Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mee ka ozi-ezi, Nkwado ziri-ezi


Mee ka ozi-ezi, Nkwado ziri-ezi

Ịbụ onye a gbaghaara site na ntaram ahụhụ maka mmehie na a maa-ọkwa na ikpe amaghị kwa ya. E mere ka mmadụ zie-ezi site n’amara Onye-nzọpụta site n’okwukwe onye ahụ n’ime ya. Okwukwe ahụ ka e gosiri site na nchegharị na nrube-isi nye iwu nile na emume nsọ nile nke ozi-ọma. Aja Mgbaghara Mmehie nke Jisus Kraịst na-enyere mmadụ aka ichegharị na e mee ka o zie-ezi ma-ọbụ a gbaghara ya site na ntaram ahụhụ nke ha gaara anata ma ọ bụghị otu a.