Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ngabiga


Ngabiga

E hiwere oriri nke Ngabiga ahụ iji nyere ụmụ nke Israel aka icheta mgbe mụọ-ozi nke mbibi ahụ gabigara ụlọ ha nile ma napụta ha site n’aka ndị Ijipt (Ọpụ. 12:21–28; 13:14–15). Ụmụ atụrụ zuru oke (na-enweghị ntụpọ), nke ọbara ha bụụrụ ihe iriba-ama iji zọpụta Israel na mgbe ochie bụ otu akara nke Jisus Kraịst, Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ, onye ịchụ-aja ya gbapụtara mmadụ nile.