Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Maịka


Maịka

Otu onye amụma Testament Ochie. Ọ bụụrụ onye Moreshet Gat, n’ime mbara ala nke mba Juda, na buo amụma mgbe Hezekaịa bụụrụ eze (Maịka 1:1–2).

Akwụkwọ nke Maịka

Maịka bụ nani akwụkwọ dị n’ime Testament Ochie kpọrọ Betlehem aha dịka ebe a ga-amụ Mesaịa ahụ (Maịka 5:2). N’ime akwụkwọ ahụ Onye-nwe nyerịtara ndị ya ndụmọdụ na gụgharịa ịdị mma ya gara-aga n’ebe ha nọ; o wee chọọ n’aka ha ikpe ziri-ezi, ebere, na ịdị umeala (Maịka 6:8).