Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mkpọgide n’obe


Mkpọgide n’obe

Ụdị igbu mmadụ ekpebiri nke ndị Rom na-egbu nke dịkarị n’oge Testament Ọhụrụ nile, n’ime ya bụ nke a na-egbu onye ahụ site na ikedo ya ụdọ ma-ọbụ kpọgide ya ntu aka na ukwu n’obe ahụ. A naara emekari ya nye nanị ndị oru na ndị mmebi iwu dịkasị ala. Iti ihe otiti ma-ọbụ ịpịa ụtarị na-ebukarị mkpọgide n’obe ụzọ (Mak 15:15). Onye ahụ a na-akpogide n’obe ka a na-emekarị ka o buru obe ya gaa n’ebe a ga-akpọgbu ya dịka ekpebiri (Jọn 19:16–17). Uwe ya ka ndị-agha ahụ bụ ndị rụpụrụ ọrụ ọmụma-ikpe ahụ na ewere karị (Mat. 27:35). A na-amanye obe ahụ n’ime ala nke ga-eme ka ụkwụ abụọ onye ahụ dịrị otu ntụ rula ma-ọbụ abụọ n’elu ala. Ndị agha ga-elegide obe ahụ tutu onye ahụ nọ n’elu obe ahụ a nwụọ, nke oge nile ụfọdụ na-ewere ruo ụbọchị atọ (Jọn 19:31–37).

A kpọgburu Jisus Kraịst n’obe n’ihi na otu ọgbakọ ndị na-ekweghị ekwe boro ya ebubo ụgha na ọ na-akpalite nnupụ-isi megide ọchịchị Sisa, na ikwuhie Chineke n’ihi na ọ sịrị na ya bụ Ọkpara Chineke. Akwa uwe ododo (Jọn 19:2), okpu-eze ogwu nile, na akaja ndị ọzọ nile ka e nyere Jisus (Mat. 26:67; Mak 14:65).