Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụlọ-ofufe


Ụlọ-ofufe

Otu ụlọ nke Onye-nwe, etiti ebe ofufe nke Israel n’ime oge ọpụpụ site n’Ijipt. Ụlọ-ofufe ahụ bụụrụ n’ezie otu temple dị nke-nke e nwekwara ike wepụsịa ya ma wugharịa ya ọzọ. Ụmụ Israel jigidere otu ụlọ-ofufe ruo mgbe ha wuru temple nke Solomọn (OznỌd. 124:38).

Chineke kpughere ọdịdị nke ụlọ-ofufe ahụ nye Moses (Ọpụ. 26–27), na ụmụ nke Israel wuru ya dịka ọdịdị ahụ (Ọpụ. 35–40). Mgbe e wuchara ụlọ-ofufe ahụ, Urukpu kpuchiri ụlọ-ikwuu ahụ, ma ebube nke Onye-nwe juputara ụlọ-ofufe ahụ (Ọpụ. 40:33–34). Urukpu ahụ bụụrụ ihe iriba-ama nke iru nke Chineke idi ebe ahụ. N’abalị o nwere mpụta oyiyi nke ọkụ. Mgbe urukpu ahụ nọdụrụ n’ofe ụlọ-ikwuu ahụ, ụmụ Israel nọdụrụ n’ebe ahụ izu ike. Mgbe o gawara, ha soro ya gawa (Ọpụ. 40:36–38; Ọnọgụ. 9:17–18). Ụmụ Israel buuru ụlọ-ofufe ahụ ha na ya n’ime mkpagharị ha nile n’ime ọzara na n’ime mmeri nke ha meriri ala nke Kenean. Mgbe mmeri ahụ gasịrị, ụlọ-ofufe ahụ ka e dobere na Shaịlo, ebe nke Onye-nwe họpụtaworo (Josh. 18:1). Mgbe ụmụ Israel wusiworo temple nke Solomon, ụlọ-ofufe ahụ furu kpam kpam site n’akụkọ.

Onye-nwe na Aịsaịa jiiri ụlọ-ofufe ahụ mee dịka otu àkàrá nke nnukwu obodo nile nke Zaịọn na Jerusalem n’oge ọbịbịa nke Onye-nwe nke ugboro abụọ (Aịsa. 33:20; Moses 7:62).