Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Pịta


Pịta

N’ime Testament Ọhụrụ a maara Pịta na mbụ dịka Simeon ma-ọbụ Saịmọn (2 Pita 1:1). Onye ọkụ-azụ nke Betsaịda bi na Kapanaum ya na nwunye ya. Jisus gwọrọ nne nwunye Pịta (Mak 1:29–31). A kpọrọ Pịta tinyere nwanne ya nwoke Andrụ ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jisus (Mat. 4:18–22; Mak 1:16–18; Luk 5:1–11). Aha ya n’asụsụ Aramaịk bụ Kifas nke pụtara “onye ọhụ ụzọ” ma-ọbụ “okwute”, bụụrụ nke Onye-nwe nyere ya (Jọn 1:40–42; NAJS, Jọn 1:42). Ọbụna mgbe Testament Ọhụrụ na-akpọtụ ụfọdụ n’ime adịghị ike nke arụ na-anwụ anwụ nke Pịta ọnụ, o jikwara ọmụmatụ kọwaa na o meriri ha ma e mere ka o sie ike site n’okwukwe ya n’ime Jisus Kraịst.

Pịta kwupụtara na Jisus bụụrụ Kraịst ahụ na Ọkpara nke Chineke (Jọn 6:68–69), na Onye-nwe họọrọ ya ijide ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ n’elu ụwa (Mat. 16:13–18). N’elu Ugwu nke Mnwogharị. Pịta hụrụ Onye-nzọpụta ahụ e nwogharịrị dịka kwa ọ hụrụ Moses na Elaias (Elaịja) (Mat. 17:1–9).

Pịta bụụrụ onye-isi Ndị-ozi nke ụbọchị ya. Mgbe ọnwụ, mbilite n’onwu, na nrigo n’elu nke Onye-nzọpụta gasịrị, ọ kpọkọtara Nzukọ-nsọ ọnụ ma tụzie-aka maka ịkpọ otu Onye-ozi ka o nọchie Judas Iskarịọt (Ọlndoz. 1:15–26). Pịta na Jọn gwọrọ otu nwoke nke dara ngwụrụ site na mgbe a mụrụ ya (Ọlndoz. 3:1–16). N’ụzọ ọrụ dị ebube a tọhapụrụ ha site n’ụlọ mkpọrọ (Ọlndoz. 5:11–29; 12:1–19). Ọ bụụrụ site n’ije-ozị Pịta ka e buru ụzọ meghee ozi-ọma nye ndị Jentaịlụ (Ọlndoz. 10–11). N’ụbọchị ndị ikpeazụ, Pịta tinyere Jemes na Jọn sitere n’elu-igwe bịa nyefee Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek na ọtụghe-ụzọ nile dị na ya n’elu Joseph Smith na Oliver Cowdery (OznỌd. 27:12–13; 128:20).

Akwụkwọ-ozi nke mbụ nke Pịta

E dere akwụkwọ ozi nke mbụ ahụ site na Babịlọn (Ikekwe Rom) ma e zigaara ya Ndị-nsọ n’ebe a na-akpọ Asia Minor ugbụ a ngwa ngwa Nirọ malitesịrị isogbu ndị nile na-eso ụzọ nke Kraịst.

Isi nke 1 na-ekwu maka ọrụ Kraịst dịka Onye-mgbapụta nke e bu ụzọ chie ya echichi. Isi nile nke 2–3, na-akọwa na Kraịst bụ isi nkụkụ ntọ ala nke Nzukọ-nsọ, na Ndị-nsọ ji ọkwa nchụ-aja ndị bụ nwa eze, ma na Kraịst kwusara ozi-ọma nye mụọ nile nọ n’ụlọ mkpọrọ. Isi nile nke 4–5 na-akọwa ihe kpatara e ji kwusaara ndị nwụrụ anwụ ozi-ọma na ihe kpatara ndị okenye ga-ejiriri na-azụ igwe atụrụ ahụ.

Akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pịta

Isi nke 1 na-agba Ndị-nsọ ume ime ka ọkpụkpọ ha na nhọpụta ha guzosie ike. Isi nke 2 na-adọ aka na ntị megide ndị nkụzi ụgha. Isi nke 3 na-ekwu banyere ụbọchị ndị ikpeazụ na ọbịbịa Kraịst nke ugboro abụọ.