Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Kọniliọs


Kọniliọs

Onye ọchị-agha otu narị ndị agha na Siseria, Pịta mere baptism (Ọlndoz. 10). Elegh-anya, ọ bụ ya bụ onye Jentaịlụ nke mbụ sonyere na Nzukọ-nsọ na-ebughị ụzọ gbanwee bụrụ onye otu Judaizm. Baptism nke e mere Kọniliọs na ezi na ụlọ ya kara akara nke mmeghe ụzọ ikwusa ozi-ọma nye ndị Jentaịlụ. Pịta Onye Isi Ndị-ozi, onye jidere ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze Chineke n’elu ụwa n’oge ahụ duziri ụzọ nkwusa ozi-ọma a.