Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mkpughe nke Jọn


Mkpughe nke Jọn

Akwụkwọ nke ikpe-azụ n’ime Testament Ọhụrụ, jupụtara n’otu mkpughe e nyere Jọn Onye-ozi. E kwenyere ya ịhụ akụkọ nke ụwa, nke ka nke ụbọchị ndị ikpe-azụ (Mkpu. 1:1–2; 1 Nif. 14:18–27; OznỌd. 77). Mkpughe nke Jọn ka a maakwara dịka Apọkalips.

Jọn natara mkpughe a n’ụbọchị nke Onye-nwe n’obere ala mmiri gbara gburu gburu nke Patmọs (Mkpu. 1:9–10), ofe akụkụ osimiri nke Esia, n’ebe na-eteghị anya site na Efesọs. A mataghị kpọmkwem ụbọchị mkpughe ahụ.

Ọtụghe-ụzọ nile nke ịghọta akwụkwọ ahụ ka e tinyekwara n’ime 1 Nifaị 14:18–27 na OznỌd. 77 (Ita 4:15–16).

Isi nile nke 1–3 bụ mmalite nye akwụkwọ ahụ na leta nile nye nzukọ asaa dị n’ime Esia. Jọn dere leta ndịa iji nyere Ndị-nsọ aka imezi nsogbu nile ụfọdụ. Isi nile nke 4–5 dekọtara ọ̀hụ́ nile nke Jọn nwetara na-egosi ụdị eze na ike ezi-omume nke Chineke na Kraịst. N’ime isi nile nke 6–9, 11, Jọn dekọtara ọhụhụ nke akwụkwọ e jiri nrachi asaa rachie, otu nrachi na-anọchite anya otu puku afọ nke akụkọ nke arụ nke ụwa nke a. Isi nile ndị a na-akọ nke mbụ karịa banyere ihe omume nile dị n’ime nrachi nke asaa (hụ Mkpu. 8–9; 11:1–15). Isi nke 10 na-akọwa nke ọma maka otu akwụkwọ nke Jọn riri. Akwụkwọ ahụ nọchitere anya otu mgbasa-ozi-ọma ọdị n’iru nke ọ ga agbasa. Isi nke 12 dekọtara otu ọ̀hụ́ nke ihe ọjọọ ahụ nke malitere n’elu-igwe mgbe Setan nupụrụ isi ma a chụpụrụ ya. Agha ahụ nke malitere ebe ahụ ka a gara n’iru na-alụ n’elu ụwa. N’isi nile nke 13, 17–19, Jọn kọwara nke ọma ala-eze ajọọ omume nile nke ụwa nke Setan na-enwe ike ịtụzi aka na ha na ọnọdụ akara aka ha, tinyere mbibi ngwụcha nke ihe ọjọọ. Isi nile nke 14–16 na-akọwa nke ọma ezi-omume nke Ndị-nsọ n’ime etiti ihe ọjọọ ngwa ngwa tutu ọbịbịa ugboro abụọ nke Kraịst. Isi nile nke 20–22 na-akọwa nke ọma Oge Jisus Ga-abịa N’ụwa Chịa Otu Puku Afọ. Nnukwu obodo Jerusalem Ọhụrụ ahụ mara mma, na ngwụcha ihe omume nile nke akụkọ nke ụwa.