Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mọmọn, Onye-amụma Nifaị


Mọmọn, Onye-amụma Nifaị

Otu onye-amụma Nifaị, Onye ọchị-agha, na onye na-edobe akụkọ ndekọta n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Mọmọn biri ndụ n’afọ dịka 311–385 mgbe a mụsịrị Kraịst (Mọm. 1:2, 6; 6:5–6; 8:2–3). Ọ bụụrụ onye-ndu ndị agha na nke kachasị n’ime ndụ ya, malite n’afọ nke iri na ise ọ dị (Mọm. 2:1–2; 3:8–12; 5:1; 8:2–3). Amarọn nyere Mọmọn ntụzi-aka ka ọ kwadobe onwe ya ilekọta akụkọ ndekọta nile na idobe akụkọ ndekọta ahụ (Mọm. 1:2–5; 2:17–18). Mgbe o dekọtasịwọro akụkọ nke oge ndụ ya, Mọmọn defere epekele nile buru ibu nke Nifaị na mkpirisi n’elu epekele nile nke Mọmọn. N’ikpe-azụ o nyefere akụkọ ndekọta a dị-nsọ n’aka nwa ya nwoke Moronaị maka idobe ha na ilekọta ha. Epekele ndịa bụ mpaghara akụkọ ndekọta ahụ nke Joseph Smith si na ya tụgharịa asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

Okwu nile nke Mọmọn

Otu obere akwụkwọ dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Site n’agbata okwu ikpe-azụ nile nke Amaleki n’ime akwụkwọ nke Ọmnaị na okwu mbụ nile dị n’ime akwụkwọ nke Mosaịa, Mọmọn, onye lebara anya na akụkọ ndekọta ahụ nile, tinyere nwa obere ihe nke a (Hụ “Otu nkenke nkọwa banyere Akwụkwọ nke Mọmọn” dị n’iru Akwụkwọ nke Mọmọn.)

Akwụkwọ nke Mọmọn

Otu akwụkwọ nọọrọ onwe ya nke dị n’ibu akwụkwọ nke akwụkwọ-nsọ nke a maara dịka Akwụkwọ nke Mọmọn. Isi nile nke 1–2 na-akọ banyere Amarọn, otu onye amụma ndị Nifaị nyere Mọmọn ntụzi-aka mgbe na ebe ọ ga eweta epekele nile ahụ. Nakwa nnukwu agha nile ahụ malitere na ndị Nifaị atọ ahụ nke a kpọpụrụ n’ihi ajọ-omume nke ndị ahụ. Isi nile nke 3–4 na-akọ maka Mọmọn n’iti mkpu nchegharị nye ndị ahụ; mana ha aghọwo ndị mmehie ha na-adịghị emetu n’obi, na oke ajọ-omume dịịrị n’Israel karịa ka ọdịbu na mbụ. Isi nile nke 5–6 dekọtara agha nile nke ikpe-azụ n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman. E gburu Mọmọn ya na ndị nke kachasị na mba ndị Nifaị. N’isi nke 7, tutu ọnwụ ya Mọmọn kpọkuru ndị mmadụ mgbe ahụ na mgbe na-abịa n’iru ka ha chegharịa. Isi nile nke 8–9 dekọtara na ikpe-azụ nanị nwa-nwoke nke Mọmọn, Moronaị bụ onye fọdụrụ. O dekọtara ihe nile ikpe-azụ mere na nnukwu ọnwụ na ogbugbu ọtụtụ mmadụ ahụ, tinyere nsọtụ nke ndị Nifaị, na o dekwara ozi nye ọgbọ ndị dị n’iru na ndị ga-agụ akwụkwọ akụkọ ndekọta nke a.