Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọkwa nchụ-aja nke Erọn


Ọkwa nchụ-aja nke Erọn

Ọkwa nchu-aja ahụ nke ka nta (Ndị-Hib. 7:11–12; OznỌd. 107:13–14). Ọkwa ọrụ ya bụ ụkọchukwu, onye nchụ-aja, onye nkụzi, ọkwa ụkọ dikọn (OznỌd. 84:30; 107:10, 14–15, 87–88). Mgbe ochie, n’okpuru iwu Moses, e nwebuuru ndị isi-nchụ-aja nile di elu, ndị nchụ-aja nile, na ndị Livaị. Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn ka e kpugheere Moses n’ihi na ndị Israel agba ochie nupuru isi megide Chineke. Ha jụrụ ido ha nsọ na-inweta Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek na emume nsọ ya nile (OznỌd. 84:23–25). Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn gbasara Emume-nsọ nile nke ụwa nke a na nke pụtara ìhè nke iwu na nke ozi-ọma (1 Ihem. 23:27–32; OznỌd. 84:26–27; 107:20). Ọ na-ejide ọtụghe ụzọ nile nke nkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi, nke ozi-ọma nke nchegharị, na nke baptism (OznỌd. 13). E weghachiri Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn n’uwa n’ọgbọ nke a, na 15 May 1829. Jọn ome baptism nyefere ya n’aka Joseph Smith na Oliver Cowdery n’elu ala akụkụ Osimiri Susquehanna, dị nso Harmony, Pennsylvania (OznỌd. 13; A—JS 1:68–73).