Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Pọl


Pọl

Otu Onye-Ozi n’ime Testament Ọhụrụ. Aha Pọl na Hibru bụụrụ Sọl, na o jegharịkwara n’aha nke a ruo na mmalite nke izisa-ozi-ọma ya nye ndị Jentaịlụ. Ọ nabuuru akpagbu Nzukọ-nsọ mana a gbanwere ya nye ezi-okwu ya nile mgbe ọ hụsịrị ọ̀hụ́ nke Jisus Kraịst. Pọl gara njem izisa-ozi-ọma atọ dị mkpa ma o dere ọtụtụ leta nye Ndị-nsọ. Leta iri na anọ ndị a mejupụtara otu mpaghara nke Testament Ọhụrụ taa. N’ikpeazụ a kpụụrụ ya gaa Rom dịka onye mkpọrọ ma e gburu ya, ike-kwe na mmalite udu mmiri nke afọ 65 mgbe a mụsịrị Kraịst.