Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ifrem


Ifrem

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke abụọ nke Josef na Asinat (Jen. 41:50–52; 46:20). Na mmegide omume nke ọdịnala, Ifrem nwetara ngọzi nke ruuru Ọkpara na ọnọdụ Manase onye nke bụ nwa-nwoke nke ka okenye (Jen. 48:17–20). Ifrem wee bụrụ nna nke agbụrụ Ifrem.

Agbụrụ nke Ifrem

E nyere Ifrem ọnọdụ ruuru ọkpara na Israel (1 Ihem. 5:1–2; Jer. 31:9). N’ụbọchị ndị ikpe-azụ ohere ha na ọrụ dịịrị ha bụ ijide ọkwa nchụ-aja, were ozi nke ozi-ọma ahụ e weghachiri azụ wegara ụwa, welite elu ọkọlọtọ maka ịkpọkọta Israel a chụsasịrị achụsasị (Aịsa. 11:12–13; 2 Nif. 21:12–13). Ụmụ Ifrem ga-eji okpu-eze otuto kpube ndị ahụ nile ga-esi na mba nile nke Ugwu lọta n’ụbọchị ndị ikpe-azụ (OznỌd. 133:26–34).

Osisi nke Ifrem ma-ọbụ Josef

Akụkọ ndekọta nke otu ọgbakọ sitere na Agbụrụ nke Ifrem nke e duru site na Jerusalem gaa Amerika ihe dịka afọ 600 tutu a mụọ Kraịst. Ndekọta akụkọ ọgbakọ a ka a kpọrọ osisi nke Ifrem ma-ọbụ Josef, ma-ọbụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Ya na osisi nke Juda (Bible) jikọtara ọnụ nke ọma bụrụ Ịgba-ama maka Onye-nwe Jisus Kraịst, mbilite n’ọnwụ ya, ọrụ ya dị nsọ n’etiti mpekere abụọ ndị a nke Ụlọ nke Israel.