Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Onye-ozizi


Onye-ozizi

Ịrụ ọrụ nke Onye-nwe n’elu ụwa. Ndị odibo nile Chineke họọrọ ga-abụrịrị ndị Chineke kpọrọ oku ije-ozị n’ọrụ ya. Mgbe ndị ezi nkụzi nile na-eme uche-obi Onye-nwe, ha na-anọchi anya Onye-nwe n’ọkwa ọrụ ha nile ma na-eme omume dịka ndị na-anọchitere ya (OznỌd. 64:29), si otu a na-arụ ọrụ ahụ dị mkpa maka nzọpụta nke mmadụ. Onye-nwe enyewo Ndị-Ozi, ndị amụma, ndị nkwusa Ozi-ọma, ndị Isi nchụ-aja, Iri asaa nile, ndị okenye, ndị Ụkọchukwu, ndị nchụ-aja, ndị ozizi, ndị dikọn, ndị enyem-aka na ọchịchị nile maka izu-oke nke Ndị-nsọ, n’ịrụ ọrụ nke ije-ozị (Ndị-Efe. 4:11–16; 1 Ndị-Kọ 12:12–28; OznỌd. 20; 107).