Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndepụta nke Okwukwe


Ndepụta nke Okwukwe

Mkpụrụ ihe ntọ-ala Iri na atọ nke Okwukwe nke ndị Otu Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a kweere.

Joseph Smith buru ụzọ dee ha na leta o degaara John Wentworth, onye na-ahazi akwụkwọ nta akụkọ Chicago Democrat, na nzaghachi arịrịọ ya imata ihe ndị Otu Nzukọ-nsọ kweere. Leta ahụ ka e mechara mara dịka ’leta Went wọt’ ma e buru-ụzọ bipụta ya n’akwụkwọ nta akụkọ Times and Seasons na Maach 1842. Na 10 Oktoba 1880, a nabatara Ndepụta nke Okwukwe n’usoro dịka akwụkwọ-nsọ site na ntuli-aka nke ndị otu nile nke Nzukọ-nsọ na e wee tinye ya dịka mpaghara Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa.