Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Farisi


Ndị Farisi

N’ime Testament Ọhụrụ, otu ọgbakọ okpukpe chi n’etiti ndị Juu ndị aha ha na-atụaro ikewapụ iche ma-ọbụ ịnọ iche. Ndị Farisi mere mpako nke onwe ha n’idobe sie ike iwu nke Moses ma na-ewezuga onwe ha n’ihe ọbụla metụtara ndị Jentaịlụ. Ha kweere na ndụ ma ọnwụ gasịa, mbilite n’ọnwụ, na ịdị adị nke ndị mụọ-ozi na mụọ nile. Ha kweere na iwu nke e nyere n’ọnụ (nke na-edeghị ede) na omenala dịịrị ahata-aha n’ịdị mkpa dịka ịwu nile nke e dere ede. Nkụzi ha nile wedara okpukpe-chi ala ka idobe usoro nile ma gbaa mpako nke mụọ ume. Ha kpatara ọtụtụ ndị Juu inwe obi abụọ n’ebe Kraịst na ozi-ọma ya nọ. Onye-nwe kwugidere ndị Farisi na ọrụ ha nile n’ime Matiu 23; Mak 7:1–23; na Luk 11:37–44.