Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Rut


Rut

N’ime Testament Ochie, onye Moab bụụrụ nwunye nwa nke Naomi na Elimelek, ndị bụụrụ ndị Israel. Mgbe ọnwụ di ya gasịrị, Rut lụrụ onye ikwu Naomi, Boaz. Nwa ha nwoke Obed bụụrụ nna nna ochie nke Devid na Kraịst. Akụkọ nke Rut jiri ịma-atụ kọwaa ebe ọdị mma mgbanwe nke onye na-abụghị onye Israel baa n’ime ogige nke Israel. Rut hapụrụ chi ochie ya na ndụ ochie ya iji jikọta onwe ya na ezi na ụlọ nke okwukwe na-ife Chineke nke Israel ofufe (Rut 1:16).

Akwụkwọ nke Rut

Isi nke 1 kọwara nke ọma ndụ Elimelek na ezi na ụlọ ya n’ime Moab. Mgbe ọnwụ di ha nile gasịrị, Naomi na Rut gara Betlehem. Isi nke 2 na-akọwa na Rut chịkọtara ọka n’azụ ndị na-ebi ọka n’ubi nile nke Boaz. Isi nke 3 na-akọ otu Naomi si tuziere Rut aka ka o jee n’ebe izọcha ọka ma dina ala n’ụkwụ abụọ nke Boaz. Isi nke 4 bụ akụkọ nke alụlụ Rut nye Boaz. Ha nwere otu nwa-nwoke, Obed, onye Devid na Kraịst sitere n’agbụrụ ya bịa.