Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Faịlimọn, Akwụkwọ-ozi edegaara


Faịlimọn, Akwụkwọ-ozi edegaara

Otu akwụkwọ dị n’ime Testament Ọhụrụ, e weere site na otu leta nke Pọl dere. Leta Pọl degaara Faịlimọn bụ leta nke onwe gbasara Onisimọs, otu onye órù nke zuru nna-ya-ukwu Faịlimọn ori ma gbafue gbaga Rom. Pọl zighachiri ya azụ nye nna-ya-ukwu na Kọlọsị na nsonye nke Taịkikọs onye na-ewetara ndị Kọlọsị leta nke Pọl degaara ha. Pọl rịọrọ ka a gbaghara Onisimọs ma nabataghachi ya azụ dịka otu onye na-eso ụzọ Kraịst. Pọl dere leta a mgbe ọ nọọrọ n’ụlọ mkpọrọ oge nke mbụ na Rom.