Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Moses


Moses

Otu onye-amụma nke Testament Ochie onye duuru ndị Israel pụọ site n’ịbụ oru nke ndị Ijipt na nye ha otu ndozi iwu nile nke okpukpe chi, usoro ọchịchị mbikọ ọnụ, na nke ihe oriri dịka Chineke kpughere.

Ije-ozị Moses gabigara njedebe nke oge ndụ arụ ya nke na-anwụ anwụ. Joseph Smith kuziri na, Ya na Elaịja so bịa n’ugwu nke Mnwogharị na nyefee ọtụghe-ụzọ nile nke Ọkwa Nchụ-aja n’aka Pịta, Jemes na Jọn (Mat. 17:3–4; Mak 9:4–9; Luk 9:30; OznỌd. 63:21).

Moses pụtara ìhè nye Joseph Smith na Oliver Cowdery na 3 Epril 1836, n’ime temple dị na Kirtland Ohio, na nyefere n’elu ha ọtụghe-ụzọ nile nke mkpọkọta nke Israel (OznỌd. 110:11).

Mkpughe ụbọchị ikpe-azụ na-ekwu ihe dị ukwuu banyere Moses. A kpọtụrụ ya aha kwa mgbe, kwa mgbe n’Akwụkwọ nke Mọmọn, na site na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile anyị na-amụta maka ije-ozị ya (OznỌd. 84:20–26) na ọ natara ọkwa nchụ-aja site n’aka Jetro bụ ọgọ ya nwoke (OznỌd. 84:6).

Mkpughe ụbọchị ikpe-azụ nakwa e mesi ike nkọwasị nke Bible banyere ije-ozị ya n’etiti ụmụ Israel ma na-ekwusigharị ike na ọ bụ ya bụụrụ onye dere akwụkwọ ise ahụ nke malitere Testament Ochie (1 Nif. 5:11; Moses 1:40–41).

Akwụkwọ nke Moses

Otu akwụkwọ dị n’ime Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa, nke nwere ntụgharị asụsụ nkwalite mụọ nke Joseph Smith, nke isi asaa nile nke mbụ nke Jenesis.

Isi nke 1 na-edekọta otu ọ̀hụ́ nke Moses hụrụ Chineke n’ime ya, onye kpụgheere ya atụmatụ nke nzọpụta dum. Isi nile nke 2–5 bụ nkọwasị nke okike na ọdịda nke mmadụ. Isi nile nke 6–7 nwere otu ọ̀hụ́ gbasara Inọk na ije-ozị ya n’elu ụwa. Isi nke 8 nwere otu ọ̀hụ́ gbasara Noa na nnukwu Ide mmiri ahụ.

Akwụkwọ ise nile nke Moses

Akwụkwọ ise nke mbụ nke Testament Ochie ka a maara dịka akwụkwọ nile nke Moses. Epekele ọla bras nile nke Nifaị nke a natara site n’aka Leban nwere akwụkwọ nile nke Moses (1 Nif. 5:11).