Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Jared


Ndị Jared

Ndị mmadụ nọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn ndị bụụrụ ụmụụmụ nke Jared, nwanne ya nwoke, na ndị enyi ha nile (Ita 1:33–41). Chineke dụụrụ ha site na ụlọ elu nke Tọwa Bebel gaa na Amerika nile, otu ala e kwere na nkwa (Ita 1:42–43; 2–3; 6:1–18). Na-agbanyeghị na mba ha n’otu oge nwebuuru ọtụtụ nde ndị mmadụ, e bibiri ha nile n’agha ime obodo nke ajọọ omume butere (Ita 14–15).