Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jeremaịa


Jeremaịa

Otu onye-amụma nke Testament Ochie onye a mụtara n’ezi na ụlọ ndị nchụ-aja na o buru amụma na Juda site 626–586 tutu a mụọ Kraịst. O biri ndụ na nso nso oge ndị nnukwu ndị amụma ndị ọzọ: Lihaị, Ezikiel, Hosea, na Daniel.

E chiri Jeremaia echichi ịbụ onye-amụma na ndụ tutu e nwee anụ arụ (Jer. 1:4–5). N’ime oge ihe dịka iri afọ anọ ya dịka onye-amụma, ọ kụziri megide ife-arụsị na omume ọjọọ nke ime mụọ n’etiti ndị Juu (Jer. 3:1–5; 7:8–10). Ihe chere ya iru na-akwụsịghị akwụsị bụ mmegide na nkwutọ (Jer. 20:2; 36:18–19; 38:4). Mgbe Jerusalem dasịrị, ndị Juu bụ ndị gbalagara Ijipt kpọọrọ Jeremaia tinyere onwe ha (Jer. 43:5–6), ebe, dịka omenala si dị ha tụgburu ya na nkume o wee nwụọ.

Akwụkwọ nke Jeremaia

Isi nile nke 1–6 nwere ibu-amụma nile e nyere n’oge ichi eze nke Josaia. Isi nile nke 7–20 bụ ibu amụma nile n’oge nke Johaiakim. Isi nile nke 21–38 gbasara ichi-eze nke Zedekaịa. Isi nile nke 39–44 nwere ibu amụma nile ma na-akọwa nke ọma ihe akụkọ nile mere mgbe Jerusalem dasịrị. Isi nke 45 nwere otu nkwa e kwere Baruk, ode akwụkwọ ya, na a ga-echekwa ndụ Baruk. N’ikpe-azụ, Isi nile nke 46–51 bụ ibu-amụma nile megide mba ndị ofesi. Isi nke 52 bụ akụkọ mmechi. Ụfọdụ n’ime ibu-amụma nile nke Jeremaia dịịrị n’ime epekele ọla bras nile nke Leban, nke Nifaị nwetara (1 Nif. 5:10–13). Jeremaia ka a kpọtụkwara aha ugboro abụọ ọzọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (1 Nif. 7:14; Hil. 8:20).

Akwụkwọ nke Jeremaia gunyekwara otu nnabata nke mmadụ ịdị-adị tutu ndụ nke anụ arụ na ibu-ụzọ chie-echichi nke Jeremaia (Jer. 1:4–5); otu ibu amụma nke nlọta nke Israel site n’ọnọdụ mgbasasị ha, ịkpọkọta otu site otu nnukwu obodo, abụọ site n’otu agbụrụ gaa na Zaịọn, ala dị mmasị ebe Israel na Juda ga-ebi na nchekwa na udo (Jer. 3:12–19); na otu ibu amụma banyere Onye-nwe ikpọkọta Israel site na mba nile nke ndị elu-elu site na-iziga ọtụtụ ndị na-egbu azụ na ndị di nta ka ha chọta ha (Jer. 16:14–21). Ihe omume nke a n’ụbọchị ndị ikpeazụ a ga-adị ukwuu hienne ọbụna karịa Moses ịkpọpụta Israel site n’Ijipt (Jer. 16:13–15; 23:8).