Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Joel


Joel

Otu onye-amụma n’ala nke Juda n’ime Testament Ochie. Ụbọchị nke o biri ndụ ya e dochaghị anya—o nwere ike bụrụ na o biri ndụ n’oge dị n’etiti ichi-eze Joash, tutu 850 tutu a mụọ Kraịst, na nlọta nke agbụrụ Juda site na ndọkpụ n’agha na Babịlọn.

Akwụkwọ nke Joel

Ndabere akwụkwọ ahụ bụ ibu amụma nke Joel buru mgbe e jiri oke ụkọ-mmiri na igube mekpasịa Juda arụ (Joel 1:4–20). Joel jasiri ndị ahụ ike na site na nchegharị ha ga-anata ngọzi nile nke Chineke (Joel 2:12–14).

Isi nke 1 bụ ịkpọ oku maka ọgbakọ dị mkpa n’ime ụlọ nke Onye-nwe. Isi nke 2 na-akọ maka agha na ntọgbọrọ n’efu nke ga-ebu ụzọ oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa-eze otu puku afọ. Isi nke 3 na-ekwu maka ụbọchị ndị ikpe-azụ ma na-emesi ike na mba nile ga-anọ n’agha mana Onye-nwe ga-ebi na Zaịọn.

Pịta n̄omiri ibu-amụma Joel banyere mwụsasị nke Mụọ ahụ n’ụbọchị Pentikọst (Joel 2:28–32; Ọlndoz. 2:16–21). Mụọ-ozi Moronaị n̄omikwara ebe ọgụgụ a nye Joseph Smith (A—JS 1:41).