ka ha niile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị, Nna, nọ nime m, ma Mụ nọ nime gị, ka ha n’otu aka ahụ nọrọ nime anyị.”3 Mmekọrịta Chineke na-achọ ya na nwa ime mmụọ nke ọbụla bụ nke ziri ezi na nke onwe nke Ọ ga-enwe ike ikesa ihe niile O nwere na ihe niile Ọ bụ.4 Ụdị mmekọrị ahụ miri emi, na-adịgide ka e nwere ike ịzụlite naanị mgbe ewuru ya n’elu ntụkwasị obi zuru oke na nke zuru ezu.

Maka akụkụ nke Ya, Nna nke Eluigwe arụwo ọrụ site na mmalite iji gosipụta ntụkwasị obi Ya zuru ezu niime ike sinachi nke ụmụ Ya nke ọbụla. Ntụkwasị obi dị n’okpuru atụmatụ Ọ gosipụtara maka uto na ọganiihu anyị tupu ọbịbịa anyị n’ụwa. Ọ ga-akuziri anyị iwu ebighị ebi niile, kepụta otu ụwa, wetere anyị anụ ahụ ndị pụrụ ịnwụ anwụ, nye anyị onyinye ịhọrọ n’onwe anyị, ma kwe anyị ịmụ ihe ma too site na ime nhọrọ nke onwe anyị. Ọ na-achọ anyị ịhọrọ isoro iwu Ya niile ma laghachi irite ndụ ebighị ebi anyị na Ya na Ọkpara Ya.

Ịmara na anyị agaghị mgbe niile eme nhọrọ ndị dị mma, Ọ kwadokwara ụzọ maka anyị iji gbanahụ site na nsonazụ niile nke nhọrọ ndị dị njọ. O weteere anyị Onye Nzọpụta—Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst—ịchụ aja mgbaghara mmehie maka mmehie anyị ma mee anyị adị ọcha ọzọ na ọnọdu nke nchegharị.5 Ọ na-akpọku anyị iji onyinye dị oke ọnụ ahịa nke nchegharị mgbe niile.6

Nne na nna niile maara otu isi ike ọ bụ ịtụkwasị obi nke ọma na otu nwa ikwe ha mee mkpebi nke onwe ha, kacha nke mgbe nne na nna ahụ maara na nwa ahụ nwere ike ịzọhie ụkwụ ma taa ahụhụ niihi nke ahụ. Otu ọ dị Nna nke Eluigwe na-ekwe anyị ime nhọrọ niile ga-enyere anyị aka rute ike mmepụta anyị dị nsọ! Dị ka Okenye Dale G. Renlund kuziri, “Ebumnuuche [Ya] n’ịzụ ụmụ abụghị ime ka ụmụ Ya mee ihe ziri ezi; ọ bụ ime ụmụ Ya họrọ ime ihe ziri ezi ma n’ikpeazụ dịrịzie ka Ya.”7

Na-agbanyeghị ntụkwasị obi nke Chineke na anyị, mmekọrịta anyị na Ya pụrụ ga-eto eto naanị ruo n’ogo anyị dị njikere ịdebe ntụkwasị obi na Ya. Aka mgba ya bụ na anyị bi n’ụwa dara ada ma ahụbigawo mmebi nke ntụkwasị obi niihi adịghị eziokwu, aghụghọ, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ. Otu mgbe a ranyere na nghọgbu, anyị nwere ike ịdọga inwe ntụkwasị obi ọzọ. Nhụmiihe ntụkwasị obi ndị a na-adịghị mma nke mere n’aka ndị pụrụ ịnwụ anwụ n’ezughị oke nwere ike ịmetụta njikere anyị ịtụkwasị obi na Nna nke Eluigwe zuru oke.

Ọtụtụ afọ gara aga, ndị enyi m abụọ, Leonid na Valentina, gosipụtara mmasị n’ịbụ ndị otu Nzukọ nsọ. Dị ka Leonid malitere ịmụ ozi ọma, ọ rara ya ahụ ikpe ekpere. N’isimbụ nke ndụ ya, Leonid tara ahụhụ sitere na nghọgbu na njikwa site n’aka ndị nọ nisi ma zụlitewo enweghị ntụkwasị obi nke ikikere. Nhụmiihe ndị a metụtara ike ya imepe obi ya ma gosi mmetụta onwe niile nye Nna nke Eluigwe. Jiri oge na ịmụ ihe, Leonid ritere nghọta agwa nke Chineke dị mma karịa ma nwete nhụmiihe mmetụta ịhụnaanya nke Chineke. N’ikpeazụ, ekpere bịara bụrụ ụzọ eke nye ya igosipụta ekele ma ịhụnaanya ọ naara enwe mmetụta maka Chineke. Ntụkwasị obi Ya na Chineke n’ikpeazụ dugara ya na Valentina ịbanye niime ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ iji gbaa mmekọrịta ha na Chineke na ibe ha ume.

