Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Kọlọsị, Akwụkwọ-ozi e degaara


Ndị Kọlọsị, Akwụkwọ-ozi e degaara

Otu akwụkwọ n’ime Testament Ọhụrụ. Ọ bụbuuru leta nke Onye-ozi Pọl degaara ndị Kọlọsi mgbe Epafras onye na-ezisa ozi-ọma na Nzukọ-nsọ letasịrị ya (Ndị-Kọl. 1:7–8). Epafras gwara Pọl na ndị Kọlọsị na-adaba n’ime oke ihie ụzọ-ha chere na ha dị mma karịa ndị ọzọ n’ihi na ha na-akpachapụ anya na-imezu omume anụ arụ ụfọdụ, (Ndị-Kọl. 2:16) gọnari onwe ha ụfọdụ ihe ahụ ha chọrọ na na-esekpuru ndị mụọ-ozi (Ndị-Kọl. 2:18). Omume ndịa nile mere ndị Kọlọsi iche na e dowo ha nsọ. Ha chekwara na ha ghotara ihe omimi nile nke elu-igwe karịa ndị ọzọ nile bụ ndị otu nzukọ-nsọ. N’ime leta ya, Pọl duzigharịrị ha ụzọ site na-ikuzi na mgbapụta na-abịa nanị site na Kraịst, na ọ ga-abụ amamihe nye anyị ife ya ofufe.

Isi nke mbụ bụ ekele Pọl kelere ndị Kọlọsi. Isi nile nke 2–3 bụ ozizi na nweekwa nkwupụta nile na Kraịst bụ Onye mgbapụta, nsogbu ofufe ụgha nwere, na mkpa nke mbilite n’ọnwụ dị. Isi nke 4 na-akụzi na ndị-nsọ kwesịrị inwe amamihe n’ihe nile.