Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Igbe ọgbụgba-ndụ


Igbe ọgbụgba-ndụ

A maakwara ya dịka Igbe nke Onye-nwe na Igbe nke Testament, Igbe Ọgbụgba-ndụ bụ igbe ịdị ogologo ya karịrị ịdị mbara ya, ma-ọbụ igbe e ji osisi mee, jiri ọla-edo machie elu ya. Ọ bụ ihe kachasị ochie, kachasịkwa ịdị-nsọ n’ime akara nile nke ofufe Chineke nke ndị Israel. Oche ebere nke bụ ihe mkpuchi ya ka e weere dịka ebe obibi nke Jehova n’elu ụwa (Ọpụ. 25:22). Mgbe e wuchara ụlọ ụka ahụ, e dobere Igbe Ọgbụgba-ndụ ahụ n’ebe dị nsọ kachasị ebe nsọ nile, ebe kachasị idi nsọ nile ahụ e wuru (1 Ndez. 8:1–8).