Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Aịsaịa


Aịsaịa

Otu onye-amụma Testament Ochie onye buru amụma site n’afọ 740–701 tutu a mụọ Kraịst. Dịka onye isi ndụmọdụ nke Eze Hezekaia, Aịsaịa nweere nnukwu ike na-esi n’ime arụ-ọrụ banyere okpukpe-chi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Jisus n̄omiri Aịsaịa kwa mgbe kwa mgbe karia onye-amụma ọbụla ọzọ. Pịta, Jọn na Pọl-n̄omikwara Aịsaịa na-esepụghị-aka n’ime Testament Ọhụrụ. Akwụkwọ nke Mọmọn na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile nwere nn̄omi nile sitere na Aịsaịa karịa site n’onye-amụma ọbụla ọzọ na weta kwa nnukwu enyem aka na nsụgharị asụsụ Aịsaịa. Nifaị sitere na edemede Aịsaịa kuziere ndị ya (2 Nif. 12–24; Aịsa. 2–14). Onye-nwe gwara ndị Nifaị na “ukwuu ka okwu nile nke Aịsaịa dị” nakwa ihe nile Aịsaịa buru n’amụma ga-emezu (3 Nif. 23:1–3).

Akwụkwọ nke Aịsaịa

Otu akwụkwo dị n’ime Testament Ochie. Ọtụtụ ibu amụmụ nile nke Aịsaịa gbasara ọbịbịa nke Onye-mgbapụta, na ije-ozị ya n’elu ụwa (Aịsa. 9:6) na dịka Nnukwu Eze n’ụbọchị ikpe azụ (Aịsa. 63). O bukwara amụma banyere ọdị-n’iru nke Israel.

Isi nke 1 bụ mmalite nye akwụkwọ ahụ. Aịsaịa 7:14; 9:6–7; 11:1–5; 53:1–12; na 61:1–3 bụ onyinyo bụ-ụzọ nke ije-ozị nke Onye-nzọpụta. Isi nile nke 2, 11, 12, na 35 gbasara ihe omume nile n’ụbọchị nile ndị ikpeazụ a, mgbe a ga-eweghachi ozi-ọma, a ga-akpọkọta Israel, na ala ahụ nke nwere agụụ mmiri ga-agbawa dịka okoko rose. Isi nke 29 nwere ibu amụma nke ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn (2 Nif. 27). Isi nile nke 40–46 na-ama-ọkwa banyere ikachasị elu nke Jehova dịka ezi Chineke karịa chi arụsi apiri apị nile nke ndị na-efe ofufe na-ekweghị na Chineke. Isi nile ndị nke fọdụrụ, 47–66, gbasara ihe òmùmé nile na mweghachi ikpe-azụ nke Israel na nhiwe nke Zaịọn, tinyere Onye-nwe ibiri n’etiti ndị ya.