Ọ bụrụ na nfunarị ntụkwasị obi tupu ugbu a na-egbochi gị site n’ịtụkwasị obi na Chineke, biko soro ọmụmaatụ nke Leonid. Jiri ndidi gaaniihu ịmụtakwu banyere Nna nke Eluigwe, agwa Ya, njirimara Ya niile, na nzube Ya niile. Chọọ maka ma dekọọ nhụmiihe niile nke mmetụta ịhụnaanya na ike Ya niime ndụ gị. Onye amụma anyị dị ndụ, Onyeisi Russell M. Nelson, akuziwo na ka anyị na-amụtakwu banyere Chineke, ọ ga-adịzi mfe karịa nye anyị ịtụkwasị obi na Ya.8

Mgbe ụfọdụ ụzọ kachasị mma iji mụọ ịtụkwasị Chineke obi bụ naanị site na ịtụkwasị obi na Ya. Dị ka “Mmegharị ahụ Ntụkwasị obi Ara,” mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị nnọọ adị njikere ịdala azụ ma kwe Ya ijide anyị. Ndụ anụ ahụ anyị bụ mnwale. Aka mgba niile nke na-adọtị anyị gafee ikike nke onwe anyị na-abịa ugboro ugboro. Mgbe mmata ihe na nghọta anyị ezughị ezu, anyị na-achọ na nkịtị maka akụrụngwa ndị na-enyere anyị aka. Niime ụwa juputara n’ozi, enweghị ụkọ nke nsipụta ndị na-akwalite ngwọta nye ịma aka anyị. Kosiladị, ndụmọdụ dị mfe, oge nwalere dị niime Ilu na-ewetere anyị ndụmọdụ kacha mma: “Tụkwasị obi na Onyenwe anyị jiri obi gị niile.”9 Anyị na-egosi ntụkwasị obi anyị niime Chineke site n’ịtụgharị nye Ya na mbụ mgbe ịma aka niile nke ndụ chere anyị niihu.

Mgbe m gụsịrị ụlọakwụkwọ iwu na Utah, ezi na ụlọ anyị zutere mkpebi dị mkpa nke ebe anyị ga-arụ ọrụ ma zulite ezi na ụlọ anyị. Mgbe inyekọrịta ndụmọdụ onye n’ibe ya na Onyenwe anyị, o metụtara anyị ka ịkwaga ezi na ụlọ anyị ruo na mpaghara ọwụwa anyanwụ United States, dị anya site n’ebe ndị nne na nna na ụmụnne nọ. Na mbụ, ihe niile gara nke ọma, ma anyị nwetere mmetụta nnabata na mkpebi anyị. Mana emesịa ihe niile gbanwere. Abịara nwee mbelata n’ọrụ n’ụlọ ọmee iwu, ma ezutere m atụmanya nke enweghị ọrụ ma ọ bụ insurance n’oge ahụ nnọọ a mụrụ nwaada anyị Dora ka a mụrụ nwere oke ọrịa ma nwee mkpa ogologo oge enyemaka pụrụ iche. Mgbe m na-ezute aka mgba ndị a, e nyere m ọkpụkpọ oku ije ozi nke ga-achọ ezigbo oge na nraranye.

Enwetụbeghị mgbe m zutere ụdị ịma aka a ma o juru m anya. A malitere m ịjụ ajụjụ mkpebi anyị meworo na nnabata ya so ya. Anyị atụkwasịwo obi na Onyenwe anyị, ma ihe niile bụ nke kwesịrị ịga nke ọma. Adalawo m azụ, ma ugbu a ọ bịara bụrụ na ọdịghị onye na-aga ijide m.

Otu ụbọchị okwu ndị a “Ajụkwala gịnị mere; jụọ ihe m na-achọ ka gị mụọ” bịara nke ọma niime uche na obi m. Ugbu a ọbụna egwu tụrụ m karịa. N’oge mgbagwoju anya kpọmkwem a naara m adọlị na mkpebi m nke isimbụ, Chineke nọ na-akpọku m ịtụkwasị obi na Ya ọbụna karịa. Ileghachi anya azụ, nke a bụ oge dị egwu na ndụ m—ọ bụ oge mgbe m matara na ụzọ kachasị mma iji mụta ịtụkwasị obi na Chineke bụ nnọọ site n’ịtụkwasị obi na Ya. N’izu ụka ndị sochiri, e lere na ịtụnaanya dị ka Onyenwe anyị n’ụzọ ọrụ ebube gosiri atụmatụ Ya iji gọzie ezi na ụlọ anyị.

