Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Reuben


Reuben

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke Jekọb na Lịa nke kachasị okenye (Jen. 29:32; 37:21–22, 29; 42:22, 37). Ọbụnadị na Reuben bụụrụ onye ebu ụzọ mụọ, ọnọdụ ọkpara ya funarịrị ya n’ihi mmehie (Jen. 35:22; 49:3–4).

Agbụrụ nke Reuben

A ga achọta ngọzi nke Jekọb nyere Reuben n’ime Jenesis 49:3 na Deuteronọmị 33:6. Ọnụ-ọgụgụ agbụrụ ahụ jiri nwayọ nwayọ belata, ma na-agbanyeghị na agbụrụ ahụ gara n’iru na-ịdịgịde, ọ ghọrọ ebe na-adịghị mkpa hienne na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọnọdụ ọkpara Reuben gaara Josef na ụmụ ya ndịkom n’ihi na Josef bụụrụ nwa-nwoke mbụ e bu ụzọ mụọ nke nwunye Jekọb nke abụọ, Rechel (1 Ihem. 5:1–2).