Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Elaias


Elaias

E nwere ọtụtụ ihe a na-eji aha ahụ ma-ọbụ ọkwa Elaias e me n’ime a kwukwọ-nsọ nile:

Elaịja

Elaias bụ ụdị Elaịja (n’asụsụ Hibru) nke Testament Ọhụrụ Elaias (Asụsụ Grik) dịka ọ dị na Mat. 17:3–4, Luk 4:25–26, ma Jemes 5:17. N’ọmụmatụ ndia nile Elaias bụbuuru onye-amụma agba ochie bụ Elaịja onye edekọtara ije-ozị ya na Ndị-eze nke 1 na 2.

Onye na-ebu-ụzọ gbaa ọsọ

Elaias bụkwa ọkwa nke onye ọbụla na-ebu ụzọ gbaa-ọsọ. Ima-atụ, Jọn ome baptism bụụrụ Elais n’ihi na-ezipụrụ ya ịkwadobe ụzọ maka Jisus (Mat. 17:12–13).

Onye na-eweghachi

Ọkwa Elaias ka a manyeere ndị ọzọ nwere ozi nile pụtara ìhè ha ga-eme dịka Jọn onye mkpughe (OznỌd. 77:14) na Gebrel (Luk 1:11–20; OznỌd. 27:6–7; 110:12).

Otu nwoke n’ọgbọ nke Abraham

Onye-amụma a kpọrọ Esaias ma-ọbụ Elaias onye biri n’ụbọchị nile nke Abraham (OznỌd. 84:11–13; 110:12).