Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Iwu-nsọ Iri


Iwu-nsọ Iri

Iwu iri nile Chineke nyere site n’aka onye-amụma Moses, iji chịa omume nke mụọ ime ihe ọma ma-ọbụ ihe ọjọọ.

Aha ndị Hibru na-akpọ nke a bụ “Okwu Iri ahụ.” Ana akpọkwa ha Ọgbụgba-ndụ (Deut. 9:9) ma-ọbụ Ihe-ama ahụ (Ọpụ. 25:21; 32:15). Onyinye nke Iwu-nsọ iri nile ahụ Chineke nyere Moses, ma site n’aka ya nye ndị Israel ka a kọwara nke ọma na Ọpụ. 19:9–20:23; 32:15–19; 34:1. Iwu-nsọ nile ahụ ka a kanyere n’elu ibe nkume abụọ nke e dotere n’ime Igbe ahụ, nke mere e jiri na-akpọ Igbe ahụ Igbe nke Ọgbụgba-ndụ ahụ (Ọnọgụ. 10:33). Onye-nwe, mgbe ọ na-agụpụta ihe site na Deut. 6:4–5 na Lev. 19:18, a chịkọtawo Iwu-nsọ iri nile ahụ n’ime “oke Iwu-nsọ abụọ ahụ” (Mat. 22:37–39).

Iwu Iri nile ka e megharịrị na mkpughe ụbọchị ikpe-azụ (Mosa. 12:32–37; 13:12–24; OznỌd. 42:18–28; 59:5–13; NAJS, Ọpụ. 34:1–2).