Ezigbo ndị nkuzi na ndị koochi maara na uto ọgụgụ isi na ike anụ ahụ pụrụ ime naanị mgbe a na-adọtị uche niile na akwara niile. N’otu aka ahụ, Chineke na-akpọku anyị ito eto site n’ịtụkwasị obi na nkuzi ime mmụọ Ya site na mgbatị nhụmiihe mkpụrụ obi niile. Ya mere, o nwere ike ido anyị anya na ntụkwasị obi ọbụla anyị nwere ike igosipụtarịị niime Chineke n’oge gara aga, nhụmiihe mgbatị ntụkwasị obi ọzọ ka dị niihu. Chineke lekwasịrị anya na uto na ọganiihu anyị. Ọ bụ Onyeisi Nkuzi, koochi zuru oke onye nọ na-agbatị anyị mgbe niile iji nyere anyị aka matakwuo ike mmepụta anyị sinachi. Nke ahụ ga na-agụnye mgbe niile ọkpụkpọ oku ọdịniihu ịtụkwasị obi na Ya nnọọ nwa obere ọzọ.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuzi na ụkpụrụ Chineke na-eji agbatị anyị iji nwee ike wusie mmekọrịta anyị na ya ike. Niime Bịanụ, Soro M, anyị na nso nso a mụrụ banyere otu esi nwalee ntụkwasị obi nke Nifaị niime Chineke mgbe enyere ya na ụmụnne ya nwoke iwu ịlaghachi Jerusalem inwete epekele niile nke bras. Mgbe mbọ mbụ ha dara, ụmụnne ya nwoke dara mba ma dịrịị njikere ịlaghachi nejighị epekele niile. Mana Nifaị họọrọ idebe ntụkwasị obi ya dum niime Onyenwe anyị ma mee nke ọma n’inwete epekele niile ahụ.10 Nhụmiihe ahụ dịịrị ka ọ gbara obisike nke Nifaị niime Chineke ume mgbe ụta ya gbajiri ma ezi na ụlọ ahụ anọrọ na agụụ niime alaịkpa. Ọzọkwa, Nifaị họọrọ ịtụkwasị obi niime Chineke, ma azọpụtara ezi na ụlọ ahụ.11 Nhụmiihe ndị a gara nke ọma nyere Nifaị obisike siri ike niime Chineke maka ọrụ buru ibu, ọrụ na-agbatị ntụkwasị obi nke ọ ga-ezute oge na-adịghị anya nke iwu ụgbọ mmiri.12

Site na nhụmiihe ndị a, Nifaị gbara mmekọrịta ya na Chineke ume site n’ịnọgide na ịtụkwasị obi na Ya esepụghị aka. Chineke na-eji otu ụdị nsoro ahụ n’ebe anyị nọ. Ọ na-esetịpụrụ anyị ọkpụkpọ oku nke onwe onye iji gbaa ume ma mikpukwuo ntụkwasị obi na Ya.13 Oge ọbụla anyị nabatara ma mee ihe na ọkpụkpọ oku, ntụkwasị obi anyị na Chineke na-etolite. Ọ bụrụ na anyị leghara anya ma ọ bụ jụ ọkpụkpọ oku, ọganiihu anyị na-akwụsị tutu ruo mgbe anyị dị njikere imere ihe na ọkpụkpọ oku ọhụrụ ahụ.

Ozi ya dị mma bụ na agbanyeghị ntụkwasị obi anyị nwere ike ma ọ bụ enweghị ike ahọrọ idebe niime Chineke mgbe gara aga, anyị nwere ike họrọ ịtụkwasị obi na Chineke taa na ụbọchị niile na-aga niihu. Ana m ekwe nkwa na oge ọbụla anyị mere, Chineke ga-anọ n’ebe ahụ ijide anyị, ma mmekọrịta nke ntụkwasị obi anyị ga-esiwanye ike na ike tutu ruo n’ụbọchị ahụ anyị na Ya na Ọkpara Ya ga-abụrụ otu. Mgbe ahụ anyị ga-ama ọkwa dị ka Nifaị, “O Onyenwe anyị, atụkwasịwo m obi na gị, ma aga m atụkwasị obi na gị ruo ebighị ebi.”14 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen