Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Efesọs, Akwụkwọ-ozi, e degaara


Ndị Efesọs, Akwụkwọ-ozi, e degaara

N’ime Testament Ọhụrụ, otu Akwụkwọ-ozi Pọl dere nye ndị-nsọ nọ na Efesọs. Akwụkwọ-ozi ahụ dị oke mkpa, n’ihi na o nwere nkuzi nile Pọl kuziri banyere Nzukọ-nsọ nke Kraịst.

Isi nke 1 nwere ekele dịka ọ na-emekarị. Isi nile nke 2–3 na akọwa nke ọma mgbanwe na-adị n’ime ndị mmadụ mgbe ha ghọrọ ndị otu Nzukọ-nsọ—ha na-abụ ụmụ ama-ala, soro Ndị-nsọ, tinyere ndị Jentaịlụ na ndị Juu a na-ejikọ nke ọma n’ime otu Nzukọ-nsọ. Isi nile nke 4–6 na-akọwa nke ọma, ọrụ nile nke Ndị-ozi na ndị amụma, mkpa ijikọ nke ọma dị na mkpa iyikwasị ngwa-ọgụ nile nke Chineke dị.