Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith (NAJS)


Ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith (NAJS)

Ngụgharị ma-ọbụ ntụgharị asụsụ nke ntụgharị asụsụ Eze Jemes nke Bible-nsọ n’asụsụ Bekee, nke Onye-amụma Joseph Smith malitere na Jun 1830. Chineke nyere ya iwu ka o mee ntụgharị ahụ na lekwaa ya anya dịka mpaghara ọkpụkpọ oku ya dịka onye-amụma.

Ọbụ ezie na Joseph mechara nke kachasị na ntụgharị asụsụ ahụ na Julai 1833; ọ gara n’iru ruo ọnwụ ya na 1844 i na-eme mgbanwetụ nile mgbe ọ na-akwadobe akwụkwọ ndepụta maka mbipụta ya. Na-agbanyeghị na o bipụtara mpaghara ụfọdụ nke ntụgharị asụsụ ahụ n’oge ọ dị ndụ, o kwere omume na ọ gaara eme ntụkwasị mgbanwe nile ọzọ a sị na ọ dịịrị ndụ ibipụta ọrụ ahụ nile. Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a nke Ahazigharịrị, bipụtara mbipụta nke mbụ nke ntụgharị asụsụ nkwalite mụọ nke Joseph Smith na 1867. Ha ebipụtawo ọtụtụ mbipụta ya ke mgbe ahụ.

Onye-amụma ahụ mụtara ọtụtụ ihe n’ime usoro ntụgharị asụsụ ahụ. Ọtụtụ nkeji nile nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile ka a natara n’ihi ọrụ ntụgharị asụsụ ahụ (ndị dika OznỌd. 76, 77, 91, na 132). Onye-nwe nyekwara Joseph Smith ntụzi-aka nile pụrụ-iche maka ntugharị asụsụ ahụ, ndị nke edekọtara n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile (OznỌd. 37:1; 45:60–61; 76:15–18; 90:13; 91; 94:10; 104:58; 124:89). Akwụkwọ nke Moses na Joseph Smith—Matiu, nke e tinyeworo na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa, ka e weere site na Ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith.

Ntụgharị-asụsụ nke Joseph Smith e weghachiwo ụfọdụ ihe ndị dị mfe na dị mkpa bụ ndị nke fuworo site na Bible-nsọ (1 Nif. 13). Ọbụ ezie na ọ bụghị ya bụ Bible nke ụlọ-ọrụ Nzukọ-nsọ, ntụgharị-asụsụ a na-enye nleba-anya nile dị mmasị na baa nnukwu uru n’ịghọta Bible-nsọ. Ọ bụ kwa otu aka-ebe nke ịdị-nsọ ọkpụkpọ oku na ije-ozị nke Onye-amụma Joseph Smith.